Chioma Onyekwere

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Chioma Onyekwere
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereChioma Dezie
aha ezinụlọ yaOnyekwere Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya28 Jụn 1994 Dezie
Ebe ọmụmụLansing Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụasọmpi egwuregwu Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity System of Maryland Dezie
Ụcha ime anyaagba aja aja Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
ụdị egwuregwuegwuregwu Dezie
ịdọ aka ná ntị egwuregwu asọmpidiscus throw Dezie

Chioma Chukwujindu "CiCi" Onyekwere a mụrụ n'ụbọchị nke 28 n'ọnwa Juunu, n'afọ 1994 bụ nwaafọ Naijiria a mụrụ na Lansing,dị na Michigan n'Amerịka,na-eme egwuregwu ị tụ diskus.Ọ sọọla mpi shọtpuutu na diskus na kọleeji nakwa mba ndi ozo ebe ọ nọchitere anya Naijiria. Ọ nwere nrite onye nke kachasị mma nke mita 61.38 maka diskus ọ tụrụ na 2019 World Athletics Championship.

A mara ya maka mmuta ya na agụmakwụkwọ dị ka nwa akwụkwọ na-eme egwuregwu na Mahadum nke Maryland n'afọ afọ anọ site na Big Ten na ACC mgbe ọ na-eje ozi dị ka otu n'ime ndị isi ndị otu egwuregwu. Nsọpụrụ ndị kọleeji ya gụnyere All-American recognition, All-Big Ten honors, All-Academic Big Ten, 5 Big Ten Conference Medals, na onye natara onyine Solomon Eye Terp of the Week . [1] O ritere ihe nrite ọla edo maka diskus na asọmpi iko mba Afrịka nke afọ 2018 n’Asaba,na Naijiria. O ritere ihe nrite ọla edo ọzọ maka diskus na asọmpi Afrịka nke afọ 2019 na Rabat,dị na Moroko.

Ndụ onwe ya[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ ya nye Chima & Scholar Onyekwere ya na ụmụnne ejima atọ Chidinma na Chima na ụmụnne ya ndị tọrọ Emeka na Kay. Onyekwere tolitere na Naijiria ma kwaga Fairfax,nke Virginia n'afọ 2002 ya na ezinụlọ ya. Ọ gụsịrị akwụkwọ na A. James Clark School of Engineering na Mahadum nke Maryland na Winter afọ 2016 na nzere bachelọ nke sayensị na Mechanical Engineering.

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Tupuu Kọleejị[dezie | dezie ebe o si]

Onyekwere gara James W. Robinson High School na Fairfax, VA. Ọ sọrọ mpi n'okpuru nduzi nke onye na-atụburu Maryland diskus bụ Beau Fay. Onyekwere abụghị naanị onye mmeri distrikti ọtụtụ oge mana ọ bụbukwa onye jidere ọkwa okaibe ugboro abụọ na shọt-puutu. O ritere ọkwa ọkaibe mpaghara ahụ n'afọ 2011 ma n'afọ 2012, onye nke 3 na steeti n'afọ 2011 na 2012, ma onye nke 5 na Nationals n'afọ 2012. [2]

Mahadum nke Maryland[dezie | dezie ebe o si]

Chioma debara aha na Mahadum nka Maryland na Fall afọ 2012 ebe o sonyeere ndị otu egwu Track na Field nke onye bụbu US Olympia Andrew Valmon kụziri .

N'afọ 2015, Onyekwere meriri nrite kọleeji mbụ ya na agba nke mbụ Maryland n'egwuregwu Big Ten Conference. N'asọmpi 2015 Big Ten Indoor Track and Field Championship, Onyekwere nwetara ọla ọcha na Shọtpuutu na oke elu ya nke 16.06 mita (52 '8.25 ”). E nyere ya ogo nke abụọ na Team All-Big Ten maka agba nke ime ụlọ. Nchịkwa ya na shọtpuutu bufere n'ime agba nke èzí dị ka o ritere ọla nchara na Big Ten Outdoor Track & Field Championships site n'akara akara nke 16.10 mita (52 '10 "). Ọ gbakwunyere na ngwụcha Top 10 Conference a site na ị bụ onye nke 7 na ị tụ diskus.

Onyekwere nwetara mmeri ikpeazụ ya na Big Ten Indoor Track & Field Championship n'afọ 2016 site na ị nweta ọla ọcha na Weight Throw. Akara nrịba ama ya kachasị elu nke 21.17 mita (69 '5.5 ”) abụghị naanị nke onwe ya kachasị mma, mana o kachapụrụ akara nke kwụbu kemgbe afọ 14. O gbatara onye nke 6 n'asọmpi shọtpuutu na nzukọ a. Tinyere i nweta ọkwa nke 2 na Team All-Big Ten n'afọ nke abụọ n'esote, ọ akara ya ahụ kachapụrụ akara kwụbu mekwara ka o ruo agba nkw 2016 NCAA Division I Indoor Track & Field National Championship. Omume ya n'asọmpi a dị mma ka bụ na e nyere ya onyinye dị ka onye ọkwa nke 2 na Team All-American Indoor nke afọ 2016.

Ọchịchị ya gara n'ihu ka agba nke ikpeazụ ọ na-aga n'èzí na-aga n'ihu. Na UVA Quad Meet na Charlottesville, VA, Onyekwere mebiri akara ụlọ akwụkwọ dị afọ 34 na diskus na ọtụtụ nke 52.4 mita (171 '11 ”). Ọ ga-aga n'ihu iji degharịa akara diskus a na Big Ten Outdoor Track and Field Championship na ịtụba 54.43 mita (178 '7 ”). Ihe ọtụtụ a wepụtara ihe nrite nke ọla nchara. Onyekwere tụrụ shọtpuutu nke kachasị mma nke 16.85 mita (55 '3.5 ”) na-enweta ọla ọcha,nke 5 ya na Big Ten, na 2nd Team Big-Ten Honors ọzọ Ọ gara n'ihu ị sọ mpi na NCAA East Regional Championship maka shọtpuutu na diskus ebe ọkwa nke 11 na shọtpuutu mere ka o ruo maka NCAA Outdoor T&F Championship. Na ngwụch agba a, e nyere ya onyinye nkwanye ugwu dị ka All-American Honorable Mention for the 2016 Outdoor Season.

Ka ọ gụchara Kọleeji[dezie | dezie ebe o si]

Dịka onye otu Nigerian Senior National Track and Field Team, a kpọrọ Onyekwere ka o sonye n'asọmpi African Championship nke afọ 2016 na Durban,dị na Saụt Afrịka. Ọ ga-aga n’ihu i rite ọla nchara abụọ n ’egwuregwu ndị a. O nyeere aka mezuo ikpo mmeri nke Naijiria site na i nweta ọkwa nke 3 na diskus na ọtụtụ nke 53.91 n'azụ ndi otu yNwanneka Okwelogu na Chinwe Okoro . Ọ nwetakwara ọkw nke atọ na shọtpuutu site na i nweta akara nke 15.71 mita. [3]

N'asọmpi 2018 African Championships in Athletics n'Asaba, nke Naijiri, Onyekwere kpebiri i tinye uche ya na sọọsọ diskus. Nke a kwụrụ ụgwọ ka ọ na-egosi ihe ngosi maka obodo ya, na-enweta ọla edo na diskus na nsonye akara kachasị mma nke 58.09 mita. [4] A kpọrọ Onyekwere ka ọ nọchite anya Team Africa na 2018 IAAF Continental Cup nke e mere na Ostrava,na Czech Republic. O mechara n'ọkwa nke anọ n'isi ọtụtụ mita 56.68 were nwee akara kachasị atụ nke onye ọ bụla tụrụ si n'Afrịka n'asọmpi a. [5]

N’afọ 2019, o ritere ihe nrite ọla edo n’egwuregwu African Games nke afọ 2019 na Rabat, dị na Moroko. Ihe mmeri ya nke mita 59.91 bụkwa akara kachasị na African Games n'egwuregwu diskus.. Onyekwere sonyekwara n'asọmpi IAAF World Athletics Championship nke afọ 2019 na Doha. Ọ tụtara akara kachasị mma nke 61.38m na agba nke ntozu ma mechaa n'ọkwa nke 13, otu nkeji fọdụụrụ ya ịga n'ihu ruo njedebe.

Asọmpi mba ụwa[dezie | dezie ebe o si]

Mara: Naanị ọnọdụ na ntọanya dị na njedebe ikpeazụ ka a na-egosi, belụsọ na e kwuru ya. (q) pụtara onye na ome egwuregwu erughị agba nke ikpeazụ, ya na ọkwa ya na ntọanya ya n'ogo ntozu e gosiri.{| Àtụ:AchievementTable |- | rowspan="2" |2016 | rowspan="2" |African Championships | rowspan="2" |Durban, South Africa | bgcolor=cc9966 | 3rd | Shot put | 15.71 m |- | bgcolor=cc9966 | 3rd | Discus | 53.91 m |- | rowspan="2" |2018 |African Championships | Asaba, Nigeria |bgcolor=gold|1st | Discus | 58.09 m SB |- |Continental Cup | Ostrava, Czech Republic | 4th | Discus | 56.68 m |- | rowspan="2" |2019 |African Games | Rabat, Morocco |bgcolor=gold|1st | Discus | 59.91 m GR |- |World Championships | Doha, Qatar | 13th (q) | Discus | 61.38 m PB |}

Nrite ya na mba[dezie | dezie ebe o si]

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. "Solomon Eye Associates Terp of the Week: Chioma Onyekwere".
  2. "Chioma Onyekwere Biography".
  3. "Nigeria finishes a disappointing 3rd at 2016 African Championships | MAKING OF CHAMPIONS", MAKING OF CHAMPIONS, 2016-06-27. (in en-US)
  4. Okagbare in action as Nigeria wins three more gold medals. Retrieved on 10 August 2018.
  5. IAAF: Report: women's discus throw - IAAF Continental Cup Ostrava 2018. Retrieved on 2018-09-27.