Femi Adebayo Salamiaudio(help·info) (amụrụ 31 Disemba 1978) bụ onye ọka iwu Naijiria, onye na-eme ihe nkiri, onye isi, onye na-emepụta ihe ma onye ndụmọdụ pụrụ iche nye Gọvanọ nke Kwara State na Nka, Omenala na Njem ileghari anya. [1] Ọ bụ nwa nwoke onye na-eme ihe nkiri, Adebayo Salami . [2]
A mụrụ Femi Adebayo na 31 nke Disemba 1978 na Lagos, ndịda ọdịda anyanwụ Nigeria. Nna ya, onye bụ onye na-eme ihe nkiri Naijiria bụ Adebayo Salami (Oga Bello), si Ilorin, Kwara State . [3]
Femi Adebayo gara ụlọ akwụkwọ C&S maka agụmakwụkwọ sekọndịrị ya. Ọ gara mahadum Ilorin, ebe ọ nwetara nzere bachelọ na iwu. O mechakwara nweta nzere masta na iwu na mahadum Ibadan . [4][5]
Femi Adebayo lụrụ Omotayo Adebayo na ubochi itoolu nke Ọktoba, 2016. Femi Adebayo na nwunye ya nwere otu nwa nwoke. Ọ mụtakwara ụmụ atọ n'alụmdi na nwunye mbụ. [6]
Adebayo malitere ime ihe nkiri n'afọ 1985, n'otu afọ ahụ ọ pụtara na ihe nkiri nna ya mbụ akpọrọ Ogun Ajaye . [7]
Adebayo emeela ihe nkiri n'ihe karịrị narị ise ihe nkiri Naijiria , wee nweta ihe nrite anọ dịka onye na-eme ihe nkiri kacha mma na 17th African Film Awards nke a maara dị ka Afro Hollywood award na Stratford Town Hall na London . [8] O nwetakwara ihe nrite n'otu ngalaba ahụ maka onyinye Best of Nollywood Broadcasting Organisation of Nigeria Awards na 2012. [9][10]
Adebayo nwere ọtụtụ ndepụta ihe nkiri na-egosi ekele ya, nke gụnyere Sonto Alapata, Wura Ati Fadaka, Ma Wobadan na Buga, na ndị ọzọ. Ọ bụ MD/CEO nke J-15 media network Nigeria. [3]