Christy Obekpa

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Christy Obekpa
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereChristy Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya15 Disemba 1971 Dezie
Ebe ọmụmụNaijiria Dezie
Asụsụ obodoAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụjudoka Dezie
ụdị egwuregwujudo Dezie

Christy Obekpa bụzị Oriakụ Aremu (A mụrụ n'ụbọchị nke 15 n'ọnwa Disemba afọ 1971) bụ onye Najiria na-eme egwuruegwu judoka, onye so sọọ mpi na katigori ọkara nke ndi oke ibu nke ụmụ nwanyị. O ritere ọla nchara n'afo1990 n'emume egwuruegwu Judo nke ndi Commonwealth na ọla ọcha na CW Judo Championship n'afo 1992. Oriakụ Aremu bụ nwaanyị mbu Naịjirịa ritere ola n'ihe emume egwuruegwu Judo. O ritekwara ola nchara abuo na 1999 n'emume All-African Games na otu ola nchara n'emume African Judo Championships n'afo 2000. [1]

Ọrụ egwuregwu[dezie | dezie ebe o si]

N'afo 1990, na Commonwealth Judo Championship nke e mere na Auckland, New Zealand, o sonyere na ihe omume nke 72kg ebe o ritere ọla nchara. [2] Na 1992 Commonwealth Judo Championships nke e mere na Cardiff, Wales, o sonyekwara ma ritekwa ọla ọcha na ihe omume 72kg. [3]

N'egwuruegwu All-Africa Games nke afo 1999 na Johannesburg, Obekpa sonyere n'emume nke 78kg na Open, ebe o ritere ola nchara abụọ. [4]

N'egwuruegwu African Judo Championship nke afo 2000 e mere na Algiers, Algeria, Obekpa ritere ọla nchara n'ihe omume nke 78kg. O sokwara n'emume Open were gbaa onye nke asaa. [5]

Ebemsidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Christy Obekpa, Judoka, JudoInside. www.judoinside.com. Retrieved on 2020-11-20.
  2. Commonwealth Games Auckland, Event, JudoInside. www.judoinside.com. Retrieved on 2020-11-20.
  3. Commonwealth Championships Cardiff, Event, JudoInside. www.judoinside.com. Retrieved on 2020-11-20.
  4. African Games Johannesburg, Event, JudoInside. www.judoinside.com. Retrieved on 2020-11-20.
  5. African Championships Algier, Event, JudoInside. www.judoinside.com. Retrieved on 2020-11-20.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]