Dzigbordi Dosoo

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Dzigbordi Dosoo
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịGhana Dezie
Ebe ọmụmụGhana Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaAkan language, Bekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ọchụ̀nta ego Dezie
ebe agụmakwụkwọVirginia State University, Harvard University, Accra Girls Senior High School Dezie
Ọrụ ama amashow Dezie

Dzigbordi Dosoo bụ nwanyị onye ọchụnta ego Ghana, ọkà okwu na onye ndụmọdụ nwere ihe ngosi okwu akpọrọ The Dzigbordi Show nke na-eme na mba iri anọ na isii na Africa, UK na Europe . [1] Ọ bụ onye na-emepụta ihe maka akpụkpọ ahụ na nlekọta anụ ahụ nke Africa na ngwaahịa nke a na-akpọ Kanshi. Ọ bụ onye tọrọ ntọala ma bụrụ kwa onye isi ụlọ ọrụ maka Allure Africa, akara ọ rụpụtara nke ọma na Ghana na mba ndị ọzọ. N'ihi ya, n'afọ 2009, Chartered Institute of Marketing kwadoro ya dị ka nwanyị ahịa nke afọ. Ọzọ kwa, na 1st May 2017 a kwanyere ya ugwu site na onyinye nturu ugo na Mgbakọ Kwa Afọ Repechage na New York . Ọ bụ otu n'ime mmadụ isii a ga-enye ihe nrite nke onye isi ala Repêchage n'afọ ahụ.

Ndụ mmalite na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Dosoo gụrụ akwụkwọ sekọndrị na Accra Girls Senior High School . Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ gawara United States. N'ebe ahụ, ọ gụrụ akwụkwọ na Virginia State University wee gụchaa ma nweta nzere bachelọ n'ihe gbasara ego na ndekọ ego. Ọ nwetala agụmakwụkwọ nchịkwa site na Harvard University . Ọ bụkwa onye ọkachamara onyonyo na ụkpụrụ omume.

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Na 1998 mgbe echiche nke spa adịghị adị nakwa mgbe enweghị mmasị ya n'obodo Ghana, Dosoo hụrụ ohere. Ya na mmadụ abụọ n'ọnụ ụlọ ya na Osu hiwere Allure Saloon nke togoro ugbu a wee bụrụzie Allure Africa. Tupu mgbe ahụ ọ rụrụ ọrụ na ego. O nwere ahụmịhe afọ iri na Banking Investment and International Trade Consulting. Ọ tọrọ ntọala Business Linkages International, ụlọọrụ na-enye ndụmọdụ gbasara ọrụ ego, nke gbanwere wee bụrụzie Eagle Group na 2004. O nwere aromatherapy na ụlọọrụ nlekọta ahụ a na-akpọ Kanshi nke pụtara na New York Times.

Ndụ onwe[dezie | dezie ebe o si]

Ọ bụ nwunye Lionel Van Lare Dosoo nwụgoro anwụ onye bụbu osote Gọvanọ nke Bank of Ghana . Ọ bụ nne nke otu nwa.

Ihe nrite[dezie | dezie ebe o si]

  • 2009 Nwanyị Na-ere ahịa nke afọ nke Chartered Institute of Marketing
  • 2017 onyinye nkwanye ugwu – Heart of Beauty and Innovation
  • A họpụtara ya maka 2019 Women's Choice Awards Africa, The Boss Lady of the Year Category

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. I begged people to revive my once collapsed business – Dzigbordi Dosoo (en). www.ghanaweb.com. Retrieved on 2019-09-27.