Ifeanyi Okowa

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ifeanyi Arthur Okowa
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoIfeanyi Arthur Okowa Dezie
Aha ọmụmụIfeanyi Arthur Okowa Dezie
Aha enyereArthur Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya8 Julaị 1959 Dezie
Ebe ọmụmụȮra Delta Dezie
Asụsụ obodoAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa Dezie
Asụsụ ọ na-edeBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jionye otu ndi omeiwu nigeria, Governor of Delta State Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Ibadan, Edo College Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịPeople's Democratic Party Dezie
agbụrụNdị Igbo Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
nnọchiaha nkeonweL485 Dezie
Arthur Okowa (amụrụ ya n'abali asatọ nke ọnwa Julai afọ 1959) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ala Naijiria Ọ bụ Gọvanọ nke Steeti Delta. E duruya n'iyi ọrụ dika gọvanọ n'abali iri abụọ na itolu nke ọnwa Mee afọ 2015 ka o merisịrị na ntuli aka nke steeti emere n'ọnwa Eprel afọ 2015. Tupu ọkwa gọvanọ ya, a hoputara ya onye nnọchite anya maka Delta North Senatorial District na Steeti Delta, Naijiria, na nhoputa ndi ochichi nke emere n'ọnwa Eprel 2011. Ọ doro ọkwa ọchichia site na otu ndị People's Democratic Party (PDP). Ọ bụ onye Ika si Owa-Alero na Steeti Delta, Naijiria. Ọ bụkwa onye mbụ si Anioma rutere ọkwa gọvanọ nke Steeti Delta . A hoputakwara ya ọzọ dika onye ochichi nke Delta State n'abali iri abụọ na itolu nke ọnwa Mee, afọ 2019.
Ifeanyi Okowa

Ndabere[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Okowa na Owa-Alero na Ika North-East Local Government Area nke Steeti Delta. Ọ gara Edo College, nke dị na Benin City (n'agbata afọ 1970–1976), wee gawa Mahadum nke Ibadan ebe ọ gụrụ maka inye ọgwụ na ịwa ahụ, Ọ gụsịrị akwụkwọ na afọ 1981 na ogo MBBS. Mgbe ọ hapụsịrị National Corps Service Corps, ọ rụrụ ọrụ na Ụlọ ọrụ na elekọta njikwa nke ụlọ ọgwụ ndị dị na Steeti Bendel dị ka onye ọrụ ahụike. Ọ banyere ọrụ onwe onye dị ka Director, na Victory Medical Center, Igbanke na afọ 1986. [1]

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

Okowa ghọrọ onye ode akwụkwọ nke mpaghara Gọọmentị Ika ma mechaa bụrụ onye isi oche nke Ika North-East Local Government Council (na agbata afọ 1991–1993). Ọ bụ onye nhakọta Delta North nke Grassroots Democratic Movement (GDM). Ọ banyere PDP na afọ 1998, ma nye aka na mkpọsa Gọvanọ James Ibori na afọ 1998/1999. Ọ rụrụ ọrụ dị ka Onye Kọmishọna na gọọmentị Steeti Delta maka Ọrụ Ugbo na Ihe ana enweta n'ala (site n'ọnwa Julai afọ 1999 - rue ọnwa Eprel afọ 2001), nke mmepe ihe gbasara mmiri  (n'ọnwa Eprel afọ 2001 - rue ọnwa May afọ 2003) na nke ahu ike (n'ọnwa Septemba afọ 2003 rue ọnwa Oktoba afọ 2006). [2]

Okowa gbara arụkwaghịm ịzọ ọkwa ntuli aka nke ọkwa Onye nnochite anya otu pati PDP na ọkwa ọchichi gọvanọ Delta Steeti nke afọ 2007, mana o riteghị ọkwa Onye nnochite anya otu ahu maka gọvanọ na ntuli aka emere. [3] N’ọnwa Juunu afọ 2007, a họpụtara Ifeanyi ka ọ bụrụ Ode akwụkwọ nke Gọọmentị Steeti Delta. [4]

A họpụtara Ifeanyi ka ọ bụrụ onye ndoro ndoro na anọchite anya mpaghara ọdida anyanwu nke Delta na ụlọ nzukọ Senate na ntuli aka nke otu pati PDP emere n'ọnwa Jenụwarị afọ 2011, ọ nwetere vootu nari itolu iri anọ na abụọ, mana a gbara mmeri  a ụkwụ site n'aka ndị isi pati ndị chọro Marian Amaka Alli dịka onye ndoro ndoro ga anochite anya ha. [5] A họputara ya ọzọ na ntuli aka emeghariri ebe o nwetara vootu otu puku nari anọ iri anọ na isii, megide vootu otu nari na asatọ aturu maka Dọkịnta Marian Alli. [6] Na ntuli aka nke ọnwa Eprel afọ 2011 maka oche onye nnọchite anya mpaghara ọdida anyanwu Delta na ụlọ nzụkọ Senate, Ifeanyi nwetara vootu puku iri itolu na asatọ otu nari na iri anọ, karịa onye nke abụọ bụ, Prince Ned Munir Nwoko nke Democratic People's Party, onye nke nwetara vootu puku iri isii na asaa nari itolu na iri asatọ na ise. [7] E kwuru na esemokwu ka dị banyere ntuli aka ahụ emere na ọnwa Jenụwarị afọ 2013. [8] N'ikpeazụ, Ifeanyi nwetara akara ntuli aka maka ọkwa gọvanọ na afọ 2015 n'okpuru pati PDP ọ nwetere vootu Nari anọ na isii  n'abali asatọ nke ọnwa Disemba afọ 2014. [9] O meriri ntuli aka nke oche ọchichi govanọ Steeti Delta  na afọ 2015 n'ọnwa Eprel afọ 2015 site na i nweta vootu dị nari puku  asaa iri abụọ na anọ na nari isii na iri asatọ. [10] E duru ya n'iyi ọrụ dika Gọvanọ n'abali iri abụọ na itolu nke ọnwa Mee afọ 2015 kemgbe ahụ ọ malitela ọrụ dị egwu. Na nhoputa ndi ochichi govanọ nke emere n'abali itolu nke ọnwa March, afọ 2019, Okowa, onye bụ onye otu ndi Peoples Democratic Party, nwetara vootu Nari puku itolu iri abụọ na ise na nari abụọ iri asaa na anọ iji merie onye ya na ya doro, bụ onye ndoro ndoro ochichi All-Progressive Congress, Great Ogboru, onye nwetara vootu Nari puku abụọ iri na ise na nari itolu iri atọ na asatọ. [11]

N'ụbọchị 16 nke ọnwa Juun, 2022 bụ Atiku Abubakar bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala nke Peoples Democratic Party ka ọ bụrụ onye ga-eso ya na ntuliaka 2023.[12]

Enọ na Nkwanye ugwu[dezie | dezie ebe o si]

  1. A kwanyere ya ugwu dịka Nwoke bụ ọkacha ibe nke afọ 2017 site na akwụkwọ akụkọ Independent na Eko Hotel na Suites dị na Lagos. Ọ bụ Alhaji Ismalis Isa Funtu nyere onyinye a. [13]
  2. N’afọ 2017, ọ nwetara akara ugo mmụta kacha elu nke Mahadum nke Ibadan, Ibadan-Nigeria dịka Ọkacha ibe na ndị gụrụ akwụkwọ na mahadum ahụ nke afọ 2016, bụ ebe o mere nke ọma n’inye nkuzi nke akpọrọ “Good Governance for Wealth Creation and Sustainable Development: Ahụmịhe na Ihe Mmụta” na mbipụta nke afọ 2017 nke nkuzi ihe ndị gara akwụkwọ na Mahadum nke Ibadan haziri (UIAA) [14]

Hụ kwa[dezie | dezie ebe o si]

  • People's Democratic Party Steeti Delta
  • Aha ndi gọvanọ steeti Delta

Ntughari[dezie | dezie ebe o si]

  1. Delta State Government (en-US). Retrieved on 2021-06-02.
  2. Delta State Government (en-US). Retrieved on 2021-06-02.
  3. Delta State Government (en-US). Retrieved on 2021-06-02.
  4. REMARKS BY GOV. UDUAGHAN AS OKOWA BECOMES NEW SSG.. Office of the governor, Delta State (4 June 2007). Archived from the original on 3 November 2011. Retrieved on 4 May 2011.
  5. HOW OKOWA EMERGED DELTA NORTH SENATORIAL CANDIDATE. Daily Sun (8 February 2011). Retrieved on 4 May 2011.
  6. Arthur Okowa Wins Delta North Senatorial Primaries Again. HuHu Online. Retrieved on 4 May 2011.
  7. Collated Senate results. INEC. Archived from the original on 19 April 2011. Retrieved on 4 May 2011.
  8. "Okowa, Azekwoh Renew Battle for Senate Seat", This Day, 22 January 2013. Retrieved on 25 April 2013.
  9. Ifeanyi Okowa wins Delta PDP guber ticket. Vanguard. Retrieved on 8 December 2014.
  10. Ifeanyi Okowa wins Delta Gubernatorial Election. Channels TV. Retrieved on 13 April 2015.
  11. https://punchng.com/delta-gov-okowa-thanks-ibori-for-supporting-his-re-election/
  12. https://www.premiumtimesng.com/news/headlines/537437-profile-of-ifeanyichukwu-arthur-okowa-pdp-vice-presidential-candidate.html
  13. m.thenigerianvoice.com/news/263982/garlands-for-governor-okowa.html
  14. http://www.vanguardngr.com/2017/9/okowa-bags-alumni-award-delivery-democratic-dividends.