James V. Herring
ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Njikota Obodo Amerika |
aha enyere | James |
aha ezinụlọ ya | Herring |
ụbọchị ọmụmụ ya | 1887 |
Ụbọchị ọnwụ ya | 1969 |
ọrụ ọ na-arụ | omenkà, university teacher |
onye were ọrụ | Howard University |
agbụrụ | Ndi Afrika nke Amerika |
James Vernon Herring (ubochí asaá n'ọnwa Jenụwarị, 1887 rụo ubochí irí abụọ na itoolu n'ọnwa Mée, 1969) bụ onye Africa-America na-ese ihe na prọfesọ nke nka na Mahadum Howard .
James V. Herring guzobere Ngalaba nka nkè Mahadum Howard na 1922. N'afọ 1943, ya na Alonzo J. Aden meghere ụlọ ngosi Barnett-Aden na Washington, DC. Ụlọ ngosi ahụ bụ ụlọ ngosi nka ojii mbụ nwéré onwé ya na United States ma dị na otu narị na iri abụọ na asaa Randolph Street, NW. Na mgbalị ịlụso ịkpa ókè ọgụ, a gosipụtara ndị na-ese ihe ojii na ndị ọcha na gallery ahụ.[1] Ụlọ ngosi ahụ jere ozi dị ka ebe ndị nwéré mmasị na nka ga-ezukọ, gụnyere ndị nlekọta sitere na Phillips Collection, Corcoran Gallery of Art, na National Gallery of Art.[2]
Herring na Aden rụkọkwara ọrụ ọnụ na Gallery of Art na Howard. Herring guzobere ya na 1930 ma Aden jere ozi dị ka ónyé nlekọta mbụ.
Herring làrà ezumike nká na Howard na 1953.[3]
Ihe odide
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Fitzpatrick (1990). The Guide to Black Washington. New York, New York: Hippocrene Books, 94. ISBN 0870528327.
- ↑ Fitzpatrick (1990). The Guide to Black Washington, 95.
- ↑ James Porter : (en). The Johnson Collection, LLC. Retrieved on 9 December 2020.
Njikọ mpụga
[dezie | dezie ebe o si]- "Being But Men, We Walked Into the Trees", February 11, 2016.