Khabonina Qubeka

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Khabonina Qubeka
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịSouth Africa Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya22 Jenụwarị 1981 Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụomee, omee ihe nkiri Dezie

Khabonina Qubeka (amụrụ 22 Jenụwarị 1981 [1] ) bụ onye na-eme ihe nkiri South Africa, onye na-eme ihe ngosi telivishọn, onye na-agba egwu, onye na-eme egwuahụ̀ bụ Choreography, nwanyị ọchụnta ego na onye bụ ọbụ abụ. [2] [3] [4] Na 2017, ọ meritere onye na-eme ihe nkiri kacha mma na Mmemme awọd ihe nkiri nke Boston International Film Festival Awards ma bụrụ onye a họpụtara dị ka onye na-eme ihe nkiri kacha mma na Florida Film Festival nakwa ezi ome kacha mma nke AMAA bụ Africa Movie Academy Awards maka ọrụ ngosiputa agwa ya dị ka "Dora" na Dora's Peace . N'afọ, 2017, ọ rụrụ ọrụ ngosiputa agwa dị ka onye otu omempụ Nina Zamdela na SABC 3 soap opera bụ Isidingo .

Ọ kwadoro ihe ngosi BET Fix My Love ma amara ya maka ọrụ ya dị ka Maxine na ihe ngosi ritere awọdụ nke South Africa bụ The Wild . [1]

Dị ka onye bụ ọkachamara n'egwu dị iche iche, ọ kwadola ma bụrụ onye ikpe n'ọtụtụ ihe ngosi ịgba egwu telivishọn - SABC 1dika Dance Your Butt Off, eTV's Step Up or Step Out . O mekwara ihe nturu ugo The Channel O Music Video Awards. [1]

Qubeka, onye egwuregwu yoga na-anụ ọkụ n'obi , mepụtara ma kwado ihe ngosi ahụike ya na nkwudosike nke ahụ nke a na-akpọ Gym e'Kasi maka eTV na Open View HD .

N'afọ 2018, o bidoro nchepụta Afro Yoga nke ya na Hong Kong wee nweta ihe nrite Mahadum City nke nsọpụrụ kachasị elu nke ọkachamara nkepụta maka ụwa site n'aka onye isi Mahadum City Mr Wilson Lam na YogaRaj n'onwe ya. [5]

Ọrụ ime ihe[dezie | dezie ebe o si]

Qubeka buru ụzọ wee bụrụ onye a ma ama na ngosipụta agwa dị ka Doobsie na soapie SABC 2 " Muvhango ", site na 2006 ruo 2007 (ịbụ onye na-eme ihe nkiri nke atọ gosipụtara ọrụ ahụ mgbe Lindiwe Chibi na Khanyi Mbau gasịrị ). O mere ọrụ TV ndị ọzọ dị iche iche n'afọ ndị sochirinụ, sonyere na usoro ihe nkiri SABC bụ For Sale (2007), The Lab (2008) na soapie eTV "bụ Rhythm City", na 2009. Ka ọdị ruo afọ 2010, ọ malitere na telenọvela M-Net bụ The Wild, yana na-egosi na ihe ngosi The Mating Game na Erfsondes . N'afọ 2014, ọ kwadoro ihe ngosi ahụike ya na ụdị ndụ ya na OpenView HD 's eKasi+ channel, nke a na-akpọ Gym e'Kasi (mee egwuregwu nkwudosike ahụ n'ụlọ), nke bụ ime nhọrọ nri na mmega ahụ ziri ezi na ntụsara ahụ nke ụlọ na agbataobi gị. Ọ mekwara ihe mkpali ndọrọ ndọrọ ọchịchị Ihawu Lesizwe, nke SABC. Na 2017, ọ meritere Indie Spirit Award maka onye na-eme ihe nkiri kacha mma na Boston International Film Festival . O nwetara ihe nrite maka igosipụta agwa dị ka Dora na fim ahụ, bụ Dora's Peace . Dị ka o si kwuo, itinye aka na fim ahụ mere ka ọ na-ahụ ndị akwụna n'ụzọ dị iche. [6] E gosikwara ihe nkiri a na Orlando Film Festival na Beijing International Film Festival . [7] [8] Na 2017, a kọrọ na ọ na-eme ihe ngosi agwa dị ka Nina Zamdela na usoro telivishọn , bụ Isidingo . [8] N'otu afọ ahụ, a kọkwara na ọ na-ewepụta ihe nkiri ọhụrụ, aha ya bụ She is King. [8] N'onwa Ọctoba 2017, a mara ọkwa ya dị ka onye nnabata nke mmemme South Africa ọhụrụ, nke gbadoro ụkwụ na ndị nkuzi ụlọ akwụkwọ. [9]

Na mgbakwunye na ime ihe nkiri, Qubeka bụkwa onye na-agba egwu na onye na-akwado ahụike. Ọ na-eji mgbasa ozi ọha na eze na-akwalite ụdị ndụ dị mma na ọdịdị ahụ. Khabonina na-eme ihe nkiri a ma ama nke bụ Generations the Legacy dị ka Oby Abudu na dị ka nwunye Vuyo Dabula bụ Kumkani Phakade.

Ọrụ egwu[dezie | dezie ebe o si]

Na 2010, Qubeka dere ma wepụta afere egwu ma bụ albọm mbụ ya akpọrọ Gama Lahko, n'okpuru akara egwu nke ya bụ Khabodacious Moves Music. [1] Ndekọ ahụ nwere egwu iri na abụọ, ma gụnye otu egwu "Gama Lakho" na "Bring your Body". Egwu abụọ a nwetara vidiyo egwu, nke Qubeka mepụtara. [1] N'afọ 2013, o wepụtara egwu rap akpọrọ, "Wax It (Wax On Wax Off)" nke kesara na 2018. [10]

Ndụ onwe onye[dezie | dezie ebe o si]

Qubeka mụrụ nwa mbụ ya, nwanyị, n'ọnwa Ọktoba 2018. [11] [12]

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 admin (7 November 2017). Khabonina Qubeka. tvsa.co.za. Retrieved on 7 November 2017.
  2. Media (5 May 2013). Qubeka makes Khabodacious waves. The Citizen (South Africa). Retrieved on 31 December 2019.
  3. 'Khabonina With The Cuteness' Talks About That Rap Video (en). HuffPost UK (5 April 2018). Retrieved on 31 December 2019.
  4. Komana (30 May 2019). Khabonina takes AfroYoga to Hong Kong. Bedfordview Edenvale News. Retrieved on 31 December 2019.
  5. Komana (30 May 2019). Khabonina takes AfroYoga to Hong Kong. Bedfordview Edenvale News. Retrieved on 31 December 2019.
  6. admin (25 April 2017). Khabonina Qubeka's Portrayal Of A Joburg Prostitute Has Won Her Best Indie Actress In The U.S.. Huffington Post. Archived from the original on 12 November 2017. Retrieved on 7 November 2017.
  7. admin (20 April 2017). Actress Qubeka bags an international award. Newsday. Retrieved on 7 November 2017.
  8. 8.0 8.1 8.2 Herinbi (18 September 2017). Khabonina Qubeka is 'King'. iol.co.za. Retrieved on 7 November 2017.
  9. admin (5 October 2017). Khabonina Qubeka on upcoming reality show. ghafla.com. Retrieved on 7 November 2017.
  10. Kekana (18 April 2018). WATCH | That Khabonina rap video that Twitter used to shade the yogi (en-ZA). TimesLIVE. Retrieved on 31 December 2019.
  11. Surprise! Khabonina Qubeka announces the birth of her baby girl (en-ZA). TimesLIVE. Retrieved on 31 December 2019.
  12. Matjebele (1 August 2018). Khabonina on loving her boyfriend: 'I have the perfect partner' (en). News24. Retrieved on 31 December 2019.