Chinko Ekun
| Ụdịekere | nwoke |
|---|---|
| Mba o sị | Naijiria |
| Aha pseudonym | Chinko Ekun |
| Ụbọchị ọmụmụ ya | 13 Septemba 1993 |
| Ebe ọmụmụ | Ikeja |
| Asụsụ obodo | Asụsụ Yoruba |
| Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Asụsụ Yoruba, English, pidgin Naịjirịa |
| Ọrụ ọ na-arụ | rapper, onye na-abụ abụ, odee egwu |
| Ebe agụmakwụkwọ | Obafemi Awolowo University |
| Oge ọrụ ya (mmalite) | 2011 |
| Ngwa egwu | olu egwụ |
| Ụdị | egwu hip hop |
Oladipo Olamide Emmanuel (amụrụ ya na 13 septemba1993), onye amaara ama dika Chinko Ekun, bu onye na-eti egwu na onye na ede egwu Naịjirịa. [1]
Mmalite ndụ na agụmakwụkwọ
[dezie | dezie ebe o si]A mụrụ Chinko Ekun na Ikeja, Legọọsụ Stee
ti, Naịjirịa, n'ime ezinụlọ dị atọ, ebe ọ bụ nwa nke abụọ. [2] Ọ bụ nwa afọ Ikare, Ondo Steeti, Naịjirịa. [3] Chinko Ekun gara Blessing Nọsịrị na Praịmarị Sukulu, Oshodi, Legọọsụ Steeti na Remade Nọsịrị na Praịmarị Sukulu, Igando, Legọọsụ Steeti. Ọ gara Baptist Model High Sukulu, Ijegun, Legọọsụ Steeti maka ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Ọ gụsịrị akwụkwọ na ogo na Mahadum Obafemi Awolowo. [4] Ọ gara obodo nna ya ozi na Legọọsụ Steeti. [5]
Ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]2011–2014: Oge mbido ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]Mgbe Chinko Ekun dị afọ asaa, ọ malitere inwe mmasị n’egwú. N’afọ mbụ ya na mahadum, o nwere mmasị na azụmahịa na egwu rapụ. [6] Chinko Ekun ji ikike ya bido ọrụ egwu ya n’afọ 2011, ọ na-egosi vidiyo egwu ya na Instagram. N’afọ 2013, o weputara “Ekun” dika egwu izizi ya. N’afọ 2014, Chinko Ekun pụtara na abọm egwu Olamide "Street OT", n’ime egwu “100 To Million”, “Bang” na “Usian Bolt” [7] Ọ pụtara na "Olamide Live In Concert"(OLIC) 2014, ebe ọ rụrụ ọrụ firistaịlụ. [8] Chinko Ekun gụrụ egwu na Bekee, Pidgin na Yoruba, na-elekwasị anya na egwu hipu họpụ. Aha ya "Chinko Ekun" site n'okwu abụọ "Chinko" na "Ekun". "Chinko", n'ihi na a gwara ya na ọ dị ka onye China n'oge ọ nọ na mahadum na "Ekun", n'ihi na ọ bụ egwu mbụ ya. [9]
2015 – ugbu a: YBNL Nation na Dek-Niyor Entertainment
[dezie | dezie ebe o si]N'afọ 2015, Chinko Ekun sonyeere ' YBNL Nation ' nke Olamide. [10] Ọ wepụtara ọkwa izizi ya nke akpọrọ "Alejo Oran" na "Emi Na Re" site na YBNL Nation na 25 Febuwarị 2015. [11] Ka otu afọ gachara, ọ hapụrụ aha ndekọ ahụ mgbe nkwekọrịta ya gwụchara, ya na ndị ọrụ ibe ya Adekunle Gold na Viktoh. [12] Na 2017, o sonyeere Dek-Niyor Entertainment, ndekọ lebeelụ na Dubai. [13]
Na 13 Septemba 2018, ọ wepụtara egwu nke akpọrọ "Able God" nke gosipụtara Zlatan na Lil Kesh. [14] Egwú ahụ nyere ya ihe nrite Headies mbụ ya dịka "Best Street Hop Artiste" na The "Headies" 2019. [15] Egwu a natara nhọpụta nke "Popular Song of the Year" na 2019 "City People Music Awọdụ". [16] Ọ meriri "Street Song of the Year" na 2019 "City People Music Awọdụ. [17]
Ndụ onwe
[dezie | dezie ebe o si]Chinko Ekun alụbeghị nwanyị ma kpughee na ya adịbeghị njikere maka alụmdi na nwunye. [18]
Ihe nkiri
[dezie | dezie ebe o si]| Aha | Afọ |
|---|---|
| "Ekun" | 2013 |
| "Emi na re" | 2015 |
| "Alejo Oran" | 2015 |
| "Jen le yo" | 2015 |
| "Binu" | 2016 |
| "Bless Me" | 2016 |
| "Flenjo" | 2016 |
| "Wa Lo Da" | 2017 |
| "Gbefun" | 2017 |
| "Shake It" | 2017 |
| "Shayo" | 2017 |
| "Eruku de" | 2017 |
| "Yaso" | 2018 |
| "Bodija" | 2018 |
| "Switch It Up" | 2018 |
| "Able God" ft. (Zlatan Ibile and Lil Kesh) | 2018 |
| "Calling" ft. (Johnny Drille) | 2018 |
| "Semena" ft. (Peruzzi) | 2019 |
| "Mafo" | 2019 |
| "Party Animal" | 2020 |
Onyinye na nhoputa
[dezie | dezie ebe o si]| Afọ | Onyinye | Afọ | Onye nnata | Nsonaazụ | Ref |
|---|---|---|---|---|---|
| 2020 | Akara MVP nke Soundcity | Nhọrọ nke ndị na - ekiri ya | style="background: #FDD; color: black; vertical-align: middle; text-align: center; " class="no table-no2"|Ahọpụtara | [19] | |
| 2019 | Obodo ndị mmadụ Music Awards | Egwu okporo nke afọ | "Able God" | Merie | [17] |
| Egwu ama ama nke afọ | style="background: #FDD; color: black; vertical-align: middle; text-align: center; " class="no table-no2"|Ahọpụtara | [16] | |||
| Egwu amaala kacha mma nke afọ | style="background: #FDD; color: black; vertical-align: middle; text-align: center; " class="no table-no2"|Ahọpụtara | ||||
| Isi | Egwu họpụ kacha mma | style="background: #99FF99; color: black; vertical-align: middle; text-align: center; " class="yes table-yes2"|Merie | [20] |
Nsidee
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Aderemi, Adewojumi. "Chinko Ekun Looks To Claim The 'Best Rapper' Title On New Freestyle, 'Stewpid'", Konbini.com, 3 September 2019. Retrieved on 7 January 2020.
- ↑ "Claim of a rift between Olamide and me hilarious — Rapper, Chinko Ekuns", 30 December 2018. Retrieved on 7 January 2020.
- ↑ "Fully Updated: Chinko Ekun Biography and Net Worth", 2 September 2019. Retrieved on 7 January 2020.
- ↑ "Chinko Ekun Biography". Retrieved on 7 January 2020.
- ↑ Chinko Ekun Celebrates Completion Of NYSC Program, Shares Pictures Of Certificate (31 October 2019). Archived from the original on 23 October 2023. Retrieved on 7 January 2020.
- ↑ Olayanju, Kabir Oluwafemi. "Chinko Ekun Biography: Net Worth, Songs, Age, House, and Cars", Latestalert.ng, 6 July 2019. Retrieved on 7 January 2020.
- ↑ "Come 2016, Chinko Ekun will Lead YBNL to Fame, Money and Power", Informationng.com, 23 November 2015. Retrieved on 7 January 2020.
- ↑ "Olamide Live In Concert #OLIC, Records Huge Success, Ranks The Biggest Concert In Nigeria", Naijaloaded, 29 December 2014. Retrieved on 7 January 2020.
- ↑ Nwanne, Tomy. "Rapper Chinko Ekun Completes NYSC", Newsbreak.ng, 31 October 2019. Retrieved on 7 January 2020.
- ↑ Usaini, Nebianet. "YBNL Signs Two New Acts", SilverbirdTV. Retrieved on 7 January 2020.
- ↑ Ayomide, Tayo. "New Music Chinko Ekun - 'Alejo oran', 'Emi na re'", Pulse NG. Retrieved on 7 January 2020.
- ↑ Delano, Temitope. "Adekunle Gold, Chinko Ekun And Viktoh Exit YBNL", tooXclusive. Retrieved on 7 January 2020.
- ↑ Afolabi, Toju. "Chinko Ekun Left Olamide’s YBNL For Fresh International Lucrative Record Deal", Nigeriafilms.com. Retrieved on 7 January 2020.
- ↑ "Chinko Ekun "Able God" f. Lil Kesh & Zlatan", tooXclusive, 13 September 2018. Retrieved on 7 January 2020.
- ↑ "Headies 2019: Chinko Ekun Wins the best street-hop artiste of the year", The Nation Newspapers, 19 October 2019. Retrieved on 7 January 2020.
- 1 2 #CityPeopleMusicAwards: Nominees List Out. City People Magazine (25 October 2019). Retrieved on 7 January 2020.
- 1 2 Winners Emerge @ City People Music Awards. City People Magazine (5 November 2019). Retrieved on 7 January 2020.
- ↑ "Chinko Ekun: I am not ready for marriage", Galaxytvonline.com. Retrieved on 7 January 2020.
- ↑ Soundcity MVP Awards: Naira Marley, Davido, Wizkid, Teni make nominees list. BBC News Pidgin (28 December 2019). Retrieved on 7 January 2020.
- ↑ Full list of winners at Headies 2019 (21 October 2019). Retrieved on 7 January 2020.