Gloria Kemasuode

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Gloria Kemasuode
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoGloria Kemasuode Dezie
Aha enyereGloria Dezie
aha gọọmentiGloria Kemasuode Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya30 Disemba 1979 Dezie
Ebe ọmụmụȮra Delta Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụsprinter, asọmpi egwuregwu Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
ụdị egwuregwuegwuregwu Dezie
ịdọ aka ná ntị egwuregwu asọmpi100 metres Dezie
so na2008 Summer Olympics, 2004 Summer Olympics Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Gloria Kemasuode Ubiebor (a mụrụ n'ụbọchị nke 30 n'ọnwa Disemba nke afọ 1979 na Delta Steeti ) bụ nwaada Naijiria na-eme egwuregwu ị gba ọsọ, na-anọchite anya Naịjirịa na asọmpi mba ofesi. [1]

Kemasuode nọchitere anya Naịjirịa na 2008 Summer Olympics na Beijing, n'ọsọ nke mita 4 x 100 ya na Agnes Osazuwa, Oludamola Osayomi na Ene Franca Idoko . Na agba nke mbụ, ha gbatara ọkwa nke anọ n'azụ Beljiọm, Briten na Brazil . Oge ha nke sekọnsụ 43.43 bụ oge kachasị mma na-erughị eru, na oge nke isii n'ozuzu nke mba iri na isii sonyere. Site na rịzọọtụ a, ha tozuru oke ruo agba nke ikpeazụ, nke ha ji Halimat Ismaila dochie Osazuwa. Ha gbara ọsọ ruo oge nke sekọnsụ 43.04, ọkwa nke atọ na ọla nchara n'azụ Rọshia na Beljiọm. [1] N’afọ 2016, ndị otu Rọshịa ka a chụpụrụ ma napụ ha ihe nrite ọla edo ha n’ihi ịda iwu ọgwụ ike nke otu n’ime ndị Rọshia na-agba ọsọ, Yuliya Chermoshanskaya, nke si otú ahụ kwalite Naịjirịa n’ọnọdụ ọla ọcha. [2]

Kemasuode dara ule ọgwụ na Circuito de Corridas e Caminhada na Brazil, a machibidoro ya asọmpi ruo afọ abụọ n'ime oge ụbọchị nke 24 n'ọnwa Julaị nke afọ 2009 ruo ụbọchị nke 23 n'ọnwa Julaị nke afọ 2011.

Mmezu[dezie | dezie ebe o si]

Representing Àtụ:NGR
2004 Olympic Games Athens, Greece 7th 4 × 100 m relay 43.42
2005 World Championships Helsinki, Finland 7th 4 × 100 m relay 43.25
2006 African Championships Bambous, Mauritius 7th 100 m 12.14
2nd 4 × 100 m relay 44.52
2007 All-Africa Games Algiers, Algeria 6th 100 m 11.53
2008 African Championships Addis Ababa, Ethiopia 5th 100 m 11.47
1st 4 × 100 m relay 43.79
Olympic Games Beijing, China 2nd 4 × 100 m relay 43.04

Ihe kacha mma[dezie | dezie ebe o si]

  • 60 mita - 7.48 s (2005)
  • 100 mita - 11.21 s (2002)
  • 200 mita - 23.26 s (2006)

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

Njikọ dị na mpụga[dezie | dezie ebe o si]

  • Gloria Kemasuode at World Athletics