Jacob Getlar Smith
| Ụdịekere | nwoke |
|---|---|
| Mba o sị | Njikota Obodo Amerika |
| Aha enyere | Jacob |
| Aha ezinụlọ ya | Smith |
| Ụbọchị ọmụmụ ya | 3 Febụwarị 1898 |
| Ebe ọmụmụ | New York City |
| Ụbọchị ọnwụ ya | 28 Ọktoba 1958 |
| Ebe ọ nwụrụ | New York City |
| Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | English |
| Ọrụ ọ na-arụ | onye ese, omebe ihe nkiri |
| Omenkà faịlụ na | Smithsonian American Art and Portrait Gallery Library, Frick Art Research Library |
| Nwere ọrụ na mkpokọta | Smithsonian American Art Museum, Detroit Institute of Arts, Bryn Mawr College Special Collections, Whitney Museum of American Art |
| Ihe nrite | Guggenheim Fellowship |
| Ikike nwebiisinka dị ka onye okike | Ọrụ nwebiisinka chekwara |
Jacob Getlar Smith (1898 rụo ụbọchị irí abụọ na asatọ n'ọnwa Ọktoba, 1958) bụ ónyé na-ese ihe na ónyé na-eme ihe osise nke na-arụkarị ọrụ na New York City.[1] Smith gụrụ akwụkwọ na National Academy of Design na New York site na 1919 ruo 1921.[2]
N'afọ 1929, e nyere Smith Guggenheim Fellowship n'ọhịa nka márá mmá, màkà ọrụ okike na eserese.[2]
E gosipụtara ihe osise Smith n'ọtụtụ gallery, gụnyere Midtown Galleries, New York; National Academy of Design; Art Institute of Chicago; Corcoran Gallery of Art; Pennsylvania Academy of Fine Arts; John Herron Art Institute; Fort Wayne Art Museum; Carnegie Institute; Brooklyn Museum; Minneapolis Institute of Arts; Ann Arbor Art Association; Rochester Memorial Art Gallery; Cincinnati Gallery of Toronto; National Gallery of Canada (Ottawa); Des Moines City Association of Fine Arts.[2]
N'afọ 1930, e nyèrè Smith Maazị na Oriakụ. Frank G. Logan Prize nke narị asaa na iri ise dollar màkà ihe osise ya, Friends, site na Kọmitii na-ese ihe na ihe ọkpụkpụ nke Art Institute of Chicago.[3]
Ọ nwụrụ na Montefiore Hospital na The Bronx, New York n'ubochí irí abụọ na asatọ n'ọnwa Ọktoba, 1958.[4]
Ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]Ihe osise nke Smith:
- The Artist's Wife (1927), ihe osise mmanụ dị na nchịkọta nke Brooklyn Museum
- Snow Shovelers (1934), ihe osise mmanụ na nchịkọta nke Smithsonian American Art Museum
- Mgbidi ndị US Treasury Section of Painting and Sculpture nyere iwu maka New Deal, na Federal Building and Post Office, Salisbury, Maryland: Salisbury، Stage at Byrd's Inn and Cotton Patch
- Mgbidi dị na Nyack, New York Post Office, 1936, nke Treasury Relief Art Project nyere iwu
Smith bụ ónyé édémédé ma ọ bụ ónyé nchịkọta akwụkwọ na isiokwu gbasara eserese, gụnyere:
- Ónyé nchịkọta akụkọ maka Jan Gordon's A step-ladder to painting (New York: Greenberg, c1939)
- Ihe osise mmiri màkà onye mbido (New York: Watson-Guptill, 1951)
- Ihe osise mmiri nke Maurice Prendergast (New York: Watson-Guptill, 1956, bipụtara na American artist, Mpịakọta irí abụọ, nọmba abụọ, February 1956)
Edensibia
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Jacob Getlar Smith papers, 1919-1966. Archives of American Art. Retrieved on February 16, 2016.
- ↑ 2.0 2.1 2.2 Jacob Getlar Smith. John Simon Guggenheim Memorial Foundation Fellows. Archived from the original on June 18, 2022. Retrieved on February 16, 2016.. John Simon Guggenheim Memorial Foundation Fellows. Retrieved February 16, 2016.
- ↑ American Paintings and Sculpture: Forty-Third Annual Exhibition, October Thirtieth to December Fourteenth, Nineteen Thirty, The Art Institute of Chicago, p. 5.|http://www.artic.edu/sites/default/files/libraries/pubs/1930/AIC1930PandS43rdAn_comb.pdf
- ↑ "Jacob G. Smith, 60, Artist and Author", New York Times, October 29, 1958, p. 35. Retrieved on April 19, 2016.