Chinweizu Ibekwe

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Chinweizu Ibekwe
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya26 Maachị 1943 Dezie
Ebe ọmụmụEluọma Dezie
Asụsụ obodoAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụodee uri, Onye ntaakụkọ Dezie
onye were ọrụSan José State University Dezie
ebe agụmakwụkwọMassachusetts Institute of Technology, University at Buffalo, Government Secondary School, Afikpo Dezie
Ụcha ime anyadark blue Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ájá ájá Dezie
nnọchiaha nkeonweL485 Dezie

Chinweizu (amụrụ ya na 26 Machị1943) [1] bụ onye nyocha akụkọ nke naịjirịa, odee edemede, na onye ntaakụkọ . Ọ bụ ezie na ọ matala onwe ya, a makwara ya dịka Chinweizu, mana aha ya bụ Chinweizu Ibekwe . Mgbe ọ na-agụ akwụkwọ na United States n'oge ndị ojii na-azọ onwe ha, nke ahụ metụtara nka ihe ọmụma ya. [2] Ọ na-emekarị ihe gbasara ndị ojii nke ọma , o so na otu n’ime ndị isi ntaakụkọ akwụkwọ ọgbara ọhụrụ. O na-ede kọlụm nwere nnukwu mmetụta na The Guardian nke Legọọsụ .

Maka ya na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Chinweizu na 1943 n'obodo Eluoma, na Isuikwuato na mpaghara ọwụwa-anyanwụ nke Naịjirịa nke a maara taa dịka Abia Steeti .  Ọ gụrụ na Government Sekọndịrị Sukulu, Afikpo, ma mesịa gaa mahadum na Massachusetts Institute of Technology (MIT), ebe ọ na-amụ nkà ihe ọmụma na mgbakọ na mwepụ, Ọ nwetara digirii nke sayensị ya na 1967, n'afọ agha Bịafra bidoro na Naịjirịa, nke were afọ abụọ na ọkara. [1] N’oge ahụ ọ bi na Cambridge, Massachusetts, Chinweizu hiwere ma dezie Biafra Review (1969–70).

O debanyere aha ya maka Ph.D. na "State University of New York" na Buffalo, n'okpuru nlekọta nke onye ọka mmụta ndọrọ ndọrọ ọchịchị sayensị Claude E. Welch Jr. Chinweizu na ndị disatechọnụ kọmitii ekwekọrịtaghị,o were akwụkwọ ya pụọ nke o bipụtara dịka The West and the rest of us: White Predators, Black Slavers, na African Elite site na Random House na 1975. [3] O were akwkwọ ahụ wegara Sunny, Buffalo, ebe enyere ya asambodo Ph.D na 1976, otu afọ gasịrị o bipụta disatechọnụ ya. N'ihi ya ụlọ ọrụ mbipụta doro ya na onye ndụmọdụ ya. [ <span title="This claim needs references to reliable sources. (May 2020)">see okwu dị mkpa</span> ]

Nkuzi na Isiokwu[dezie | dezie ebe o si]

Chinweizu malitere nkuzi na mba ofesi na MIT na San Jose Steeti University. O laghachiri Naịjirịa na mbido afọ 1980, ọ na-arụ ọrụ dịka Kọlọmisti na ọtụtụ akwụkwọ akụkọ, ma na-agbakwa mbọ ị kwado ntụgharị Uche ndị ojii. Na Naịjirịa ọ bụ onye nyocha agụmagụ, ọ na-agbabido ihe ndị nrachaa ike ndị odee akwụkwọ Naịjirịa, ọkachasị Wole Soyinka. Ọ bụ onye ndezi na agụmagụ magazịnụ nke Naịjirịa. Isiokwu Chinweizu ama nke ọma pụtara na edemede a "The Decolonization of African Literature " ( nke agbakwụnyere na akwụkwọ a bụ "Toward the Decolonization of African Literature na 1983), nke Wole Soyinka zaghachiri na edemede ya bụ " Neo-Tarzanism:The Poetics of Pseudo-Transition". Na akwụkwọ Chinweizu ọzọ bụ "Anatomy of Female Power", bụ ebe ọ kọwara maka otu nwoke na nwanyị, ume nwoke na nke nwanyị.

Chinweizu kọwara na ọchịchị na ị mee ka ndị Afrịka kpebe alakụba nke ndị Arabụ adịghị iche na nke ndị Iroopu. Ọgba aghara, ịkwanye mmadụ na ohu nke ndị iroopu ụka kraist adịghị iche na nke ndị Arabụ alakụba mere ndị nke ha. N'eziokwu ohu nke ndị Arabụ bidoro tupu ndị Iroopu were bido nke ha were ruo taa, na Sudan, Mauritania na mba ndị ọzọ dị na mba sahelụ. O kwenyere na ndị Arabụ na Iroopu emeela ọtụtụ mpụ n'ebe ụmụ Afrịka nọ. Ọ jụrụ kpam kpam na nkwenye ụfọdụ ndị mmadụ na Alakụba abụghị ihe ohu na ịsọ ụdịdị mmadụ. Ọmenala ndị Arabụ na Alakụba bụ otu, maka mwakpo ndị mmadụ na kwa ụka klaịstị na Iroopu.

Ụfọdụ akwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

  • The West and the Rest of Us: White Predators, Black Slavers, and the African Elite, Random House, 1975.  
  • Energy Crisis and other poems, Nok Publishers, 1978
  • Toward the Decolonization of African Literature, Vol. 1: African Fiction and Poetry and Their Critics (with Onwuchekwa Jemie and Ihechukwu Madubuike), Howard University Press, 1983.  ISBN 978-0882581224
  • Invocations and Admonitions: 49 poems and a triptych of parables, Pero Press, 1986.  ISBN 978-9782358875
  • Decolonising the African Mind, Sundoor, 1987.  ISBN 978-9782651020
  • Editor, Voices from Twentieth Century Africa: Griots and Towncriers, Faber and Faber, 1989.  ISBN 978-0571149308
  • Anatomy of Female Power: A Masculinist Dissection of Matriarchy, Pero, 1990.  ISBN 978-9782651051

Edemede

  • "Prodigals, Come Home!" (1973), naTejumola Olaniyan na Ato Quayson, eds, African Literature: An Anthology of Criticism and Theory, Oxford: Blackwell, 2007.  ISBN 978-1405112017.

Hụ kwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Imegide nwanyị
  • Nwoke ahụ Emechiri Emechi

Nsidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 R. Victoria Arana, "Chinweizu (1943–)", The Facts on File Companion to World Poetry: 1900 to the Present, Facts On File, Inc., 2008, p. 102.
  2. Simon Gikandi, "Chinweizu", Encyclopedia of African Literature, Routledge, 2002, p. 146.
  3. Chinweizu - World Afropedia.

Na mpụga[dezie | dezie ebe o si]