Korring

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Korring
asụsụ, modern language
mba/obodoNaijiria Dezie
ụmụ amaala kaBenue Steetị, Ȯra Ebonyi, Federal Capital Territory (Nigeria) Dezie
Ọkwa asụsụ Ethnologue6a Vigorous Dezie

K'orring bụ asụsụ ndị Benue na ndị elu Cross River ndị Oring nke ala Naịjịrịa na-asụ kwa ya .[1]

Asụsụ ndi di ka ya[dezie | dezie ebe o si]

A na-ekewa asụsụ na obodo na obodo. A na enye asụsụ aha site na iji mkpụrụedemede K. Eteji (Ntezi) ha na-asụ K'eteji, Lame (Okpoto) ha na-asu Ki'lame, Idzem (Amuda) na-asu K'idzem, Okpolo (Opkomoro) na-agwa K'okpolo, Uffium( Effium) na-asa K'uffium na Ebonyi State, Nigeria. Ufia (Utonkon) na Benue State na-asu K'ufia. Ukelle, na Cross River State, na-asụ K'ukelle.

Obodo Abakaliki[dezie | dezie ebe o si]

Maka ihe nketa ndị Ebonyi Steeti, ndị ọkà mmụta nke obodo Abakaliki dị ka C.C Ugoh n'akwụkwọ ya Gods of Abakaliki kwuru si na ndị Orring ebirila n'ókèala Abakaliki tupu ọbịbịa nke ndị isi Igbo anọ nke Ezza, Izzi, Ikwo na Ngbo. Ndị edemede ndị ọzọ ekwukwala na ndị Orring bụ ndị bu ụzọ biri na mpaghara Abakaliki tupu ọbịbịa otu ndị Igbo ọzọ.

Ndi Orring la kwa ndị Igbo lukoro onwe halụrụ were mepụta omenala ngwakọta. Orring biri na Ntezi-Aba nke Abakaliki tupu ha agbasa n'ebe obibi ndị ọzọ dikwa n'ime Ebonyi Steeti. Abakaliki bụ okwu Mbembe nke pụtara tupu ọbịbịa nke ndị Abakaliki.

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Olson (1996). The Peoples of Africa: An Ethnohistorical Dictionary. Greenwood Publishing Group. ISBN 0-313-27918-7.