Jump to content

Demas Nwoko

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Demas Nwoko
mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha enyereDemas Dezie
aha ezinụlọ yaNwoko Dezie
ụbọchị ọmụmụ ya1935 Dezie
ọrụ ọ na-arụonye na-ese ụkpụrụ ụlọ, omenkà, academic, lecturer Dezie
onye were ọrụUniversity of Ibadan Dezie
Ọrụ ama amavisual arts Dezie
nnọchiaha nkeonweL485 Dezie
otu eserese Demas Nwoko 'nwata aririọ
Eserese Demas Nwoko 'ụmụaka na ịnyịnya ígwè'

Demas Nwoko (onye amụrụ n'afọ 1935) bụ onye Naijiria na ese ọtụtụ ihe dị ka ihe eserese na mmebe ntụpụta ụkpụrụ ụlọ ma bụrụ kwa nnukwu onye na-ewu ụlọ. Dị ka onye na-ese ihe, ọ na-agbasi mbọ ike itinye usoro ọgbara ọhụrụ dị iche iche na ihe owuwu ụlọ. Ọ na etinye kwa atụmatụ ihe dị iche nke na egosi ihe gbasara ndi isi ojii, ndị Africa na ọtụtụ ọrụ ya. Site n'afọ 1960 na aga n'iru ruo ihe dị ka afọ 1969, ọ bụ onye otu ndị Mbari klọb nke Ibadan, ndị otu ndị Naijiria na ndị omenkà si mba ofesi. Ọ bụkwa onye nkuzi na Mahadum nke Ibadan . Ka afọ 1970 na aga n'iru ruo ihe dị ka afọ 1979, ọ bụ onye mbipụta akwụkwọ akụkọ akpọrọ New Culture (ọdịbendị) nke na na-adịghịzi adị ugbu a. [1]

Nwoko, na-ahụ ime ihe eserese dịka ọrụ amamịghe nke a na elekwasị anya ka ọrụ dịịrị mmadụ maka mmetụta ọma na gburugburu ebe obibi na ọdịbendị nke ọha mmadụ. [2]

Akụkọ nke ndụ ya

[dezie | dezie ebe o si]

Mbido ndụ

[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Nwoko na afọ 1935 na Idumuje Ugboko, obodo nke nwere nwa nwanne ya dịka Obi (Eze) ugbu a (Chukwunomso Nwoko). Nwoko tolitere na Idumuje Ugboko. Mgbe mgbe ọ bụ nwata, ihe owuwu ụlọ ndị e wuru ọhụrụ n’obodo ha na n’obí Obi, nna ya, nyere ya nnukwu mmasi. [3] Ọ gara mụọ Fine Arts na kọleji nke nka, sayensị na teknụzụ, n’afọ 1956, otu afọ mgbe ebugharịrị kọleji ahụ site n’ebe ọ nọbu n’Ibadan wee gaa Zaria. Na afọ 1962, ọ nwetara ohere mmụta na n’akwụghị ụgwọ ọ bụla na Congress nke Cultural Freedom na obodo Paris nke di na France ebe ọ mụtara usoro ka esi emewe ihe eserese na ụzọ dị iche iche. [4]

Ulọ akwụkwọ nkà mmụta nke Zaria

[dezie | dezie ebe o si]

Site na afọ 1957 ruo na 1961 ọ gụrụ Fine Arts na ụlọ akwụkwọ nke ama bụru dịka College of Arts, Science na Technology, Zaria (nke bụ Mahadum Ahmadu Bello ugbu a), ebe ekpughere ya usoro nke nka ama ama nke ndị ofesị agbanyeghị na ọtụtụ ndị nka nọ n'ụlọ akwụkwọ ahụ na egosipụta isiokwu ọrụ ha ka ndị Africa. [5] Na ngwụsị afọ ndị 1950s, ya na Uche Okeke, Simon Okeke, Bruce Onobrakpeya na ụmụ akwụkwọ ole na ole na-amụ nka, guzobere Art Society. Nke a bụ n'oge ihe gbasara obodo Naijira na dị onye ọbụla ọku n'obi nke bụ oge a'na achọ nnweta nnwere onwe nke mba Naijiria na 1960. Mgbe ahụ a maara ndị Art Society dị ka ndị bụ njikọ nke akpọrọ Natural Synthesis na asụsụ bekee, okwu bụ Uche Okeke wepụtara maka ụkọwaa nchikota nke jikọta ọrụ nka otu ndị mba ofesị na usoro otu ndị Afrika si eche echiche ma na eme kwa ihe nka ha.

Pan-Africanism na ihe osise oge mbụ

[dezie | dezie ebe o si]

Na mgbe afọ1950 ruo afọ 1959, ka Naijiria na agba mbọ na agbasa kwa ozi maka ọchichi onwe, enwere echiche abụọ banyere otu a ga-esi nweta obodo ga kwunwuru onwe ya n'ezie. Otu echiche gbadoro ụkwụ na ime ka mpaghara Naijiria dịka ntọala nke obodo, ka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị jiri mpaghara ndị ahụ dịka ebe mgbado ụkwụ maka ọganiihu ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Echiche nke ọzọ nabatara ndụmọdụ sitere na aka Nigerian Youth Movement na mbido na ndị otu Zikist ka Naijiria negide anaya na ma were isiokwu nke Pan-Africanism ma hapụ ihe gbasara mpaghara dị ka ntọala nke ọdịnihu nke ọchịchị ala Naijiria. N’ọrụ nka ya, Nwoko gụzoro nke nta na atụmatụ nke abụọ. Na ihe osise ma ihe ọrụ ya nke osisi na oge mbido Nwoko gosiri na ọ lekwa siri anya na ihe ahụrụ na Nok . Enwere ike ịkọwa ọtutu ihe osise ya na eserese ya ma ihe akpụrụakpụ dị ka nke mgbakwunye . Ihe eserese ya nke terracotta bu nke meputara ma gosiputa uzo ihe omuma nke Nok na egosi ihe mgbe ochie na enweghi mgbanwe dị ka ihe ngosipụta Africa. Nke a mere ka enwe nghọta doro anya maka ọrụ ya ahụ ma gosipụta ụdị nghọtarụ nka ọgbara ọhụụ nke Africa.

Nhazi ụlọ

[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ na Zaria na Paris, ọ kwagara Ibadan na afọ 1963. N’Ibadan, ọ gbadoro anya na atụmatụ maka nhazi ihe ụlọ na ọnọdụ eji eme ihe nkiri maka ndi ngalaba ụlọ akwụkwọ Mahadum nke Ibadan na azụpụta ndị omee ihe nkiri. Mgbe ahụ ọ bụkwa onye nkuzi na mahadum ahụ. Mgbe ọ nọ n'obodo ochie, ahụ mgbe ụfọdụ ego na akọ ya n'akpa nke meere na na-ọnweghị ego iji wuo ma ọ bụ zụta ụlọ ebe obibi ma ọbụ ebe ngosi maka ọrụ ya. Ọ kpebiri iwu ụlọ ọrụ ya na usoro ọdịnala maka ụkọ ego. Ọ jiri ụrọ na aja ọchọtara ebe ahụ wee wuo ụlọ obibi na ụlọ ọrụ site na akụ ndị sitere n'okike. [6]

Ebumnuche ya n'iji usoro ọgbara ọhụụ na ọrụ nka ya ụfọdụ iji wee gosi ihe nke Afrika mere ka aha ya gbasaa na obodo na mba ahụ. Ọrụ Nwoko rụrụ mbụ maka ụkpụrụ ụlọ bụ ọrụ nke dị Dominican na Ibadan. Mgbe mba Naijiria nweere onwe ya, ụfọdụ nụdị ozi chọrọ iji ihe ndị Afrika chọọ ụlọ ha mma . E buru ụzọ bịario ya ka ọ rụpụta ihe e dere ede maka ụlọ ụka ọhụrụ mana ọ mechara rịọ ndị isi Dominican ka ha nye aka n’ichepụta ụlọ ụka ọhụrụ ga-adị na Ibadan. Agbanyeghi nkaa, na mbụ, ihe eserese ọmepụtara bụ ntakịrị ihe oji aka ya mee. Ma'na eserese ụlọ ahụ tinyere ebumnuche maka ine ndapụta di ice iche a'na ahụ na obodo ahụ dị ka nnukwu anwụ na-acha na Ibadan. Ọtụtụ mgbe, Nwoko na eme ihe eserese ya maka iwu ụlọ ka ime ụlọ ya dị iche na nke mpụga maka okpomọkụ na adị n'mpụga ọtụtụ oge. Nwoko mere ka otu osi ese eserese ụlọ ya na daba na mkpa anụ ahụ nke ụmụ amaala Afrika nagbanyighị ebe ha bi.

Nwoko mechara gaa n’ihu imepụta ihe owuwu ndị ọzọ dịka ụlọ ihe nkiri na Benin, nke ji atụmatụ ndị Greek na ndị Japanese nke akpọrọ Kabuki Design. Ọ mekwara mkpanaka maka okpueze nwanne ya nwoke dịka Obi nke Idumoje Ugboko. Ọrụ ndị ọzọ nke Nwoko a ma ama gụnyere ụlọ ọrụ ọdịbendị, Ibadan, nke jiri ụdị okike gosi mmekọrịta nka, ọdịdị na nka ochie ndị obodo Yoruba .

Ọrụ Nwoko na-agwakọta teknụzụ ọgbara ọhụụ n’ihe owuwu ụlọ, ọrụ iwu ebe a-na eme ihe nkiri ya na omenaala ndị Afrika. Site na oru dị ka nke Dominican Institute, Ibadan na nke Akenzua Cultural Center, Benin, Nwoko bu otu "onye na-ese ihe-ma'na-ewu-ụlọ" nke kwenyere n'ibụnị omenala Afrika na oru ya. N’afọ 2007, Farafina Books bipụtara The Architecture of Demas Nwoko, ọmụmụ gbasara ọrụ Nwoko na nchepụta nke ndị omenkà Britain abụọ, John Godwin OBE na Gillian Hopwood dere . N'ịtụleghachi akwụkwọ ahụ, Akwụkwọ African Publishing Record kwuru, sị:

Ọrụ nke Dominican bụ ọrụ ụlọ mbụ ya. Ọ jụrụ ndị Dominicans ma ọ nwere ike inyere ha aka n’ụlọ ọhụrụ ha. Ndị nna Dominican nwere ebumnuche ịwepụta ihe nke na egosi ọdịdị Afrika na ụlọ ọhụrụ ha na Ibadan. Uche Nwoko dabara ọfụma na ihe ha n'achọ.

Ihe ọmụmụ Nwoko na Zaria na Paris kwadebe ya nke oma maka atụmatụ ya nke bụ ijikota nka Afrika na echiche ogbara ohuru nke nka Europe. Ọ malitere ịwepụta ihe maka ebe a'na anọ eme mmemme ihe nkiri maka Mahadum nke Ibadan. Ọ bụ echiche ọhụrụ ya, nke meere ka ọ ọrụ ọ ọrụ ndị Dominicans nyere ya ihụọma n'ọrụ ya ndị ọzọ na Nigeria, gụnyere nke ebe a'na eme ihe nkiri nke Oba Akenzua dị na Benin City, Nigeria. Ejiri atụmatụ ndị Japan na nke Greek tinyere ya ihe nka nke Afrika na iwu ụlọ ahụ. Ọ rụ kwara ebe ọdịnala dị n’Ibadan na mkpanaka eze echichi nwanne ya nwoke. Nwanne ya bụ Obi nke Idumoje Ugboko.

Na mgbakwunye ọrụ ya eserese maka iwu ụlọ Nwoko nwere ọtụtụ ihe nrụzu na nka. Ọ na-ebipụta New Culture, akwụkwọ akụkọ nka nke na eduzi, ma'na-atụzi ụzọ maka ihe gbasara ihe ọhụụ na nka Afrika. Ọ kwara ụzọ ngosipụta ọgbara ọhụụ na nka Afrika, ihe nkiri,na eserese di iche iche. Na mgbakwunye, ọ bụ ezigbo onye omee na ịgba egwu na ihe nkiri. Ọ nweela ọtụtụ egwuregwu oso mee na Ibadan. Ọ bụkwa onye okachamara bu prọfesọ na Ibadan.

Godwin na Hopwood jisiri ike kọọ akụkụ niile nke ọrụ Nwoko ma'na ebe ha gbadoro anya nnukwu bụ na ọrụ ya nke eserese ụlọ. Nwoko so na ọgbọ ndị nka ahụ, ya na Chinua Achebe na Wole Soyinka, ndị gbara mgba maka nnwere onwe Naịjirịa site na nka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

Emepụtara akwụkwọ a n'ụzọ dị oke elu. Akwụkwọ ahụ nwekwa foto zuru oke. A na -atụ aro kaArchitecture nke Demas Nwoko bụrụ akwụkwọ maka mkpokọta ihe ọmụmụ niile maka eserese ụlọ na ihe gbasara nka na Africa.

Nhazi usoro

[dezie | dezie ebe o si]

Na otu ụzọ ihe ịga nke ọma maka ihe nkiri nke Amos Tutuola nke Palmwine Drinkard site na mbọ nke Nwoko gbara. Otu Nwoko si dozie ihe igba egwu, na nduzi ihe nkiri ahụ na ụzọ pụrụ iche mee ka isiokwu Tutuola dị na egwuregwu ahụ pụta ọfụma. Ọrụ ya na ihe gbasara ndozi ọnọdụ maka ebe a'na eme ihe nkiri, nke malitere na Ibadan gunyere Dance of the Forests nke Wole Soyinka 's s Dance, ọrụ Bertholt Brecht akpọrọ Der Kaukasische Kreidekreis ( The Caucasian Chalk Circle ) na mgbe Mbari Theater mepụtara ọrụ John Pepper Clark akpọrọ Masquerade. . [7]

Hụ kwa

[dezie | dezie ebe o si]
  • Ndepụta ndị na-ese ụkpụrụ ụlọ Naịjirịa

Mbipụta

[dezie | dezie ebe o si]
  • John Godwin na Gillian Hopwood: Ihe owuwu nke Demas Nwoko . Lagos, Farafina, 2007. 

Ntụrụaka

[dezie | dezie ebe o si]
  1. Dele Jegede, "Nwoko, Demas N.", Grove Art Online. Oxford University Press, accessed on 8 June 2007.
  2. "Makes a Case for Critical Design", This Day, Nigeria, 24 December 2001.
  3. Japhat Alakam, "Another Master Stroke: Demas Nwoko at Grillo’s Pavillion", Vanguard, 1 May 2011.
  4. Daniel Meyer-Dinkgräfe; Who's Who in Contemporary World Theater, Routledge, 2002, p. 222.
  5. Robert W. July, An African Voice: The Role of the Humanities in African Independence, Duke University Press. 1987, p. 51.
  6. July (1987), p. 239.
  7. Meyer-Dinkgräfe. Who's Who in Contemporary World Theatre (2002), p. 223.