Igwegbe Odum

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Eze Igwegbe Odum (nke a na-akpọ Chief Igwebe Odum mgbe ụfọdụ) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Aro Igbo amụrụ n'obodo Mbaukwu nke Naijiria na Awka South LGA nke oge a na steeti Anambra . Igwegbe Odum, abụghị Aro site na mmalite, kama ọ bụ onye mbịarambịa dị ka ọtụtụ ndị bi na Arondizuogu. Ya na ụmụnne ya gbagara Arondizuogu na ngwụcha narị afọ nke 19. Akụkọ ndụ ya ghọrọ isiokwu nke Omenuko[1] akwụkwọ akụkọ Igbo mbụ Pita Nwana dere. Odum nwụrụ na 1940. Ọ bụkwa ọgọ Ojiako Ezenne nke Adazi. Igwegbe Odum alaghachighị n'ala nna ya nke Mbaukwu. Ya na ụmụnne ya biri na Ndi-Aniche Uno na Arondizuogu. Ezinụlọ ha gụnyere K.O. Mbadiwe na nwanne ya nwoke Green Mbadiwe.

Ihe odide[dezie | dezie ebe o si]