Kiki Mordi

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Kiki Mordi
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya12 Ọgọọst 1991 Dezie
Ebe ọmụmụUgwu Ọcha Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa Dezie
ụdị ọrụ yaonye mgbasa ozi, filmmaker, reporter Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Nigeria Dezie
Ebe obibiObodoézè Nà Ofú Dezie
Ụcha ime anyaagba aja aja Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
Ihe nriteInternational Emmy Awards Current Affairs & News, People Journalism Prize For Africa, OkayAfrica 100 Women, The Future Awards Africa Prize for Journalism Dezie
webụsaịtịhttps://sites.google.com/kikimordi.com/kikimordi/home Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Kiki Mordi onye a mụrụ ka ọnwa Ọgọst dị na mkpụrụ ụbọchị iri na abụọ n'afọ 1991 bụ onye Nigerian b onye ama ama dika onye nta akụkọ, onye na-agputa mab egosipta ihe n'onyonyo, onye na-eme fim nakwa onye na-ede ederede. N’afọ 2016, ọ nwetara ihe onyinye dika onye aka r ya ka pta ihe n'ihe ndi ana-akwapta n;igwe Redio (South-South) n'emume akpọrọ Nigerian Broadcasters Merit Awards. [1]

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Mordi na Port Harcourt, Rivers State, Nigeria nye nne na nna ya bụ ndị Nigeria. [2] ka nna ya nwụsịrị, ọ bara University of Nigeria, Nsukka iji maka dibia oyibo mana emechara ọ kwụsị agụmakwụkwọ n'ihi <a href="https://en.wikipedia.org/wiki/Sexual_harassment" rel="mw:ExtLink" title="Sexual harassment" class="cx-link" data-linkid="32">sexual harassment</a> sitere n'aka otu onye nkuzi ya. [3] [4]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Mordi dika anyị kwuru na mbụ bụ onye ntaakụkọ si Naịjirịa, onye mgbasa ozi, onye na-eme fim na onye na-ede ederede. Ugbu a ọ bụ anya BBC ji akọwapụta ihe na-eme n'Africa ,ọ bụkwa onye isi na WFM 91.7. [2] N’afọ 2017, ọ bidoro agha n;igwe ikuku ya bụ 'online' ibuso ndi uwe ojii na-eme mpụ na aghụghọ banyere ina ego ngarị, o bidoro ibuso ha agha a mgbe ndi uwe ojii wakporo ya enyi ya nwoke n'ụlọ ya ma bo ha ebubo na ha ndi otu nzuzo. [5] N'afọ 2015, ahọpụtara ya dika otu na ndi na-eto eto kacha egosipụta nakwa akọwapụta ihe na onyonyo nakwa redio na mmeme ndi Nigerian Broadcastters Merit Awards. [6] N’afọ 2016, ọnwetara ihe onyinye maka onye kacha akọwaputa ihe na redio (South South)na mmeme ndị Nigerian Broadcastters Merit Awards. [1] A hoputara ya maka nke akpọrọ 'on air personality Female' na mmeme Scream All Youth Awards. [7] Ka ọnwa Novemba di na mkpụrụ ụbọchi atọ n'afọ 2019, ahọpụtara ya maka Future Awards Africa maka onyinye ịchụ nta akụkọ. [8]

Ndụ na Bay[dezie | dezie ebe o si]

N’afọ 2019, ọ wepụtara ma kwado ihe nkiri akụkọ akpọrọ “Life at the Bay” na Lagos, Nigeria. Ihe nkiri a na-akọ akụkọ otu ụmụ nwaanyị Tarkwa Bay si edi ndụ , nsogbụ, igba mbọ nakwa ndọga ha [9]

Ka ọnwa Mee dị na mkpụrụ ụbọchị iri na asaa n'afọ 2019, ndi 'Real time International Film Festival' họpụtara ihe nkiri fim a bụ 'life at bay bụ nke Nora Awolowo haziri. [10]

Ka ọnwa Ọktọba dị na mkpụrụ ụbọchị isii n'afọ 2019, a họpụtara ihe nkiri ahụ bụ 'life at bay' ka ọ gosipụta na Africa International Film Festival ( AFRIFF) n'afọ 2019 . [11]

Akụkọ Mmekọ nwoke na nwaanyị maka ịnweta akara n'afọ 2019[dezie | dezie ebe o si]

Ka ọnwa Ọktọba di na mkpụrụ ụbochị asaa n'afọ 2019, Mordi na ndị otu ya na BBC Africa Eye gosipụtara akụkọ mere eme di nkeji iri na atọ. Ha gosipụtara otu ndi nkuzi nwoke na Mahadum si edina ụmụ akwụkwọ ha ndi nke nwaanyi iji mee ka ha gafee n'ule Mahadum ndi a bụ University of Lagos and University of Ghana . [12] Dr. Boniface Igbeneghu nke Mahadum nke Lagos, Dr. Ransford Gyampo na Dr. Paul Kwame Butakor nke Mahadum nke Ghana bụ ndị nkuzi a gosipụtara na vidio na-akpa ụdị agwa a. [13] Dr. Boniface Igbeneghu bụ nnukwu onye nkuzi na ngalaba na-akuzi nka, ise ihe, ikpụ ihe na Mahadum nke Lagos Ọ bụkwa onye isi pastọ na Foursquare Gospel Church in Nigeria, Dr. Ransford Gyampo bụ onye otu Prọfesọ nke nke 'Political Science na Mahadum Ghana na Dr. Paul Kwame Butakor bụ onye nke na-akuzi na 'College of Education dikwa na Mahadum Ghana. [14] Mordi, onye nke kpara agwa dika nwata nwaanyi di afọ iri na asaa na-achọ ibata Mahadum kwuru na o were ya ndi otu ya ọnwa iteolu iji mezuo nyocha a. [15] [16] Mgbe egosiri akụkọ na BBC, Dr. Ransford Gyampo kwuru na ya ga-akpụpụ BBC ụlọ ikpe.. [17] N'ihi ihe mkpughe emere Mahadum nke Lagos kwụsịrị Dr. Boniface Igbeneghu ọrụ ebe ndị Foursquare Gospel Church siri ya rituo n'ọkwa dịka Pastọ rịdata. [18] [19] Mahadum nke Lagos mechiri otu ọnụ ụlọ akpọrọ "Cold room "egosiri na vidio ahụ bụ ebe ndi nkuzi Mahadum na-anọ enye ụmụ akwụkwọ mmekpa ahụ. [20] Otu onye Nigeria na-eti egwu bụ Adekunle Gold na Nwunye ya bụ Simi kelere Mordi maka akụkọ ihe a na-eme na Mahadum o gosiri. [21] [22] Onye bụbu onye osote onye isi ala Nigeria, Atiku Abubakar na onye bụbu onye isi oche nke Sinati <a [23], kpọrọ oku ka gọọmentị Nigeria leba anya n'ụdị agwa na-eme na Mahadum Nigeria. [24] [25] N'ajụjụ ọnụ ndi Sahara Reporters gbara ya o kwuru na ya na-enweta okwu iyi egwu kemgbe ọ mechara nyocha ahụ. [26]

N' ụbọchi asatọ nke ọnwa Ọktoba n'afọ 2019, Mordi na ndị otu ya na BBC Africa Eye weputara akwụkwọ ebe edepụtara aha ndi niile na enye ụmụ akwụkwọ mmekpa ahụ maka idina ha ka ha wee gafee n;ule. Nke a butere ịchụ n'ọrụ achụrụ Dr Samuel Oladipo, onye nkuzi na Ngalaba Economics, Mahadum. nke Lagos. [27]

N’abalị iteolu nke ọnwa Ọktoba n’afọ 2019, ndị [28]Nigerian senate zara oku ụmụ Nigeria site na-igụpụta iwu na-amachi ndi nkuzi idina ụmụ akwụkwọ iji nye ha akara ngafe n'ule. [29]

Nturuugo na nhoputa[dezie | dezie ebe o si]

Afọ Onyinye Katigori Mmpụtara
2019 The Future Awards Africa Prize for Journalism A họpụtara ya
2016 Scream All-Youth Awards On-air Personality of the year (Female) A họpụtara ya
Nigerian Broadcasters Merit Awards Outstanding Radio Program Presenter (South South) O meriri
2015 Nigerian Broadcasters Merit Awards The Most Promising Young Presenter (TV//Radio) A họpụtara ya

Nsinweta[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 BEHOLD! Winners at 6th Nigerian Broadcasters Merit Awards (NBMA) (29 February 2016). Retrieved on 8 October 2019.
  2. 2.0 2.1 Interesting 5 facts about Kiki Mordi the sex for grade undercover journalist (7 October 2019). Retrieved on 8 October 2019.
  3. Seven things you should know about Kiki Mordi (9 October 2019). Retrieved on 10 October 2019.
  4. Kiki Mordi: BBC reporter dropped out of school over sexual harassment (Video) (7 October 2019). Retrieved on 8 October 2019.
  5. KIKI MORDI'S "END POLICE EXTORTION NOW"  PETITION GETS 1,000 SIGNATURES (10 February 2017). Retrieved on 8 October 2019.
  6. Here Are Nominees’ Numbers For Voting at NBMA 2015 (29 January 2016). Archived from the original on 8 October 2019. Retrieved on 8 October 2019.
  7. D'banj, Linda Ikeji, Don Jazzy grab Scream All Youth Awards 2016 nomination (13 October 2016). Retrieved on 8 October 2019.
  8. #NigeriasNewTribe: Here's the The Future Awards 2019 nominees list (3 November 2019). Retrieved on 4 November 2019.
  9. The Trailer For the documentary film ’Life at the Bay’ looks rather promising (18 February 2019). Retrieved on 8 October 2019.
  10. Documentary By Kiki Mordi And Nora Awolowo, "Life at the Bay" Selected By Real Time Film Festival (17 May 2019). Archived from the original on 8 October 2019. Retrieved on 8 October 2019.
  11. Here's the Full List of Films Selected for AFRIFF 2019 (9 October 2019). Retrieved on 11 October 2019.
  12. 'Sex for grades': Undercover in West African universities. BBC News (7 October 2019). Retrieved on 8 October 2019.
  13. Sex For Marks: BBC Releases Faces Of Lecturers Sexually Harassing Students In UNILAG, Legon (7 October 2019). Retrieved on 8 October 2019.
  14. UNILAG lecturer caught in sex-for-grade scandal (7 October 2019). Retrieved on 8 October 2019.
  15. Nigerians react to BBC exposé on African lecturers in #SexForGrades (7 October 2019). Retrieved on 8 October 2019.
  16. BBC Exposes Sexual Harassment at West African Universities (7 October 2019). Retrieved on 8 October 2019.
  17. #SexForGrades: Ghanaian lecturer threatens to sue (7 October 2019). Retrieved on 8 October 2019.
  18. UNILAG suspends Dr Boniface, lecturer caught on video sexually harassing 'admission seeker' (7 October 2019). Retrieved on 8 October 2019.
  19. UNILAG, Foursquare Suspend Lecturer Filmed Demanding Sex From Student (7 October 2019). Retrieved on 8 October 2019.
  20. BREAKING: #SexForGrades: UNILAG shuts down 'Cold Room', where lecturers 'sexually harass' students (7 October 2019). Retrieved on 8 October 2019.
  21. Simi & Adekunle Gold Hail BBC Journalist, Kiki Mordi For Exposing University Lecturers in New Documentary (7 October 2019). Retrieved on 8 October 2019.
  22. Nigerians praise BBC reporter, Kiki Mordi, over #SexForGrades documentary (7 October 2019). Retrieved on 8 October 2019.
  23. https://en.wikipedia.org/wiki/Bukola_Saraki" rel="mw:ExtLink" title="Bukola Saraki" class="cx-link" data-linkid="68">Bukola Sarak
  24. Atiku Calls For Action Against Sexual Harassment in Universities (7 October 2019). Retrieved on 8 October 2019.
  25. #SexForGrades: Revisit Sexual Harassment Bill, Saraki Urges Buhari, Senate (7 October 2019). Retrieved on 8 October 2019.
  26. EXCLUSIVE: Sex-for-grades: I Have Received Threats Since Undercover Investigation, Says BBC Journalist Kiki Mordi (7 October 2019). Archived from the original on 8 October 2019. Retrieved on 8 October 2019.
  27. Sex-for-admission: UNILAG suspends another lecturer, Dr Oladipo, caught in BBC video (8 October 2019). Retrieved on 9 October 2019.
  28. https://en.wikipedia.org/wiki/Senate_of_Nigeria" rel="mw:ExtLink" title="Senate of Nigeria" class="cx-link" data-linkid="73"
  29. Senate re-introduces anti-sexual harassment bill (9 October 2019). Retrieved on 9 October 2019.