Federal Capital Territory (Nigeria)

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Federal Capital Territory (Nigeria)
first-level administrative division, Ora no na ime Naijiria
Oge/afọ mmalite3 Febụwarị 1976 Dezie
mba/obodoNaijiria Dezie
isi steetiAbuja Dezie
dị na ngalaba nhazi mpagharaNaijiria Dezie
nhazi ọnọdụ8°50′0″N 7°10′0″E Dezie
geoshapeData:Nigeria/Federal Capital Territory.map Dezie
ụlọ ọrụ nke onye isi gọọmentị nwereMinister of the Federal Capital Territory Dezie
Executive òtùFederal Capital Territory Administration Dezie
Nkwekọrịtara oke alaKaduna Steeti, Ȯra Nasarawa, Ȯra Kogi, Ȯra Niger Dezie
dochieȮra Nasarawa, Ȯra Niger, Ȯra Kogi Dezie
webụsaịtịhttp://www.fcta.gov.ng/ Dezie
Map
Federal Capital Territory (Nigeria)

Federal Capital Territory, nke a maara dị ka FCT, bụ mpaghara gọọmentị etiti dị na etiti Naịjirịa. Abuja, isi obodo Naijiria dị na mpaghara a. E guzobere FCT na 1976 site na akụkụ nke steeti ochie nke Kwara, Niger, Kaduna na Plateau States na ọtụtụ ala a tụrụ na steeti Niger.[1] Ọ dị n'ime mpaghara North Central nke mba ahụ. N'adịghị ka steeti Naịjirịa, nke ndị Gọvanọ a họpụtara ahọpụta na-eduzi, ọ bụ Nchịkwa Federal Capital Territory na-achịkwa ya, bụ minista nke Onye isi ala họpụtara.[2]

Akụkọ ihe mere eme[dezie | dezie ebe o si]

E kere Federal Capital Territory nke a makwaara dị ka FCT mgbe ewepụtara iwu nke isii nke afọ 1976. Ọ malitere n'ihi mkpa ịchọta nnọchi anya isi obodo Lagos nke jupụtara ma nwee obere ohere maka mgbasawanye. Mpaghara ahọpụtara dị ka isi obodo ọhụrụ bụ Gwariland nke nwere ọnụ ọgụgụ dị elu nke ndị Alakụba na Ndị Kraịst na nnọpụiche dị elu site na agbụrụ ndị na-achịkwa. Ọ bụ steeti nwere mmadụ ole na ole na Naịjirịa.[3]

Ọdịdị ala[dezie | dezie ebe o si]

Ógbè ahụ dị n'ebe ugwu nke njikọ nke Osimiri Niger na Osimiri Benue. Steeti Niger dị n'ebe ọdịda anyanwụ na n'ebe ugwu, Kaduna dị n'akụkụ ugwu ọwụwa anyanwụ, Nasarawa dị n'ọwụwa anyanwụ na ndịda, Kogi dị n'etiti ndịda ọdịda anyanwụ Naịjiria.

Federal Capital Territory nwere ala ihe dịka 7,315 km2, ọ dịkwa n'ime mpaghara savannah nwere ọnọdụ ihu igwe dị mma.

Akụ eke dị na FCT[dezie | dezie ebe o si]

Akụ ndị a hụrụ na FCT gụnyere marble, tin, ụrọ, mica, na tantalite.[4]

Anụ Ọhịa[dezie | dezie ebe o si]

Ugwu nke FCT na-enye ọtụtụ ndị bushbuck ụlo, ọhịa Black duiker, ọhịa pig, chimpanzee na red-flanked duiker. N'ohia FCT a na-ahụkwa agụ owuru, atụ, antelope roan, Western hartebeest, enyí, warthog, duiker na-acha ntụ ntụ, nkịta ihu enwe, enwe patas na enwe na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ.[5]

Nkewa[dezie | dezie ebe o si]

Ógbè ahụ nwere mpaghara gọọmentị ime obodo isii ugbu a, ha bụ:[6]

Asụsụ[dezie | dezie ebe o si]

Asụsụ nke Federal Capital Territory nke LGA depụtara bụ:[7]

LGA Asụsụ
Abaji Dibo; Gupa-Abawa, Ebira, Ganagana
Abuja Gade; Gbagyi, Nupe, Hausa
Bwari Gwandara; Ashe; Gbagyi
Gwagwalada Gbari, Egibra, Hausa
Kuje Gade; Gbagyi
Kwali Gwandara; Gbagyi; Ebira, Kami, Ganagana, Nupe, Hausa

Asụsụ Hausa bụ ihe a na-asụ n'ọtụtụ ebe na Federal Capital Territory.[7]

Ndọrọ ndọrọ ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

A họpụtara kansụl ahụ na ntuli aka mpaghara nke Federal Capital Territory nke a mere n'afọ 2022.[8]

Edensibịa[dezie | dezie ebe o si]

  1. Abuja at 46: The Dreams, Strides, Challenges | Premium Times Nigeria (en-GB) (2022-02-03). Retrieved on 2022-03-07.
  2. Nigeria Education.
  3. Elleh, Nnamdi (August 2015). "Chapter 3", Architecture and politics in Nigeria : the study of a late twentieth-century enlightenment-inspired modernism at Abuja, 1900-2016. ISBN 9781472465306. OCLC 965828210. 
  4. FCT State. rmrdc.gov.ng. Raw Materials Research and Development Council. Archived from the original on 22 May 2018. Retrieved on 20 May 2018.
  5. Federal Capital Territory Administration - Facts. Federal Capital Territory Administration. Archived from the original on 23 December 2008. Retrieved on 24 July 2018.
  6. Odunsi. "Gwagwalada re-run poll: APC beats APGA, PDP in narrow victory", Daily Post Nigeria, 13 January 2018.
  7. 7.0 7.1 "Nigeria", Ethnologue. Retrieved on 2020-01-10.
  8. FCT Area Councils election to hold February 2022 - INEC (en-US). Voice of Nigeria (2021-03-31). Retrieved on 2022-03-29.