Charly Boy

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Charly Boy
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha ọmụmụCharles Chukwuemeka Oputa Dezie
Aha enyereCharly Dezie
aha pseudonymArea Fada, CB, His Royal punkness Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya19 Jụn 1950 Dezie
Ebe ọmụmụNaijiria Dezie
ŃnàChukwudifu Akunne Oputa Dezie
Dị/nwunyeDiane, Stella Dezie
Asụsụ obodoAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa, Asụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
Ala nna ochieNaijiria Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)1982 Dezie
okpukpere chi/echiche ụwaEfefe Kraịst Dezie
ụmụ amaala kaOguta Dezie
ụdịAfrican popular music, Afrobeats, highlife Dezie
nnọchiaha nkeonweL485 Dezie

  Amụrụ Charly Boy, onye aha ọmụmụ ya bụ Charles Chukwuemeka Oputa ka mkpụrụ ụbọchị dị na iri na itoolu n'ọnwa Juun n'afọ 1950 (a makwaara ya dị ka CB, His Royal Punkness, na Area Fada), Ọ bụ onye Naijiria na agụ egwu na onye na-ede egwu, onye na-eme ihe ngosi telivishọn, onye na'eme ihe nkiri, onye na -ebipụta akwụkwọ, onye na emepụta egwu [1] Ọ bụ otu n'ime ndị ọha na eze na ekwu maka ha na-eme ihe ntụrụndụ na Naijiria. A maara ya nke ọma maka ụdị ndụ dị ichè ọ na ebi, echiche ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na mmepụta mgbasa ozi, ọkachasị The Charly Boy Show. Ọ rụrụ ọrụ dị ka onye isi oche nke Performing Musicians Association of Nigeria, na 2011. Ọ bụ onye ọka ikpe Idol Series.

Ọ bụ nwa nwoke nke abụọ nke onye bụbu onye ọka ikpe nke Ụlọikpe Kasị Elu bụ Chukwudifu Oputa, a mụrụ Oguta na ezinụlọ ndị Katọlik, Ọ bụkwa nwa nwanne nne nke onye egwu Sweden bụ Dr. Alban.[2] Dị ka ọ na-ajụkarị ikpughe ụbọchị amụrụ ya n'ajụjụ ọnụ, afọ ole ọdị bụ ihe zoro ezo ruo n'afọ 2011 mgbe ọmere emume ncheta ọmụmụ ya nke iri isii. Otú ọ dị, ụdị ndụ ya dị mgbagwoju anya ma Ọ mere ncheta ọmụmụ nke iri isii na atọ ya ka ọnwa Juunu dị na mkpụrụ ụbọchị iri na itoolu na afọ 2013, nke mere ka afọ ole ọdị bụrụ ihe esemokwu.[3]

Ọ bụ ezie na ọ kọwara ndị mụrụ ya dị ka ndị na-anabata ihe ndị na-agba kwa ụmụ ha ume ikwupụta obi ha n'enweghị ihe mgbochi, Oputa kwuputala na ha bụ ndị na chọ inọrọ onwe ha. Ọ chọburu ịbụ onye ụkọchukwu, mana ọ hapụrụ ụlọ akwụkwọ seminarị mgbe otu afọ gasịrị.[4] Mgbe ọ dị afọ iri na ụma, ọ kwagara America ebe ọ gara kọleji, gụsịa akwụkwọ ma jiri nzere degree pụta na Communications.[5]

ỊKỤ Egwú[dezie | dezie ebe o si]

Afọ 1982 rue Afọ 1985: Nwata Miss[dezie | dezie ebe o si]

Oputa banyere ọrụ ịkụ egwu n'afọ 1982, o rue n'afọ 1984, nanị ya wepụtara otu egwu dị elu ana-kpọ Obodo GiriGiri. N'afọ 1985, ọ fọrọ obere ka ọ ghara ikwe ka ya na Polygram Nigeria nwee nkwekọrịta ndekọ n'ihi ọdịdị ya na-abụghị nke ọtụtụ mmadụ ghọtara ruo mgbe a kọwaara ya nye onye isi nchịkwa nke akara ahụ bụ Ton Seysener onye bịanyere aka na ya, ma mekwaa ka ọha na eze nụ egwu ahụ ana-kpọ Nwata Miss.

Afọ 1988-rue Afọ 1990:1990[dezie | dezie ebe o si]

Na ngwụcha afọ 80, Oputa, site n'enyemaka nke onye na-emepụta ejiji na onye na-agụ egwú / onye na-ede egwú onye ana-kpọ Tyna Onwudiwe, mepụtara mmadụ ọhụrụ punk nke nwere jaket akpụkpọ anụ na akpụkpọ ụkwụ buutu, ịnyịnya ígwè ike , mohawks, na ntụziaka ọhụrụ na egwu, na-ejikọta pop Africa na Afrobeat.[6] Onye ọsụ ụzọ n'ime òtù punk nke Naijiria, n'oge na-adịghị anya, ọ nwetara aha na-abụghị nke gọọmentị His Royal Punkness, ọ gbanwekwara aha ebe obibi ya na Legọsụ kpọ ya The Punk Palace.[7]

  1. Charly Boy heads to Buddha temple. News2.onlinenigeria.com. Archived from the original on 9 August 2016. Retrieved on 5 January 2012.
  2. Chukudifu Oputa. Hallmarksoflabour.org. Archived from the original on 26 February 2013. Retrieved on 5 January 2012.
  3. My Body is My Altar
  4. Charly Boy declares his love for Catholic leader in open letter
  5. About Charly Boy. Charlyboy.org. Archived from the original on 26 April 2012. Retrieved on 5 January 2012.
  6. Charly Boy sings again. Archived from the original on 3 February 2016. Retrieved on 13 May 2014.
  7. Punk palace agog as Area Fada turns 60