Ifeanyi Chudy Momah

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ifeanyi Chudy Momah
Hon.

Ifeanyi Chudy Momah

MHR
Born (1983-04-30) 30 Eprelụ 1983 (age 40)
Ihiala, Anambra State, Nigeria
EducationL.L.B(HONS). B.L
Alma materUniversity of Lagos
OccupationLawyer
EmployerFederal Republic of Nigeria
OrganizationHouse of Representatives
TitleMember Representing Ihiala Federal Constituency
PredecessorChukwuemeka Anohu
Political partyPeoples Democratic Party
Ifeanyi Chudy Momah
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya30 Eprel 1983 Dezie
Ebe ọmụmụIhiala Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ọka iwu Dezie
Ọkwá o jionye otu ulo nnochite anya Naijiria Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Lagos Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịAll Progressives Grand Alliance Dezie
webụsaịtịhttps://www.ifeanyimomah.org Dezie

Ifeanyi Chudy Momah bụ onye ọka iwu na ọchụnta ego Naijiria nke keere ozi ugbu a n'Ụlọ Ndị Nnọchiteanya ma na-nọchite anya mpaghara gọọmenti etiti Ihiala, Anambara Steeti.[1] Ọ bụ onye isi oche nke Kọmitii Ụlọ na Ụlọikpe isi obodo gọọmenti etiti ma bụrụkwa onye otu Peoples Democratic Party.[2][3][4][5]

Oge ọ malitere[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ ya na General Hospital Okija n'ezinụlọ Chief Mike Momah. Ifeanyi ekwuola na n'etiti ụmụnne ya ọ bụ naanị ya ka a mụrụ ebe ahụ. Dị ka o si kwuo, Nna ya Chief Mike Momah pụru njem n'obodo ahụ mgbe nne ya kpebiri ibia obia n'Ihiala, obodo nna ya mgbe ọ malitere ịmụ nwa na mberede ma mesịa muọ ya ebe ahụ.

Ifeanyi nwere ndụ ya n'oge ọ bụ nwata na Festac Town, Lagos State, Na-aga Radius Nursery and Primary School, emesia, o gara Loral International School ka dị na Festac tupu omesịa gụchaa agụmakwụkwọ sekọndrị ya na Chrisland College otu n'ime ụlọ akwụkwọ kachasị ọnụ ahịa na Naijiria.[6][7]

Ọmụmu[dezie | dezie ebe o si]

  Ifeanyi gụrụ akwụkwọ iwu na Mahadum Lagos, mgbe ọ gụchara ya e zigara ka o jee ozi n'ụlọ ọrụ National Youth Service Corps ebe a zigaharịrị ya Katsina, steeti dị n'akụkụ ugwu nke Naịjirịa ma nọrọ afọ ije ozi ahụ na Malumfashi obere obodo dị nso na Daura.[8]

Mgbe afọ ije ozi gasịrị, ọ gara Mahadum Aberdeen , Scotland, ebe o mere usoro mmụta gbasara iwu na Iwu ikike ikpe mba ụwa.

O mechara laghachi Naịjirịa wee gaa ụlọ akwụkwọ iwu nke Naijiria na Bwari, Abuja ebe a kpọrọ ya ka ọ bịa n'ụlọikpe.[9]

Ahụmahụ ọkachamara[dezie | dezie ebe o si]

Ọ rụrụ ọrụ iwu na Rickey Tarfa & Co Chembas afọ atọ ma emesịa, ọ gara Arthur Obi-Okafor (SAN) & Co Chembas na Asaba

N'afọ 2013, a kpọrọ ya ka ọ rụọ ọrụ na mmemme enyemaka (Sure-P) dị ka onye inyeaka ntụzi ihe gbasara iwu na osote odeakwụkwọ nke SURE-P Nze Akachukwu Nwankpo. Site na nke a, o nwere ike inyere ndị mmadụ aka karịsịa ụmụ okorobịa ọchịchị ime obodo Ihiala ka ha nweta mgbazinye ego gọọmentị etiti nyere yana ohere ọrụ mmemme ahụ gosipụtara.[10]

ndọrọ ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

Kemgbe ahụ, ọ chụbarụ ọrụ na ndọrọndọrọ ọchịchị iji ọzọọ maka Ụlọ Nzukọ nke ntuli aka steeti n'afọ 2011 nke ọ na-zọtaghi. O zokwara ọzọ n'afọ 2015 n'oge a maka Ụlọ ndị nnọchiteanya mana ọ meriyi ọzọ, emerighi nke o tara uta nye ntuli aka mmegide na ime ihe ike.

Ọ gara n'ihu na-ejere Gọvanọ Willie Obiano ozi dị ka Onye ndụmọdụ pụrụ iche kachasị elu ebe ọgbasara ndọrọndọrọ ọchịchị tupu ọ banye ọzọ na ntuli aka nke afọ 2019 ebe o meriri.[11]

Dị ka onye a họpụtara na Ụlọ ndị nnọchiteanya gọọmenti etiti, pati ndọrọndọrọ ọchịchị ya bu APGA nwere ihe dị ka ndị otu Iri n'ime mmadụ nari ato na iri isii ahụ mere ha obere mana nke a egbochighị ime ka anụ olu ya ma nwee mmetụta zuru oke n'ụlọ. O gosipụtara nkwado niile maka ọkà okwu ugbe ahu Femi Gbajabiamila mgbe ntuli aka maka oche ọkà okwu ọnụ.

O kwuru banyere mkpa ọ dị igbochi ndị ohi na Zamfara, steeti ugwu nke Naịjirịa.

Ọ naghị akwado iwu mgbasa ozi mmekọrịta na-ese okwu ma kwuo na ndị ntorobịa ga-eji usoro netwọkụ ọha mmadụ mee ihe n'ụzọ ziri ezi, gbakwunye na e nwere ụkpụrụ dị adịlarị ma ọ bụ naanị ịkpata mmeghachi omume nke Iwu.[12][13] Ọ rịọkwara ka e mee nchọpụta nke ego nde dọla nari atọ iri iteghete na isii.iri na atọ a na-emefu n'ụlọ nrụpụta atọ dị iche iche n'ime afọ anọ ebe ụlọ ọrụ ahụ ka na-arụsi ike n'okpuru pasent isii nke ikike ha.[14][15][16][17]

Ebemside[dezie | dezie ebe o si]

  1. National Assembly | Federal Republic of Nigeria. www.nassnig.org. Retrieved on 2019-11-18.
  2. admin (2019-07-26). Chairmen and Deputies of Standing and Special Committees in the 9th House of Representatives (en-US). PLAC. Retrieved on 2019-11-18.
  3. National Assembly | Federal Republic of Nigeria. www.nassnig.org. Retrieved on 2019-11-18.
  4. FULL LIST: Chairmen, vice-chairmen of Reps standing committees, special panels (en-US). Punch Newspapers. Retrieved on 2019-11-18.
  5. Ifeanyi Chudy Momah: The coming of the change-maker (en-US). The Nation Newspaper (2021-02-10). Retrieved on 2022-02-21.
  6. reports (2019-07-28). Speakership: ‘I gave Gbajabiamila huge support’ (en-US). Newtelegraph. Archived from the original on 2019-07-30. Retrieved on 2019-11-25.
  7. Ezebuiro (2015-05-08). Top 23 Most Expensive Secondary Schools in Nigeria With Mind Blowing Fees! (en-US). BuzzNigeria - Famous People, Celebrity Bios, Updates and Trendy News. Retrieved on 2019-11-25.
  8. Hon. Ifeanyi Chudy Momah (en-US). Chrisland Schools. Archived from the original on 2023-05-18. Retrieved on 2022-05-24.
  9. Ifeanyi Chudy Momah: The coming of the change-maker (en-US). The Nation Newspaper (2021-02-10). Retrieved on 2022-03-04.
  10. Hon. Ifeanyi Chudy Momah (en-US). Chrisland Schools. Archived from the original on 2023-05-18. Retrieved on 2022-06-21.
  11. APGA wins four Reps polls (en-GB) (2019-02-25). Retrieved on 2019-11-18.
  12. Nigerians Should Say No to Social Media Bill (en). Human Rights Watch (2019-11-26). Retrieved on 2019-12-09.
  13. Lawmaker advises Nigerian youths on positive use of social media (en-US). The Nation Newspaper (2019-11-24). Retrieved on 2019-12-09.
  14. House of Representatives launches probe into $396.33 million spent in fixing refineries between 2015 to 2019 (en-US). The ICIR (2019-11-22). Retrieved on 2019-12-09.
  15. Why We Want 396.33 Million Dollars Spent on 3 Refineries in 4 Years Investigated – Hon. Ifeanyi Momah (en-US). THE LEGISLATURE (2019-11-23). Retrieved on 2019-12-09.
  16. StackPath. leadership.ng. Retrieved on 2019-12-09.
  17. Reps probe $396m refinery maintenance expenses (en-US). Punch Newspapers. Retrieved on 2019-12-09.