Joy Onumajuru

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Joy Onumajuru
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereJoy Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya19 Febụwarị 1991 Dezie
Asụsụ obodoAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin Naịjirịa Dezie

Joy Osomiamhe-Onumajuru (amụrụ na 19 Febụwarị 1991), bụ nwa afọ Naijiria bụbu onye mmeri na asọmpi ịma mma na onye ọchụnta ego.[1][2] Ọ bụ onye malitere African Scholars Care Initiative na Diamond Scholars Royal Academy.[3]

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Onumajuru malitere agụmakwụkwọ ya na Nursery na Primary School di na Festac Town, Lagos Steeti site na 1992 ruo 1995 na 5th Avenue Primary School di na obodo Festac, Lagos Steeti site na 1995 ruo 2000, ọ gara Rolex Comprehensive College, Iba Town, Ojo LGA, Lagos Steeti site na 2000 ruo 2003 na Barek Memorial High School, Iba Town. Site na 2008 ruo 2012, ọ gara Mahadum Imo State wee gụsịrị akwụkwọ na nzere na sayensị kọmputa. Site na 2014 ruo 2016, ọ gara Mahadum Greenwich ebe ọ nwetara MSC na teknụzụ ozi azụmahịa.[1][2]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Onumajuru malitere ọrụ ya na 2011 mgba o meriri dika Nwanyi Eze nke Aso Naijiria . N'afọ 2014, ọ kwagara UK ebe ọ meriri asọmpi ọzọ, Miss Commonwealth Africa . Ọ laghachiri Naịjirịa wee soro Shakatawa na Africa Independent Television rụọ ọrụ na Personalities Places & Event All.[1][2] Ka oge na-aga n'ọrụ ya, ọ malitere African Scholars Care Initiative (ASCI) na-enye nkwado agụmakwụkwọ na ihe enyemaka maka ndị na-enweghị ihe ùgwù gafee mpaghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị isii na Naịjirịa.[4][5] N'afọ 2020, ASCI debere otu narị ụmụ agbọghọ Naijiria na ọzụzụ ICT.[6]

Onyinye na mmata[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2014, Onumajuru nwetara ihe nrite Nigeria Goodwill Ambassador Award na African Leading Women Award n'afọ 2019.[1]

Edensibịa[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 Six Things You Should Know About Joy Osomiamhe-Onumajuru. The Sun Newspaper (14 August 2020). Retrieved on 21 August 2020. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "SUN" defined multiple times with different content
  2. 2.0 2.1 2.2 A queen with education on her mind. The Nation Newspaper (19 September 2017). Retrieved on 21 August 2020. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "TN" defined multiple times with different content
  3. Nwafor (17 July 2020). ASCI founder holds media tour, speaks on youth empowerment. Vanguard Newspaper. Retrieved on 21 August 2020.
  4. Essien (29 May 2020). African Union, DG Naptip, Others At May 27th ASCI Borehole Commissioning In Abuja. Leadership Newspaper. Retrieved on 21 August 2020.
  5. Okafor (28 May 2020). NGO Donates Borehole, Foodstuff To FCT Community. Aljazirah News. Retrieved on 21 August 2020.
  6. Ezeh (10 August 2020). Women empowerment: ASCI places 100 girls on ICT training. The Sun Newspaper. Retrieved on 21 August 2020.