Funmi Olonisakin

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Funmi Olonisakin
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịObodoézè Nà Ofú, Naijiria Dezie
Aha enyereFunmi Dezie
aha ezinụlọ yaOlonisakin Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya8 Febụwarị 1965 Dezie
Ebe ọmụmụLondon Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụuniversity teacher Dezie
onye were ọrụKing's College London, University of Pretoria Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum Obafemi Awolowo, King's College London Dezie
IjePan-Africanism Dezie
Onye òtù nkeBlack Female Professors Forum Dezie
webụsaịtịhttp://funmiolonisakin.com/ Dezie

 

Funmi Olonisakin

Funmi Olonisakin (a mụrụ n'ụbọchị nke 8 n'ọnwa Febuwarị afọ 1965) bụ onye ọkammụta bụ onye Briten nakwa Naijiria, onye bụ Prọfesọ nke ọchịchị, udo na esemokwu na King's College London, na Prọfesọ nke dị egwu na Mahadum nke Pretoria . [1] Ọ bụ onye guzobere ma rụbuo ọrụ Daịrektọ nke African Leadership Center (ALC) a tọrọ ntọala ya na ụkpụrụ nke Pan-Africanism iji wuo ndị ndu nke agbụrụ na-esote, na ndị ọkà mmụta na kọntinentị nke Afrịka nwere ụkpụrụ mgbanwe. Olonisakin bụ Daịrektọ ihe omume nke nzere masta nke ọchịchị, udo na nchekwa. [2] Ọ bụ onye nyocha na-ahụ maka sayensị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Mahadum nke Pretoria, ọ bụbukwa ọkà mmụta dị iche nke Andrew Mellon Foundation na onye otu a ma ama nke Geneva Center for Security Policy (GCSP). Ọ bụ onye a họpụtara so na otu ndị ndụmọdụ ndị United Nations Security Council (UNSC). [3] nọ na nnyocha nke UN Peace-building Architecture. [4] [5]

Olonisakin ugbua bụ osote onye isi oche/onye isi ụlọakwụkwọ (Na mba ụwa) nke King's College nke Lọndọn. Ọ bụbu onye osote diin na mba ụwa, Ngalaba nke Sosha Sayensị na Amụma Ọha,nke King's College Lọndọn, ọ bụ nwanyị ojii mbụ ruru ogo prọfesọna nwanyị ojii izizi kuziri nkuzi n'ihu ọha na King's College nke Lọndọn. [6]

Mmụta[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ ya na Saụt Lọndọn n'ezinaụlọ ndị Naịjirịa, [7] 'Funmi (Oluwafunmilayo) Olonisakin [8] nwetara nzere bachelọ ya na Mahadum nke Obafemi Awolowo, dị na Ile-Ife, na Naijiria, n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị ( BSc ). Ọ gara n'ihu i nweta nzere masta n'agụmagụ agha, yana nzere dọktọreti n'agụmagụ agha na King's College London .

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

N'ime ọrụ nke gafegoro ọtụtụ iri afọ, Olonisakin gara n'ihu na-ewulite mkparịta ụka dị oke mkpa nke ndị isi na ndị mmụta Afrịka nwere ụkpụrụ dị iche iche nke na-akwalite pan-Africanism n'iguzosi ike n'ezi ihe, nkwanye ùgwù nye adimiche, ịchụso ịdị mma, na-etinye otu ndị ntorobịa nke Afrịka n'ihe a na-eme, na echiche onwe. [9] [10] Ọ na-akwado i mechi àkwà mmiri dị n'etiti agụmakwụkwọ, atumatu na omume . Site na African Leadership Centre (ALC), ị kekọrịta ihe ọmụma na ị nyefe karịsịa site na ọrụ nlekọta bụ otu n'ime ụzọ Olonisakin si arụ ọrụ na nsonye nke ọtụtụ ndị ọkachamara a ma ama na ngalaba iji soro ndị otu ALC. Olonisakin rituru nso nso a dị ka daịrektọ nke ALC mgbe ọ gara n'ihu ịkwado otu ahụ n'ụzọ dị iche iche. [2]

Ewezuga nkuzi, Olonisakin na-enye aka n'arụmarụ ụka udo na esemokwu nke n'Afrịka, bụ nke onwere ọtụtụ akwụkwọ o biputra na ya. Ọ bụ onye otu guzobere Network of Africa Security Sector Network (ASSN), were jee ozi dị ka onye nhazi mpaghara West Afrịka site n'afọ 2008 ruo afọ 2012. Ọ rụrụ ọrụ na World Economic Forum's Global Agenda Council on Fragile States site n'afọ 2008 ruo afọ 2010 na-enyocha ma na-atule etu ọchịchị mgbanwe nwere ike isi nwee mmetụta na-adịgide adịgide na gọọmentị na nwughari ma a lụchaa agha. [11]

Olonisakin bụbu onye ọrụ nke United Nations, site n'aka United Nations Special Representative of the Secretary-General on Children and Armed Conflict, ebe ọ nọ na-elekọta ngalaba nke Afrịka. N'oge ọrụ ya n'ọkwa a, "ọ gbara mbọ ka e guzobe National Commission for War Affected Children in Sierra Leone na Ngalaba Nchedo ụmụaka na Economic Community of West Africa States (ECOWAS). [4] O jeela ọtụtụ ọrụ ndị ọzọ na African Union na ECOWAS ọkachasị nke ụmụ nwanyị na-ewu udo, ọchịchị, ụmụaka nọ n'ebe ana-alụ agha. Ọ bụkwa daịrektọ nke Conflict, Security and Development Group na King's College Lọndọn site n'afọ 2003 ruo afọ 2013. [12] [13]

N'ịgawanye n'ihu iji mee akara na-agaghị echefu echefu n'ụwa a, Olonisakin na-enye ihe ọmụma ya ugbu a na African Peace and Security Architecture dị ka onye so n'òtù ndụmọdụ ndị ọkachamara maka nnyocha nke UN Peacebuilding Architecture. [4] Ọ nọ na Thabo Mbeki African Leadership Institute (TMALI) dịka onye otu ọgbakọ na-ahụ maka ndụmọdụ; Geneva Centre for Democratic Control of Armed Forces (DCAF) board; the Tana High Level Forum on Security in Africa na Boards of Trustees of International Alert na Centre for Humanitarian Dialogue.

Olonisakin bụ nwa nwanyị ojii mbụ rutere ogo prọfesọ na King's College,nke Lọndọn [14] ma kpọọ ya aha na Powerlist nke ndị Briten kachasị nwee mmetụta sitere n'Afrịka, gụnyere Top 10 nke ogụgụ afọ 2019. [15]

Echiche[dezie | dezie ebe o si]

Olonisakin na-akwado ụzọ ndụ na-aga n'ihu, na-akwado adịmiche ma na-agbanwe agbanwe. Ọ na-eme nke ọma na nnyocha dabere na ihe akaebe ma na-akwalite onye ndu mgbanwe . [16]

Akwụkwọ ndị ahọpụtara[dezie | dezie ebe o si]

Akwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

  • Militancy and Violence in West Africa: Religion, Politics and Radicalization, ed.James Gow, Funmi Olonisakin & Ernst Dijxhoorn. London: Routledge, 2013. ISBN 9780415821377
  • Women and Security Governance in Africa, ed. Funmi Olonisakin & Awino Okech . Oxford: Pambazuka Press, 2011. ISBN 9781906387891
  • Women, Peace and Security: Translating Policy into Practice, ed. Funmi Olonisakin, Karen Barnes & Eka Ikpe. London: Routledge, 2011. ISBN 9780415587976
  • Security Sector Transformation in Africa, ed. Alan Bryden & Funmi Olonisakin. Munster: Lit Verlag, 2010. ISBN 9783643800718
  • The Challenges of Security Sector Governance in West Africa, ed. Alan Bryden, Boubacar Ndiaye & Funmi Olonisakin. Munster: Lit Verlag, 2008. ISBN 9783037350218
  • Peacekeeping in Sierra Leone: The Story of UNAMSIL. Boulder and London: Lynne Reinner, 2008. ISBN 9781588265203
  • Global Development and Human Security, ed. Robert Picciotto, Funmi Olonisakin & Michael ClarkeNew Brunswick and London: Transaction Publishers, 2007. ISBN 9781412811484
  • A Handbook of Security Sector Governance in Afric], ed. Nicole Ball & Kayode Fayemi. London: Centre for Democracy and Development, 2004.
  • Reinventing Peacekeeping in Africa: Conceptual and Legal Issues in the ECOMOG Operations. The Hague: Kluwer Law International, 2000. ISBN 9789041113214
  • Engaging Sierra Leone. London: Centre for Democracy and Development, 2000. ISBN 9781902296081
  • Peacekeepers, Politicians and Warlords, by Abiodun Alao, Funmi Olonisakin & John Mackinlay Tokyo: United Nations University Press, 1999. ISBN 9789280810318

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. Professor 'Funmi Olonisakin (en-GB).
  2. 2.0 2.1 "Adjunct Faculty", African Leadership Centre. Retrieved 23 June 2016.
  3. "From the Director: ALC founder Professor Funmi Olonisakin appointed to the advisory group of experts for the Review of the UN Peacebuilding Architecture", African Leadership Centre, 2015. Retrieved 5 March 2015.
  4. 4.0 4.1 4.2 "Secretary-General Nominates Advisory Group of Experts on Review of Peacebuilding Architecture", United Nations | Meetings Coverage and Press Releases, 22 January 2015. Retrieved 10 August 2015.
  5. "Dr. ‘Funmi Olonisakin appointed to United Nations Advisory Group of Experts", Carnegie Corporation, 30 January 2015. Retrieved 24 June 2016.
  6. Desmond Davis, "First black woman professor at King's College delivers inaugural lecture", Ghana News Agency, 20 July 2018. Retrieved 22 July 2018.
  7. First Black Woman professor at King's College delivers inaugural lesson, Ghana News Agency, June 20, 2018
  8. "‘Funmi (Oluwafunmilayo) Olonisakin", African Feminist Forum. Retrieved 24 June 2016.
  9. Dr 'Funmi Olonisakin, Geneva Centre for Security Policy. Retrieved 24 June 2016.
  10. "Grantee Highlight: The African Leadership Centre, Nairobi", African Development Women Fund, 28 June 2013. Retrieved 24 June 2016.
  11. Funmi Olonisakin, Sustainable Development Solution Network. Retrieved 21 June 2016.
  12. UK Parliamentary Discussion on Youth and Radicalisation, The Current Analyst. Retrieved 24 June 2016.
  13. Women and Security Governance in Africa Fahamu Books & Pambazuka Press. Retrieved 24 June 2016.
  14. Monsur Olowoopeji, "Nigerian breaks 187-yr-old record at University of London", Vanguard, 27 April 2016. Retrieved 24 June 2016.
  15. Duchess of Sussex in Powerlist of top 100 black people in Britain (23 October 2018). Retrieved on 17 April 2020.
  16. "JSO Interview, Funmi Olonisakin, 21st June Part 1" (YouTube video), Radio African Group, 24 June 2013. Retrieved 19 September 2015.

Njikọ dị na mpụga[dezie | dezie ebe o si]