Iga Idunganran

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Iga Iduganran, Lagos Island

Iga Idunganran bụ ebe obibi nke Oba nke Lagos, nke dị na Lagos Island.[1][2][3] Ọ bụkwa ihe na-adọrọ mmasị ndị njem nleharianya.

Akụkọ ihe mere eme[dezie | dezie ebe o si]

Malite na narị afọ nke iri na ise, ailandi Lagos bụ nke onye mbụ bi n'àgwàetiti ahụ bụ Chief Aromire nwe, onye bụ onye isi Ile-Ife, onye jiri ya mee ihe dị ka ebe ịkụ azụ na ugbo ose.[4] E wuru obí eze oge ochie ahụ na afọ 1670 maka Oba Gabaro (1669-1760).[5] Ndị Portuguese mechara rụzigharịa ya, na ihe ndị e ji mezie ya, ọkachasị tiles nke esibPortugal weta.[6]

Ọ bụ Praịm Minista Naịjirịa, Sir Abubakar Tafawa Balewa, rụchara akụkụ nke oge a ma nyefe ya ịba ọrụ na ọnwa mbụ nke Ọktoba afọ 1960.[7] N'oge na-adịbeghị anya, eze Adeniji Adele nke abụọ na Adeyinka Oyekan nke abụọ mepụtara ya, ọ gara n'ihu na afọ 2007 na 2008 site n'aka eze nke ugbu a, Akiolu, na njikọ aka nke gọọmentị Steeti Lagos na mesuom Naịjirịa.[8]

Iga Idunganran nọrọ ọnọdụ dị ka ebe nchịkwa, ahịa agwaetiti ahụ na ebe ememme Eyo.[9]

Ebe aha ahụ si[dezie | dezie ebe o si]

IGA, nke sitere n'asụsụ Oyo / Ife Yoruba GAA nke pụtara ụlọ eze ma ọbu Obi eze akpọrọ Royal Home ma ọ bụ Palace na bekee, IDUN pụtara ala, ebe ma ọ bụ ụda nke ebe IGANRAN bụ okwu Yoruba maka ose. Iga Idunganran ya mere na-asụgharị "obí eze e wuru n'ugbo ose", ebe Aromire jiri ala ahụ mepụta n'oge gara aga dị ka ugbo ya.[10][11][12]

Ili oge ochie[dezie | dezie ebe o si]

A na-eli ndị eze niile nke Lagos tupu Oba Akitoye na Obodo Benin . Eze Akitoye bụ Eze mbụ nke Lagos ka e liri n'ime obí eze nke oge a. A na-eli ndị eze niile sochirinụ ma e wezụga Sanusi Olusi na Kosoko na Iga Idunganran.[7][13]

Ebe nsọ oge ochie nke Iga Idunganran[dezie | dezie ebe o si]

E nwere ọtụtụ ebe ofufe arusi nke ndi orisha n'obí eze. Ndị a gụnyere:

Èsù[dezie | dezie ebe o si]

Enwere ike ịchọta Esu (nke a na-akpọ Éshu) n'ọnụ ụzọ mbata nke obí eze. Esi Benin wee weta Èsù. A makwaara ya n'ọtụtụ aha ndị ọzọ, nke a ma ama bụ ekwensu. Oba na ndị isi ya kpere ekpere n'ụlọ ofufe agwụ a iji gbochie ihe ize ndụ na Lagos (ma mesịa na Naịjirịa n'ozuzu) n'oge gara aga. Ha na-ekpegakwa ekpere n'ebe ahụ tupu ha ahapụ obí eze maka ọrụ nzuzo ma ọ bụ nke gọọmentị iji gbochie ihe ọjọọ. Ọzọkwa, tupu eze apụọ, O kwesịrị iga ụlọ ofufe a iji nata ụsa otú njem ya ga-esi bụrụ. Ajụjụ ndị dị ka otu njem ahụ ga-adị mma ma ọ dị mma Oba ịmalite njem dị otú ahụ be ihe ana aga-ajụkarị.

Ògún[dezie | dezie ebe o si]

Ogun bụ chi nke ígwè. Ọ bụ ezie na ọ bụghị n'ime obí eze n'onwe ya, e nwere obere ụlọ e wuru maka ịbanye ozugbo n'ogige ahụ. Nnukwu ụlọ nsọ ahụ dị na mpụga mgbidi dị ugbu a nke obí eze, ọ bụ ezie na ọ ka nọ n'okpuru ikike ya. O nwere onye ụkọchukwu nwanyị na-arụ ọrụ ya kwa ụbọchị.

Okpukpe[dezie | dezie ebe o si]

A na-eme emume na ekpere pụrụ iche kwa ụbọchị iri na isii n'obí eze, ọ na-abụkarị Araba nke Lagos n'ime ya, Chief Ajanaku, ọ bụ ezie na Oba na-eji ndị ụkọchukwu ọdịnala ndị ọzọ na ndị ụkọchị nwanyị eme ihe mgbe ụfọdụ dabere na ihe kacha mkpa na oge, na ike ime mmụọ nke ndị dị otú ahụ. Ụfọdụ n'ime ihe ndị dị mkpa maka ime emume ndị a bụ aki ilu, oji, Ọsọ Ojii, mmanụ nkwụ, mmanya ọkụ ma ọ bụ ihe ọ bụla dị mfe, ọkụkọ, nduru, ewu ma ọ bụ ebule na ihe ọ bụla ọzọ Ifa oracle nwere ike inye iwu, na-owuwe ndụ mmadụ.

END SARS[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe ngagharị iwe END SARS nke afọ 2020 gasịrị, e zuuru Iga Idungaran na Oba nke Lagos, Rilwan Akiolu boro ndị ohi ebubo na ha na-zuoro nde dola abụọ na puku naira iri na asaa na obí ya.[14][15][16][17][18]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Presidential Lodge, obí eze nke mbụ na Lagos

Ịgụ ihe ọzọ[dezie | dezie ebe o si]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Kaye Whiteman (2013). Lagos: A Cultural and Literary History. Andrews UK Limited. ISBN 9781908493897. 
  2. Oba of Lagos Palace – Iga Idaguran – Isale Eko (en-US). Archived from the original on 2022-07-01. Retrieved on 2022-06-16.
  3. A king and his money (en-US). The Nation Newspaper (2021-03-08). Retrieved on 2022-06-16.
  4. Lagos History Lecture and no man's land exponents (en-US). The Guardian Nigeria News - Nigeria and World News (2017-05-29). Retrieved on 2022-06-19.
  5. Okeagu Ogadah (2005). Nigeria: cultural festivals & tourism sites directory, Volume 1. Federal Ministry of Cultural & Tourism. ISBN 9780670556. Retrieved on 4 May 2015. 
  6. Smith (January 1979). The Lagos Consulate, 1851-1861. University of California Press, 1979. ISBN 9780520037465. 
  7. 7.0 7.1 Folami (1982). A History of Lagos, Nigeria: The Shaping of an African City. Exposition Press, 65–66. ISBN 9780682497725. 
  8. (2006) African Cities Driving the NEPAD Initiative. United Nations Human Settlements Programme. ISBN 9211318157. Retrieved on 4 May 2015. 
  9. King (1996). Representing the City. New York University Press. ISBN 0814746799. Retrieved on 4 May 2015. 
  10. Williams (2008). Nigeria: The Bradt Travel Guide. Bradt Travel Guides. ISBN 978-1841622392. Retrieved on 4 May 2015. 
  11. Iga Idungaran (en-GB). Visit Nigeria Now. Retrieved on 2022-06-19.
  12. Lagos Oba traces origin to Benin, (en-US). The Guardian Nigeria News - Nigeria and World News (2017-05-14). Retrieved on 2022-06-19.
  13. Palace Iga Idungaran, Lagos, Nigeria - tourist attractions, most popular and visited places - KeepTravel. www.keeptravel.com. Retrieved on 2022-06-21.
  14. Wahab (2021-03-03). Oba Akiolu accuses youths of stealing $2m, N17m from his palace during #EndSARS protests (en-US). Pulse Nigeria. Retrieved on 2021-03-20.
  15. #EndSARS: Soldiers evacuate Oba of Lagos as angry youth vandalise palace - Premium Times Nigeria (en-GB) (2020-10-21). Retrieved on 2022-06-19.
  16. Oba Akiolu Returns to Palace Two Months After ENDSARS Riots (en-US). THISDAYLIVE (2021-01-02). Retrieved on 2022-06-19.
  17. #EndSARS: Protesters stole $2m, N17m from my palace — Oba Akiolu (en-GB). Vanguard News (2021-03-04). Retrieved on 2022-06-19.
  18. #EndSARS: Youths stole $2m, N17m from my palace - Oba Akiolu (en). Daily Trust (2021-03-04). Retrieved on 2022-06-19.