Chinyere Kalu
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
Ụbọchị ọmụmụ ya | 1970 |
Ebe ọmụmụ | Naijiria |
Asụsụ obodo | Asụ̀sụ̀ Ìgbò |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin Naịjirịa |
Ọrụ ọ na-arụ | aircraft pilot |
Ihe nrite | Order of the Federal Republic |
Chinyere Kalu, MFR (onye aha nna ya bụ Onyenucheya) bụ nwanyị Naijiria mbụ n'ọrụ ọkwọ ụgbọelu na nwanyị mbụ kwọrọ ụgbọelu na Naijiria. Ọ rụrụ ọrụ dị ka rektọ na onye isi nkuzi nke "Nigerian College of Aviation Technology" site n'ọnwa Ọktọba afọ 2011 ruo na Febụwarị afọ 2014. [1] [2]
Ndụ[dezie | dezie ebe o si]
Nwaafọ Akwete,nke Ukwa East LGA dị n'Abia State, <a href="https://en.wikipedia.org/wiki/Eastern_Nigeria" rel="mw:ExtLink" title="Eastern Nigeria" class="mw-redirect cx-link" data-linkid="33">Eastern Nigeria</a>, Kalu tolitere n'okpuru nlekọta nne ya mgbe nne na nna ya kewara. O tolitere na nnukwu ezinụlọ na-akwado ya. O kpebiri ị malite ọrụ ya n'ihe gbasara ụgbọelu n'ihi nwanne nne nna ya, nke a ma ama maka njem mba ofesi. Ọ nwere agụmakwụkwọ ụlọ akwụkwọ praịmarị ya na Anglican Girls Grammar School,dị na Yaba,na Legos Steeti, tupu ọ gaa ọzụzụ dịka onye ọkwọ ụgbọ elu azụmahịa n'afọ 1978 na Nigerian College of Aviation Technology, Zaria n'okpuru SP.12 Batch. O mechara were ọtụtụ ọmụmụ ụgbọelu na ụgbọ njem na United Kingdom ma n'Amerịka tupu ọ nata akwụkwọ ikike ya dị ka onye ọkwọ ụgbọ elu azụmahịa n'ụbọchị nke 20 n'ọnwa Mee nke afọ 1981, site na Nigerian College of Aviation Technology // . N’ọnwa Ọktọba afọ 2011, onye isi ala Goodluck Jonathan họpụtara ya ka ọ bụrụ rektọ na onye isi nkuzi nke Nigerian College of Aviation Technology. N’ọnwa Febụwarị afọ 2014,bụ Captain Samuel Caulcrick nọchiri anya ya.
Nhubaama[dezie | dezie ebe o si]
O bu onye otu Nigerian Women Achievers Hall of Fame ma burukwa onye otu <a href="https://en.wikipedia.org/wiki/Order_of_the_Federal_Republic" rel="mw:ExtLink" title="Order of the Federal Republic" class="cx-link" data-linkid="48">Order of the Federal Republic of Nigeria</a>, ọkwa nke e nyere ya n'afọ 2006. [3] [4]
Onyinye ndị ọzọ e nyere ya gụnyere African International Achievers Merit Award nke afọ 2007; Rare Gems Professional Achievements Award nke afọ 2007; na Nigeria's 50 Greatest Women of Democratic Administration of Ghana n'afọ 2012. [5]
Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]
- ↑ "Dangerous Flight: I flew plane with water in the engine – Chinyere Kalu, first female commercial pilot". Retrieved on 13 February 2017.
- ↑ Pin on Uzomedia updates (en). Retrieved on 29 May 2020.
- ↑ "Captain Chinyere O. Kalu: Nigeria’s first female pilot", 24 January 2014. Retrieved on 13 February 2017.
- ↑ W, Editor (14 January 2020). Captain chinyere onyenaucheya-Nigeria's first female pilot. Archived from the original on 9 May 2020. Retrieved on 29 May 2020.
- ↑ Tori.ng. "Meet Captain Chinyere Kalu, Nigeria's First Female Pilot (Photo)", Tori.ng. Retrieved on 24 May 2018.