Elizabeth Ogbaga

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Elizabeth Ogbaga
Mmádu
Akụkụ nkeHouse of Representatives of Nigeria Dezie
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereElizabeth Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ọka iwu, Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jionye otu ulo nnochite anya Naijiria Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịPeople's Democratic Party Dezie

Elizabeth Ogbaga bụ onye ọka ikpe Naijiria, nọọsụ na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị. A hoputara ya n’ime ulo ome iwu nke gọọmentị etiti Naijiria n’afo 2007 ka o nochite anya ndi Ebonyi na Ohaukwu . A hoputara ya n’okpuru otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndi People's Democratic Party (PDP).

Otu Kọmitii[dezie | dezie ebe o si]

Hon. Elizabeth Ogbaga bụ onye otu kọmitii ndị a:

  • Justice
  • Anti-Corruption, National Ethics and Value
  • Women Affairs
  • Population
  • Petroleum Resources (Upstream)
  • Health
  • Foreign affairs
  • Solid mineral development

Ulo Omeiwu[dezie | dezie ebe o si]

N’ọnwa Disemba, afọ 2009, Hon Elizabeth Ogbaga gosipụtara enweghị afọ ojuju ya n’ihe ọ kpọrọ ọkwa dị ala nke mmejuputa atumatu dị n’ime bọjeti afọ 2009. [1] Ọ na-akwado ọtụtụ iwu na atụmatụ ma na-akatọkarị adịghị ukwụu nke ụmụ nwanyị na ndọrọndọrọ ọchịchị na-ekwu na ọ metụtara ọchịchị onye kwuo uche ya [2]

Mpaghara[dezie | dezie ebe o si]

Hon. Elizabeth Ogbaga dọtara ọrụ dị iche iche dịka- Oxygen Plants na igwe Mammogram gaa Federal Medical Centre, Abakaliki, ọrụ nlekọta nwa na-enye ndị nne dị ime site na Ebonyi / Ohaukwu Federal Constituency n'efu, iwu ọtụtụ ụlọ klas atọ, olulu mmiri-mgbapụta na Onuenyim Ishieke, Ndiofia Nkaleke, Igweledoha, Ogbala Parish, Effenyim (Na-aga n’ihu), Oterufie Nkaleke, Ndiechi-Ndiugo Isophumini, Mbeke Isophumini, St. Michael Parish Mbeke Ishieke, Nwonuewo-Effium Ohaukwu, Ogen Ohaukwu na Umugadu Community Secondary School. O wuru National Health Care Centres na Izenyi Agbaja n'okpuru ọchịchị gọọmentị Izzi na Ohagelode (na-aga n'ihu) ma zụọ ihe karịrị ndị ntorobịa 50 na ICT yana inye ha kọmputa na akọrọngwa. [3] Hon. Elizabeth Ogbaga gara n'ihu wuo akwa mmiri gafere osimiri Ebonyi na Odomoke nụzọ Ogene-Abarigwe-Ogwudu-Ano-Unum n'okpuru gọọmentị Ohaukwu. O wuru ulo oru komputa n'ulo akwukwo nke obodo Isophumini Ishieke, weputa oche ulo akwukwo na Umugadu community Primary School (na-aga n'ihu) ma weta tebụl ụlọ akwụkwọ, tebụl na oche na Ogbaga Primary School, Ohagelode Primary School, Girls Secondary School Ndulo Ngbo na Mbeke Isophumini Primary School. . Na mgbakwunye, ọ wuru ụlọ ndị fada ụka katọlik nọ na St. Michael Parish Mbeke [4] were nye ụlọ mposi pụrụiche n’ụlọ akwụkwọ praịmarị Ohagelode, Ogbaga na Umugadu. O kwenyere na inye ndi ntorobia ike ma were kwado otutu okwu di iche-iche n'asọmpi egwuregwu bọọlụ na inye onyinye nke trofi, onyinye nke ego na nkesa jenaretọ, kilipa na akọrọngwa ha nye ndị ntorobịa a zụrụ azụ. [5] [6] [7]

Gọọmentị Ebonyi Steeti[dezie | dezie ebe o si]

Ka ọnwa Juun dị na mkpụrụ ụbọchị iri abụọ na atọ n’afọ 2015, Gọvanọ Dave Umahi nke steeti Ebonyi họpụtara ya dịka kọmishọna. [8] Ndị isi ụlọ ọgbakọ omeiwu nabatara ya ma duo ya n'iyi na ọ ga-abụ onye isi nke Mịnịstrị Azụmaahịa ba ụlọ ọrụ n'ụbọchị nke 1 n'ọnwa Julaị, afọ 2015. [9] [10]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

Njikọ dị na mpụga[dezie | dezie ebe o si]