Bose Kaffo

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Bose Kaffo
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoBose Kaffo Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya14 Novemba 1972 Dezie
Ebe ọmụmụSurulere Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Yoruba Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Yoruba, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụtable tennis player Dezie
ụdị egwuregwutable tennis Dezie
so na2008 Summer Olympics, 2004 Summer Olympics, 2000 Summer Olympics, 1996 Summer Olympics, 1992 Summer Olympics Dezie
kọwara na URLhttp://www.old.ittf.com/stats_new/_Stats_03.asp?Player_ID=104279&, https://tabletennis.guide/profile.php?name=bose-kaffo-104279 Dezie

Bose Kaffo (onye a mụrụ n'ụbọchị nke 14 n'ọnwa Nọvemba nke afọ 1972 na Surulere,na Legos Steeti,nke Naijiria ) bụ onye egwuregwu ị pịa teniisi nke ala Naijiria nke gara asọmpi ise nke Olimpik site n'afọ 1992 ruo n'afọ 2008.

Ọ bụ nwanyị Naijiria nke abụọ na-asọmpi n'egwuregwu Olimpik ise, ma a gụchaa onye ọgba ọsọ Mary Onyali . Onye ọzọ ruru ihe ogo a n'afọ 2008 bụ Segun Toriola onye egwuregwu ị pịa teniisi. Ka ọ na-eru ngwụcha nke asọmpi Olimpiki nke afọ 2008, naanị mmadụ iri na atọ na-egwu egwuregwu teniiss gburugburu ụwa pụtarala opekata mpe egwuregwu nke Olimpik ise. Ndi ya na ya gbara abuo n’egwuregwu Olimpik bu Abiola Odumosu n’afo 1992 na Olufunke Oshonaike [1] site n’afo 1996 ruo n'afọ 2004.

O nwetala ihe nrite iri na ise (ọla edo asaa) n'asọmpi o mere n’otu n’otu na ndị abụọ abụọ n’egwuregwu isii nke All-Africa Games site n'afọ 1987 rue n'afọ 2007, na-erite opekata mpe otu nrite n’egwuregwu ọbụla. N'asọmpi o mere naanị ya, o ritere ọla edo n'afọ 1995, ọlaọcha n'afọ 1999 ma n'afọ 2007, na ọla nchara n'afọ 2003. [2] N'asọmpi ndị ha dị abụọ abụọ mee, o ritere ọla edo (ya na Olufunke Oshonaike) n’afọ 1995, n'afọ 1999, nakwazị n'afọ 2003, ọla ọcha n’afọ 1991, na ọla nchara n’afọ 2007. [3] Na Mixed Doubles, ọ ritere ọla edo n'afọ 1991 (ya na Atanda Musa ), n'afọ 1995 (ya na Sule Olayele ), na afọ 1999 (ya na Segun Toriola ) tinyere ọla ọcha n'afọ 1987 n'afọ 2003 yana ọla nchara n’afọ 2007. [4] Naịjirịa e meriela otu ọla edo na All-Africa Games.. [5]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Funke Oshonaike at Sports Reference
  2. Archived copy. Archived from the original on 2011-05-18. Retrieved on 2010-03-27.
  3. Archived copy. Archived from the original on 2011-05-18. Retrieved on 2010-03-27.
  4. Archived copy. Archived from the original on 2011-05-18. Retrieved on 2010-03-27.
  5. Archived copy. Archived from the original on 2011-05-18. Retrieved on 2010-03-27.

Njikọ dị na mpụga[dezie | dezie ebe o si]

  • Bose Kaffo at the International Table Tennis Federation
  • Bose Kaffo at the International Olympic Committee
  • Bose Kaffo at Olympics at Sports-Reference.com (archived)