Dave Umahi

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
David Nweze Umahi
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereDave Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya25 Julaị 1964 Dezie
Ebe ọmụmụOhaozara Dezie
Asụsụ obodoAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jiGovernor of Ebonyi State, Deputy Governor of Ebonyi State, onye otu ndi omeiwu nigeria Dezie
ebe agụmakwụkwọEnugu State University of Science and Technology, Government Secondary School, Afikpo Dezie
isi agụmakwụkwọcivil engineering Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịPeople's Democratic Party Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
nnọchiaha nkeonweL485 Dezie

David Nweze Umahi (Onye a mara ka Dave Umahi, Amụrụ ya n'abali iri abụọ na ise nke ọnwa Julai afọ 1964) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị n'ala Naijiria na-eje ozi ka ọdi ugbua dị ka Gọvanọ nke Ebonyi Steeti, Naijiria. [1]

Mmalite ndu na Agụm Akwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Onye amụrụ n’abalị mbụ n’ọnwa mbụ n’afọ 1964, Umahi bụ nwa nwoke nke Okenye Joseph Umahi Nwaze na Margaret Umahi nke Umunaga, Uburu dị na okpuru ọchịchị ime obodo Ohaozara, nke di ugbu a na Steeti Ebonyi. [2] [3] Umahi nwetara agụmakwụkwọ sekọndrị ya na Ishiagu High School n'ụlọ akwụkwọ Sekọndrị́ nke Gọọmenti nwe na Afikpo tupu ọ banye Mahadum Sayensị na Nkà na ụzụ nke Steeti Enugu n'afọ 1982. Ọ gụsịrị akwụkwọ n'afọ 1987 ma nweta nzere Bachelor of Science na Civil Engineering.  N'afọ 1990, o tinyere aka iguzobe Norman Engineering and Construction Nig. Limited ya na Ombo Isokarari ọ rukwara ọrụ dịka onye isi njikwa ya ruo afọ 1993. Ruo afọ 2011, ọ rụrụ ọrụ dịka onye isi ụlọ ọrụ Brass Engineering & Construction Nig. Ltd. , Focus Investment Nig. Ltd., na Osborn La Palm Royal Resort Ltd.  Ọ si na ezinụlọ nke dị mmadụ itoolu gụnyere ụmụ nwanyị abụọ na ụmụ nwoke asaa, nke otu n'ime ha bụ Major-General Obi Abel Umahi (Rtd.), bụbụ Onye isi oche nke South-East Security Committee, Ebubeagu mana ọ gbara arụkwaghịm na Mee, [./ 2021https: //thenationonlineng.net/breaking-umahi-resigns-as-chairman-southeast-security-committee/ 2021] [4], Roy Umahi Nwaeze, onye ọkaiwu gbasara iwu, Austin Umahi Nweze onye bụbụ onye osote onye isi oche nke Ndi otu People's Democratic Party, Mpaghara Ọwụwa anyanwụ [5], tinyere ndị ọzọ.

Ndọrọ ndọrọ ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

Umahi banyere n’ọrụ ịjere ọhaneze ozi n’afọ 2007 dị ka onye na_arụtụ ọrụ dịka onye isi oche nke otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị People's Democratic Party nke Ebonyi Steeti . Site n'afọ 2009 rue afọ 2011, o jere ozi dika onye isi oche nke ndi otu a . N’oge ahụ, ọ jekwara ozi otu afọ na njikwa ndị isi ọchịchị nke Federal Medical Center dị na Asaba dị ka onye isi oche ha. 

N’afọ 2011, Umahi ghọrọ osote gọvanọ Steeti Ebonyi n’otu tiketi ya na Gọvanọ nke nọ mgbe ahụ bụ Martin Elechi . Mana, n’afọ 2014, Gọvanọ Elechi kwadoro Onyebuchi Chukwu, Mịnịsta na-ahụ maka ahụike ka onye nọchiri ya, nke Umahi kwuru na omegidere nghọta ha nwere na ọ bụ ya ga-arụ ọrụ ahụ. [6] [7] Umahi gara n'ihu merie Chukwu na ntuli aka nke ana eme na-ogo pati ighọpụta onye nnọchite anya otu pati. [8] Ọgba aghara juputara n'oge fọdụrụ n'oge ọchịchị Elechi, enwere ọkụ ọgbụgba na-ụlọ Nzukọ Omeiwu n'ọnwa Febụwarị afọ 2015 na mbọ agbagasirị ịwepụ ya n'oche ọchịchị n'ngwụcha ọnwa ahụ n'ihi ebubo ezighi ezi nke usoro iwu na-akwadoghị, tinyere ịgbari ego n'ụzọ iwu akwadoghi na mmegide ndị ọzọ. [9] [10] [11] A họpụtara Umahi ka ọbụrụ Gọvanọ n'abali iri n'abụọ nke ọnwa Eprel afọ 2015 na ntuli aka nke ndị ọtụ ndọrọndọrọ ọchịchị Ndị ọrụ, All Progressive Congress na All Progressive Grand Alliance gbaghara na mgbakwasị ụkwụ na enwere "mmebi iwu zuru oke, ogbugbu egburu ndị mmadụ, na mbibi oke akụ nke ihe onwunwe". [12] [13] N’ọnwa Ọktọba afọ 2015, ụlọ ikpe n'ahụ maka ntuli aka ndị gọvanọ nyere nkwado nke iwu kwadoro nhọpụta a. [14]

N’abalị iri na isii nke ọnwa Maachị, afọ 2019, a họpụtagariri David Umahi ọzọ dịka Gọvanọ na ntuli aka gọvanọ steeti Ebonyi. O nwetara vootu Puku narị atọ iri itolu n'atọ na narị atọ iri anọ n'atọ iji merie Sonny Ogbuoji nke APC bụ onye ritere vootu Puku iri asatọ na otu na narị asaa n'atọ. [15]

Mgbabanye otu APC[dezie | dezie ebe o si]

N'abali iri na otu nke ọnwa Nọvemba, afọ 2020 Gọvanọ Dave Umahi kwupụtara ebumnuche ya isonyere ndị otu All Progressive Congress (APC) n'abali iri na asaa nke ọnwa Nọvemba afọ 2020 ọ gbabanyere na pati ahụ ka atụwara anya ya ogologo oge. Umahi mere nkwupụta ịbanye otu APC maka ihe ndị n'uche nke ya kpatara ya, otu n'ime ha bụ na " People's Democratic Party (PDP) na eme ihe ezighi ezi na mpaghara Ndịda Ọwụwa Anyanwụ " na nke abụọ, " na otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ atọrọla otua ". Ọ gbakwụnyere echiche iji mejụọ ihe ana-ekwu na ya banyere APC n'ihi na ọ chọrọ tiketi onye isi ala nke ana-ekweghị ya nkwa na otu PDP site n'ikwu na ọ ga-akwụsị ndọrọ ndọrọ ọchịchị n'afọ 2023 mgbe ọ hapụsịrị ọkwa dị ka gọvanọ. [16]

Onye isi ala Muhammadu Buhari kelekwara Umahi maka mgbabata ya na otu APC, ọ kọwara njem a dị ka nzọụkwụ di ike nke gbakwasịrị na-ụkpụrụ nchịkwa karịa ịkwalite ohere ma ọ bụ mmanye [17] [18]

Hụ kwa[dezie | dezie ebe o si]

Ebe ndị esi dee[dezie | dezie ebe o si]

 

Njikọ dị na mpụga[dezie | dezie ebe o si]

  1. "Umahi wins Ebonyi governorship election", New Telegraph, April 12, 2015. Retrieved on April 12, 2015.
  2. Founders. daveumahifoundation.com. Archived from the original on 2015-11-25. Retrieved on 2015-10-21.
  3. David Umahi: Nigerian governors mourn with Ebonyi state governor over mum's death. pulse.ng. Archived from the original on 2015-11-25. Retrieved on 2015-10-21.
  4. Umahi resigns as chairman Southeast security committee | The Nation (en-US). Latest Nigeria News, Nigerian Newspapers, Politics (2021-06-07). Retrieved on 2021-06-10.
  5. TODAY (2021-04-05). 2023: PDP, APC battle for the soul of Ebonyi (en-US). TODAY. Retrieved on 2021-06-10.
  6. Why Governor Elechi Lost Grip Of Ebonyi State Pdp | Nigerian News from Leadership News. Nigerian News from Leadership News. Retrieved on 2015-10-21.
  7. http://pointblanknews.com/pbn/exclusive/2015-elechi-anyim-turn-ebonyi-battleground/
  8. Jonathan Wades Into Ebonyi Crisis, Summons Elechi, Anyim, Umahi | Nigerian News from Leadership News. Nigerian News from Leadership News. Retrieved on 2015-10-21.
  9. Ebonyi: Fiery meltdown! - Vanguard News. Vanguard News. Retrieved on 2015-10-21.
  10. Archive copy. Archived from the original on 2015-07-05. Retrieved on 2021-06-17.
  11. Impeachment saga: Gov Elechi fights for survival | Newswatch Times. Newswatch Times. Archived from the original on 2015-11-25. Retrieved on 2015-10-21.
  12. PDP Candidate Dave Umahi Wins Ebonyi Guber Poll | Nigerian News from Leadership News. Nigerian News from Leadership News. Retrieved on 2015-10-21.
  13. PDP’s Umahi Declared Winner Of Ebonyi Governorship Poll. Channels Television. Retrieved on 2015-10-21.
  14. Tribunal upholds Governor David Umahi's election - Premium Times Nigeria. Premium Times Nigeria. Retrieved on 2015-10-21.
  15. https://www.premiumtimesng.com/news/top-news/319292-its-official-david-umahi-wins-ebonyi-governorship-election.html
  16. Why I dumped PDP for APC -- Umahi (en-GB) (2020-11-17). Retrieved on 2020-11-19.
  17. President Buhari Praises Umahi’s Defection, Says It Is Based On Principle Rather Than Coercion (en-US). Daily Concord News (2020-11-18). Archived from the original on 2020-11-18. Retrieved on 2020-11-19.
  18. Buhari commends Umahi for defecting to APC | Premium Times Nigeria (en-GB) (2020-11-18). Retrieved on 2020-11-19.