Emenike Ejiogu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Emenike Ejiogu
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ebe ọmụmụLagos Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
Ọrụ ọ na-arụacademic Dezie
onye were ọrụMahadum nke Nigeria, Ritsumeikan University, Kusatsu, Institute of Electrical and Electronics Engineers, Council for the Regulation of Engineering in Nigeria Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Nigeria, Nagoya University, Shinshu University Dezie
Onye òtù nkeAnnals of the New York Academy of Sciences Dezie

Emenike Chinedozi Ejiogu bụ Onye Naijiria Prọfesọ nke Electrical and Electronics Engineering na Mahadum Naijiria Nsukka (UNN) . [1] O bụ onye guzobere ụlọ nyocha akpọrọ Laboratory of Industrial Electronics, Power Devices and New Energy System, ọ bụ Onye isi Mmụta (ya bụ 'Dean' n'olu bekee) na ngalaba nke ndi injinia ugbu a, wee bụrụkwa onye nduzi nke Africa Centre of Excellence For Sustainable Power and Energy Development nke ụlọ ọrụ ahụ. [2] [3] [4]

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Emenike na 6 Eprel 1966, na Lagos, Naigiria. O nwetara nzere bachelor na Masta ya na injinia na-afo 1987 na 1990, n'otu n'otu, na Mahadum Naịjirịa, Nsukka. N'afọ 1990, ọ nwetara nzere mmụta 'diplọma' n'Asụsụ Japanese na Mahadum Nagoya, Japan. [5]'afọ 1994, ọ nwetara nzere Ph.D. ya na Power Devices & Systems na Mahadum Shinshu, Nagano-city, Japan. [1] [6]

Ọrụ agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Emenike bidoro ọrụ agụmakwụkwọ ya dịka osote onye nkuzi nwa oge na ngalaba Electrical Engineering, University of Nigeria, Nsukka na 1980. Na 1994, ọ wee bụrụ onye nkuzi na ngalaba Electric & Electronic Engineering, Ritsumeikan University, BKC, Kusatsu -city na Japan. Ebugoro ya n'okwa ka ọ bụrụ osote prọfesọ na 1997, na 2001 ọ bụrụ onye ọrụ nyocha. Na 2009, ọ bụrụ prọfesọ nyocha na Mirai Denchi Laboratory, High Tech Research Center, Ritsumeikan University, Kustatsu-shi, Shiga-ken na Japan, eruzie na 2011, ọ bụrụ prọfesọ na ngalaba Electrical Engineering, University of Nigeria, Nsukka na Enugwu steeti. [1] [5]

Nhọpụta dika onye nchịkwa[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2001, Emenike bụ onye isi injinia nyocha na E-Tec Co. na Osaka. N'afọ 2005, ọ bụrụ onye nduzi nke Research, Energy & Environmental Technology na Osaka. N'afọ 2007, ọ bụrụ onye isi nchịkwa na MicroSilitron Laboratory, Biwako Campus, Faculty of Science & Engineering nke Mahadum Ritsumeikan, Kusatsu-city. N'afọ 2011, ọ bụrụ onye nduzi nke Laboratory of Industrial Electronics, Power Devices & New Energy Systems nke Ngalaba Injinịa Eletrik, na Mahadum Naịjirịa, Nsukka. [5]'agbata afọ 2013 na 2016 ọ bụ onye isi nke Ngalaba Electrical Engineering nke Mahadum Naịjirịa, Nsukka . [1]

Ntinye ya na sayensị[dezie | dezie ebe o si]

[7][4] Emenike lekọtara nyocha n'okpuru nduzi nke Laboratory of Industrial Electronics, Power Devices and New Energy Systems iji wuo ụlọ ọrụ na-atughari ihe ka ọ bụrụ ikụkụmmụọ maka iji ya na-emepụta ike eletrik na ngwa ndị ọzọ, ọ na-emepụta Ihe rụrụ 500KVA nke ọkụ eletrik.

Gọọmentị nke Republic [8] Korea nyere ndị ọkà mmụta sayensị atọ (Okoye Kenneth Ejike, Emenike Ejiogu, na Matsui Sanchio) ikike ikike na 2010 maka ihe ha mepụtara, nke na-enye cell batrị mmirimmụọ nke nwere ike belata na nha na ọnụahịa, yana usoro batrị mmirimmụọ, modul batrị mmirimmụọ ya na ihe banyere batri mmirimmụọ.

[9], Okoye Kenneth Ejike, Emenike Ejiogu, na Matsui Sanchio nwetara ikike ikike site na United States of America na 2013 maka ihe ha mepụtara nke na-enye otu mmirimmụọ cell, usoro mmirimmuo cell, modul mmirimmụọ


fuel cell nke nwere ike belata nha na ọnụahịa.

Ndị otu na mkpakọrịta[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 1996, Emenike bụ onye otu New York Academy of Sciences. A họpụtakwara ya dị ka onye otu Institute of Electrical and Electronics Engineers na 1992, onye otu Japan Institute of Electricle Engineers na 1994 na onye otu European Power Electronics Association. [10]'afọ 2011 ọ bụrụ onye injinia edebanyere aha ya na Council for Regulation of Engineering na Nigeria, Onye isi nke Nigeria in Diaspora Organization, na onye otu ụlọ ọrụ nke Nigerian Chamber of Commerce & Industry . [11]

Akwụkwọ ndị a họọrọ[dezie | dezie ebe o si]

  • Kawabata, Y., Ejiogu, E., & Kawabata, T. (1999). Vector-controlled double-inverter-fed wound-rotor induction motor suitable for high-power drives. IEEE Transactions on Industry Applications, 35(5), 1058–1066.[12]
  • Kojima, M., Hirabayashi, K., Kawabata, Y., Ejiogu, E.. C. & Kawabata, T. (2002, October). Novel vector control system using deadbeat controlled PWM inverter with output LC filter. In Conference Record of the 2002 IEEE Industry Applications Conference. 37th IAS Annual Meeting (Cat. No. 02CH37344) (Vol. 3, pp. 2102–2109). IEEE.[13]
  • Fukuda, M., Kobayashi, K., Hirono, Y., Miyagawa, M., Ishida, T., Ejiogu, E. C., ... & Takeuchi, M. (2011). Jungle honey enhances immune function and antitumor activity. Evidence-Based Complementary and Alternative Medicine, 2011.[14]
  • Kawabata, T., Ejiogu, E. C., Kawabata, Y., & Nishiyama, K. (1997, July). New open-winding configurations for high-power inverters. In ISIE'97 Proceeding of the IEEE International Symposium on Industrial Electronics (Vol. 2, pp. 457–462). IEEE.[15]
  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 Ejioku Emenike C.V.
  2. David (2023-05-27). Energy transition, an existential necessity for every nation - Prof Ejiogu (en). The Sun Nigeria. Retrieved on 2023-07-29.
  3. Engr. Prof. Ejiogu C. Emenike. ncci-japan.com. Archived from the original on 2023-07-29. Retrieved on 2023-07-29.
  4. 4.0 4.1 Nigeria (2021-03-31). UNN research team creates alternative power source (en-US). The Guardian Nigeria News - Nigeria and World News. Retrieved on 2023-07-29.
  5. 5.0 5.1 5.2 Prof. Emenike C. Ejiogu (en-US). Transforming Energy Access Learning Partnerships (TEA-LP).. Retrieved on 2023-07-29.
  6. Emenike C. Ejiogu Biography. ieeexplore.ieee.org. Retrieved on 2023-07-29.
  7. Ede (2021-03-28). To provide electricity in Nigeria is not about technology, but about political will – Prof Ejiogu (2) (en-US). Punch Newspapers. Retrieved on 2023-07-29.
  8. WIPO - Search International and National Patent Collections. patentscope.wipo.int. Retrieved on 2023-09-20.
  9. WIPO - Search International and National Patent Collections. patentscope.wipo.int. Retrieved on 2023-09-20.
  10. Ejioku Emenike Staff Profile. staffprofile.unn.edu.ng. Retrieved on 2023-07-29.
  11. Modular rice mills, boost to SMEs -NIDO boss. The Nation Online.
  12. Y (1999). "Vector-controlled double-inverter-fed wound-rotor induction motor suitable for high-power drives.". IEEE Transactions on Industry Applications 35 (5): 1058–1066. DOI:10.1109/28.793366. 
  13. Kojima (2002). "Novel vector control system using deadbeat controlled PWM inverter with output LC filter", Conference Record of the 2002 IEEE Industry Applications Conference. 37th IAS Annual Meeting (Cat. No.02CH37344), 2102–2109. DOI:10.1109/IAS.2002.1043821. ISBN 0-7803-7420-7. 
  14. Fukuda (2011). "Jungle honey enhances immune function and antitumor activity.". Evidence-Based Complementary and Alternative Medicine 2011. DOI:10.1093/ecam/nen086. PMID 19141489. 
  15. Kawabata (1997). "New open-winding configurations for high-power inverters", ISIE '97 Proceeding of the IEEE International Symposium on Industrial Electronics, 457–462. DOI:10.1109/ISIE.1997.648991. ISBN 0-7803-3936-3.