Edoheart

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Edoheart
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoEseohe Arhebamen Dezie
Aha ọmụmụEseohe Arhebamen Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1981 Dezie
Ebe ọmụmụZaria Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụomenkà Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Michigan College of Literature, Science, and the Arts Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Eseohe Arhebamen ma ọ bụ Eseohe Arhebamen-Yamasaki, nke a makwaara dị ka Edoheart (nke a mụrụ ka Obehioye Eseohe Ikhianose Oghomwenyenmwen Cleopatra Anne Arhebamen ), bụ onye na-ede abụ, onye na-agba egwu, onye na-agụ egwu, onye na-agụ egwú, onye na-arụpụta egwu, onye na-eme ihe nkiri n'ihu ọhaneze, na onye na-ese eserese. [1] [2] [3] [4] [5] [6] [7] A mụrụ Eseohe na Zaria,nke Naijiria [8] ma bụrụ onye ezinụlọ nke alaeze ukwu Benin . Nne nne Eseohe Arhebamen bụ Princess Theresa Maria Nodumwenben Osazuwa, adaeze ndị Edo . [9] [10] Nna nna ochie Eseohe Arhebamen bụ Osazuwa Eredia, nna adaeze bụ Theresa Osazuwa, bụbu Oba N'Ugu na Enogie nke Umoghumwun, nke mere Eseohe Arhebamen nwa eze na adaeze. "Ntọala alaeze Ugu, ya na isi obodo ya dị na Umoghumwun a bụrụla nke achọpụtara isi na Okparaeze Idu, bụ ọkpara Oba Eweka I. [11]

Mbido ndụ[dezie | dezie ebe o si]

Eseohe Arhebamen bụ nwa nke mbụ nke ụmụnne ise ma na-arụkarị ọrụ nne na nna na nzụlite ha. Mgbe ọ dị afọ asaa [12] ezinaụlọ Eseohe kwagara n'Amerịka were biri na Detroit,na Michigan . Mgbe ọ dị afọ 17 ọ debara aha na Mahadum Michigan na Residential College. Agbanyeghị na a gbara ya ume ịchụ mmụta medịsịn dị ka ụzọ ọrụ, Eseohe gbasoro agụụ ya maka uri, asụsụ na nka. Dị ka nwa akwụkwọ n'ogo bachelọ, Eseohe lekwasịrị anya n'ụzọ edemede na ime ihe nkiri n'ihu ọhaneze dị ka ụzọ isi metụta mgbanwe mmekọrịta mmadụ na ibe ya. [13] [14] Mgbe ọ nọ na Mahadum nke Michigan, Eseohe nwetara akara nrite dị ebube maka edemede ya [6] [15] ma sonye na ndị nrite University of Michigan Anthology of Hopwood Award. [16]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe ọ dị afọ iri na itoolu, Eseohe nwetara ọkwá dịka Writer-in-Residence nnke InsideOut Literary Arts Project na Detroit,dị na Michigan, ma soro ụmụaka rụkọọ ọrụ ụlọ akwụkwọ ime obodo dara ogbenye iji gbasaa nka agụmagụ ha. Mgbe ọ kwagachara New York n'afọ 2003, Eseohe guzobere ụlọ ọrụ EdoHeart edekwara dịka Edoheart nke ghọọrọ aha arụmọrụ ya. Eseohe Arhebamen na Edoheart bụ otu.

Eseohe natara nzere bachelọ nke nka na Mahadum nke Michigan na Creative Writing na Literature n'ọnwa Ọgọst,afọ 2005, were gaa nara nzere nke nka na Studio Art ya na maịnọ na asụsụ bekee na Hunter College. Ọ gụsịrị akwụkwọ na Mahadum nke New York nke nzere masta na Performance Studies, nke a kọwara dị ka ọ na-esite n'ọmụmụ pefọmịn aat, antropọlọji na soshịọlọji, echiche edemede, na agụmagụ maka iwu. Eseohe gụsikwara ị gba egwu Butoh na Yukio Waguri ike. [17]

Mpaghara ndị nyere mmasị na ọrụ nnwale Eseohe Arhebamen bụ ihe okike echepụtara maka gburugburu ọzọ, yana abụ na olu okwu dị ka isi mmalite maka mmegharị. [6] [18] Ọ gbaala ma kuzie ma obu duzie n'ọgbakọ ọmụmụ nke gunyere ebe ndi a o nwere mmasi na The Living Theater na Columbia University 's Teacher's College. [19] [20] Eseohe Arhebamen a pụtala na televishọn na akụkọ ndị Koria na Amerịka,ma n'akwụkwọ akụkọ Amerịka, Estonia na Latvia. [2] [3] [21] [22] [23] N’afọ 2011, onye na-ese ihe Kalup Linzy họpụtara ya ka ọ pụta n’otu ihe nkiri gbasara ndị omenkà na New York. [24] [25] Eseohe Arhebamen na-apụtakwa na teepu vidio a gụnyere n'akwụkwọ abụ Anne Waldman a ma ama nke University of Michigan Special Collections Library zụtara.

Ihe nkiri abụ Butoh[dezie | dezie ebe o si]

Eseohe Arhebamen bụ onye amaala na nwa afọ a mụrụ Afrịka nke mbụ na-eme ihe ngosi butoh n'ihu ọhaneze. [26] Na mgbakwunye, Eseohe Arhebamen bụ onye mbụ na-eme ihe nkiri n'ihu ọhaneze na-agbakọta egwu butoh na ịbụ abụ, ikwu okwu, mudra, asụsụ ogbi, okwu ọnụ, na nnwale olu mgbe ụdị egwu ọdịnala nke ndị Edo nke West Afrịka gachara. Ọ na-akpọ ụdị egwu a Ihe nkiri abụ Butoh. [27] Ụdị ihe nkiri abụ Butoh nke Eseohe Arhebamen na-esite na ọrụ ya na uri, egwu na ihe nkiri ọdịnala Edo nke ndị na-eme egwuregwu na-agba egwu ma na-abụ abụ n'otu oge, na nkwupụta nkwenye ya gosipụtara n'otu akụkọ asụsụ dị n'etiti ndị Edo nke Naijiria na ndị Japaan. . N'ụbọchị nke 26 n'ọnwa Septemba afọ 2010, Eseohe mere ihe nkiri na Yukio Waguri Intensive Workshop na-egosipụta ụdị ya nke ihe nkiri abụ Butoh nke ọ na-agba egwu butoh mgbe ọ na-abụ abụ Pure Imagination nke Willy Wonka & Chocolate Factory .

Kaarel Kressa kọwara ihe nkiri Eseohe mere nke ọma n'oge njem nke Fifth Diverse Universe dị ka nke gosipụtara ịdị mma na ịdị mma nke nwanyị; ji uri, ị gba egwu na abu ndi meriri obi ndi mmadu. [2] Akpọọla ọrụ Eseohe "powerful ritual". [28]

Alụmdi na nwunye[dezie | dezie ebe o si]

N’afọ 2006, Eseohe lụrụ obi ụtọ kemgbe ya bụ Seth Yamasaki, nwa Taro Yamasaki onye na-ese foto nwetara ihe nrite Pulitzer Prize, na nwa nwa nke Minoru Yamasaki, onye omenkà bụ onye Japaan nakwa Amerịka a ma ama maka i se World Trade Center . Ha abụọ bi na Brooklyn,na New York .

Akwụkwọ uri[dezie | dezie ebe o si]

  • 2010: Poems 1998-2009 (Lachị Mouse Press)
  • 2003: edinggha n'igwe ojii (Ornithology Press)

Egwu[dezie | dezie ebe o si]

  • 2019: Okada 8000 (Edoheart & Nick Hook)
  • 2019: 1H (Edoheart)
  • 2018: Raw Cash Remix (Edoheart)
  • 2018: Na Fiya Ft. Masterkraft (Edoheart)
  • 2017: Majokko Olokun (Edoheart)
  • 2013: Edoheart - Sosomoneycockplease EP (Akwaaba Music)
  • 2012: Get As E Be - EP (Edoheart)
  • 2010: Shchedryk Avant Remix (Clinical Archives)
  • 2010: Monsoon in Ibadan (Clinical Archives)
  • 2010: Wa Domo Edo (Edoheart)
  • 2009: The Hunger Artist (Eseohe)

Ihe nkiri na vidio[dezie | dezie ebe o si]

Antọlọjị na katalọgụ[dezie | dezie ebe o si]

  • 2009: Diverse Universe Festival 2005–2009, Academia Gustaviana Selts Mty
  • 2009: Low Lives, Jorge Rojas
  • 2009: Kunsti Aastaraamat, Parnu Linnavalitsuse kultuuriosakond (Cultural Department of Parnu City Government), Printon Printing House
  • 2009: 세계 실험 예술 의 메카, 홍대 앞 - 인터넷 서점 인터파크 도서
  • 2006: The Hopwood Awards: 75 Years of Prized Writing, University of Michigan Press
  • 2006: The New Spend Less Revolution, Harriman House

Ihe nrite[dezie | dezie ebe o si]

  • 2012: Tisch School of the Arts Department Sponsored Tuition Award, New York University
  • 2006: Poet of the Day, Poets Against the Wa
  • 2002: Environmental Justice Initiative First Place Award, University of Michigan [14]
  • 2002: College Unions Poetry Slam Invitational National Champion First Place, University of Michigan Team[29]
  • 2000: Writer-in-Residence, InsideOut Literary/Arts Project
  • 2000: Arthur Miller Award (Fiction) [15]
  • 2000: Jeffrey L. Weisberg Memorial Prize in Poetry
  • 2000: Hopwood Minor Poetry Award
  • 2000: Hopwood Underclassmen Fiction Award[30]
  • 1998: Residential College Fellowship, University of Michigan

Nrụtụka[dezie | dezie ebe o si]

  1. Exclusive Interview Inside "For The Love – EP" With Nigerian Born Artist Edoheart (24 February 2020).
  2. 2.0 2.1 2.2 Viies esituskunsti festival Diverse Universe meenutab maailma mitmekesisust (24 April 2009).
  3. 3.0 3.1 Pärnu kunstihallis kohtusid nüüdisaegne tants ja macho-metal (28 April 2009).
  4. Ikka teel (8 May 2009).
  5. 국내 최대 실험예술 축제 열린다 (3 September 2008).
  6. 6.0 6.1 6.2 Eseohe Arhebamen (4 April 2011).
  7. Huuuuuuge: Edoheart - Akwaaba Music (31 August 2010).
  8. "What's it like to live in Africa?", 4 June 2005.
  9. Eseohe Arhebamen (2009).
  10. "Nigeria: Help! Wicked People Have Sold Our Farmlands, Now We Have Nothing to Live On", 3 March 2007.
  11. Evolution of Benin Chieftaincy Titles. 
  12. Wong, Cyril (November 2005). Eseohe Arhebamen. Softblow. Retrieved on 5 April 2010.
  13. Brill, Marta. ""Night" march on Diag goes co-ed", The Michigan Daily, 7 April 2000. Retrieved on 5 April 2010.
  14. 14.0 14.1 The Environmental Justice Poetry Slam Ann Arbor, MI. Environmental Justice Initiative (21 November 2002). Retrieved on 5 April 2010.
  15. 15.0 15.1 Mendler, Janet Nellis (3 May 2000). Students share more than $120,000 in writing awards. Retrieved on 5 April 2010.
  16. Delbanco, Nicholas. The Hopwood Awards: 75 Years of Prized Writing. Retrieved on 5 April 2010. 
  17. Tisch Performance Studies Biography of Eseohe Arhebamen. New York University (7 August 2009). Archived from the original on 12 October 2013. Retrieved on 30 September 2013.
  18. Eseohe Arhebamen : Tisch School of the Arts at NYU (September 2011). Archived from the original on 12 October 2013. Retrieved on 5 October 2013.
  19. Namerow, Evan (7 August 2009). Butoh Workshop at The Living Theatre " Dancing Perfectly Free. Retrieved on 5 April 2010.
  20. Shieh, Eric (24 April 2009). Teachers College - Columbia University: Calendar. Retrieved on 5 April 2010.
  21. Daum tv팟 - 실험에술월드엑스포_Eseohe Arhebamen,김석환 홍대앞 퍼포머들 / 실험예술월드엑스포_Eseohe Arhebamen,김석환,더 벨리댄,들소리 4 - 동영상 (6 September 2008). Retrieved on 5 April 2010.
  22. Arhebamen, Eseohe. "Letters", Salon, 1 September 2005. Retrieved on 5 April 2010.
  23. NYC Media - NYC Life (January 2012). Archived from the original on 6 October 2013. Retrieved on 5 October 2013.
  24. "Kalup Linzy: And Then There Were Five....", Huffington Post, 8 March 2012. Retrieved on 5 October 2013.
  25. New NYC Art Reality Show Debuts TONIGHT, With Kalup Linzy. In the Air: Art News & Gossip (9 January 2012). Retrieved on 5 October 2013.
  26. Anna (30 April 2011). Nigeriansk Butoh. Swedish Palms. Archived from the original on 25 August 2011. Retrieved on 5 May 2011.
  27. Vocal Styles: An Interview with Performance Artist Edoheart. The Liberated Voice. Retrieved on 20 August 2016.
  28. Mitmekesises universumis on praegu matriarhaat. SIRP Eesti Kultuurileht Number 18 (3251) (8 May 2009). Retrieved on 5 April 2010.
  29. History of the College Unions Poetry Slam Invitational. acui.org. ACUI. Archived from the original on 11 December 2014. Retrieved on 10 December 2014.
  30. "Hopwood Underclassmen awards announced", University of Michigan News, 27 January 2000. Retrieved on 3 September 2016.

Njikọ dị na mpụga[dezie | dezie ebe o si]