Kwadwo Adjei-Darko

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Kwadwo Adjei-Darko
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịGhana Dezie
Aha enyereKwadwo Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya10 Mee 1948 Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, omenkà Dezie
Ọkwá o jiMember of the 4th Parliament of the 4th Republic of Ghana, Member of the 3rd Parliament of the 4th Republic of Ghana, Member of the 2nd Parliament of the 4th Republic of Ghana, Minister for Local Government Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of cape coast Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịNew Patriotic Party Dezie
okpukpere chi/echiche ụwaEastern Orthodoxy Dezie

Kwadwo Adjei Darko bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Ghana. Ọ bụ onye omeiwu maka mpaghara Sunyani West na mpaghara Brong Ahafo nke Ghana.

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Adjei Darko na 10 Mee 1948.[1] O nwetara nzere bachelọ nke sayensị na Mahadum Cape Coast . Ọ gụrụ ihe gbasara agụmakwụkwọ.[1]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Adjei Darko bụ onye na-ese ihe site na ọrụ.[1]

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

Adjei-Darko bụ onye omeiwu maka mpaghara Sunyani West na ndị omeiwu nke atọ na nke anọ nke mba Ghana nke anọ. Ọ bụbu Minista na-ahụ maka igwu ala n'afọ 2000, ma malite n'afọ 2008, ọ bụ Minista nke lokal gọọmenti, Mmepe Ime Obodo na Gburugburu Ebe Obibi nke Ghana na onye omeiwu maka Sunyani West Constituency.[2] O meela ọtụtụ ọrụ iji kwalite mmepe ime obodo na Ghana, ọkachasị site na igwupụta nnu na dayamọnd. Otú ọ dị, ka ọ na-erule Mee 2009, e kwenyere na Adjei-Darko abụghịzi onye jị ọkwa mịnịsta.[3] Ọ rụkwara ọrụ dị mkpa n'ozi ụmụ nwanyị site n'ịhazi ụgbọala maka ụmụ agbọghọ na-abanye n'ọrụ. Ọbụna o jiri ego nke ya zụta ụgbọala maka ha.

Ntuli aka afọ 2000[dezie | dezie ebe o si]

A họpụtara Adjei-Darko na mbụ na onye omeiwu na ntuli aka Ghana nke afọ 2000.[4] Ya mere, ọ nọchitere anya mpaghara Sunyani West na ndị omeiwu nke atọ nke mba nke anọ nke Ghana.[4] A họpụtara ya na mgbe o nwere vootu pụkụ ịrị na anọ na narị asatọ na ịrị abụọ na atọ n'ime vootu pụkụ ịrị abụọ na asaa na narị asatọ na iri asatọ na isii ziri ezi.[4] Nke a bụ ihe ruru 53.2% ngụkọta vootu ziri ezi.[4] A họpụtara ya karịa Kwadwo Nyamekye-Marfo nke National Democratic Congress, Kwaku Twumasi-Ankrah nke Convention People's Party, Kyei-Mensah Monica nke National Reform Party, Patrick Obeng-Mensach onye nweere onwe ya na Wilberforce Nabita Amoah nke People's National Convention.[4] Ndị a nwetara 11,111 vootu, 650 vootu, 578 vootu, 487 vootu na 237 vootu n'otu n'ime ngụkọta vootu ziri ezi.[4] Ndị a bụ 39.8%, 2.3%, 2.1%, 1.7% na 0.8% n'otu n'otu nke ngụkọta vootu niile ziri ezi.[4] A họpụtara Adjei-Darko na tiketi nke New Patriotic Party.[4] Mpaghara ya bụ akụkụ nke oche ndị omeiwu iri na anọ n'ime oche iri abụọ na otu nke New Patriotic Party meriri na ntuli aka ahụ na mpaghara Brong Ahafo nke Ghana.[5][6] N'ozuzu, New Patriotic Party meriri ngụkọta nke narị ndị nnọchiteanya ndị omeiwu n'ime oche narị abụọ na ndị omeiwu nke atọ nke mba nke anọ nke Ghana.[6]

Ntuli aka afọ 2004[dezie | dezie ebe o si]

A họpụtara Adjei-Darko ọzọ dị ka onye omeiwu maka mpaghara Sunyani West na ntuli aka Ghana nke afọ 2008.[7][8] N'ụzọ dị otú a, ọ nọchitere anya ndị omeiwu na nke anọ nke mba Ghana nke anọ. A họpụtara ya na 20,350 vootu n'ime 38,188 vootu ziri ezi.[7][8] Nke a bụ 53.3% nke ngụkọta vootu ziri ezi.4,5 A họpụtara ya karịa Ahmed Boadan nke National Democratic Party, Gyabah Samuel nke Convention People's Party, King Kingsford Fordjour nke Democratic People's party, Obiri Francis onye nweere onwe ya.[7][8] Ndị a nwetara vootu 12,836, vootu 302, vootu 206 na vootu 4,494 n'otu n'otu site na ngụkọta vootu ziri ezi.[7][8] Ndị a bụ 33.6%, 0.8%, 0.5% na 11.8% n'otu n'otu nke ngụkọta vootu ziri ezi.[7][8] A họpụtara Adjei-Darko ọzọ na tiketi nke New Patriotic Party.[7][8] Mpaghara ya bụ akụkụ nke oche ndị omeiwu iri na anọ n'ime oche iri abụọ na anọ nke New Patriotic Party meriri na mpaghara Brong Ahafo nke Ghana na ntuli aka ahụ.[6][9] N'ozuzu, New Patriotic Party meriri ngụkọta nke ndị nnọchi anya ndị omeiwu 114 n'ime ngụkọta oche 230 na ndị omeiwu nke anọ nke mba Ghana nke anọ.[6]

Ndụ onwe ya[dezie | dezie ebe o si]

Adjei Darko bụ Onye Kraịst.[1]

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 (2004) Ghana Parliamentary Register, 2004-2008. The Office of Parliament, 95.  Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":0" defined multiple times with different content
  2. The Statesman Online. Archived from the original on 2011-09-30. Retrieved on 2009-12-11.
  3. These former ministers set for court. The Ghanaian Journal (May 18, 2009). Retrieved on December 11, 2009.
  4. 4.0 4.1 4.2 4.3 4.4 4.5 4.6 4.7 FM. Ghana Election 2000 Results - Sunyani West Constituency. Ghana Elections - Peace FM. Retrieved on 2020-08-02.
  5. FM. Ghana Election 2000 Results - Brong Ahafo Region. Ghana Elections - Peace FM. Retrieved on 2020-08-02.
  6. 6.0 6.1 6.2 6.3 Statistics of Presidential and Parliamentary Election Results (en-US). Fact Check Ghana (2016-08-10). Retrieved on 2020-08-02. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":2" defined multiple times with different content
  7. 7.0 7.1 7.2 7.3 7.4 7.5 FM. Ghana Election 2004 Results - Sunyani West Constituency. Ghana Elections - Peace FM. Retrieved on 2020-08-02.
  8. 8.0 8.1 8.2 8.3 8.4 8.5 (2005) Elections 2004; Ghana's Parliamentary and Presidential Elections. Ghana: Electoral Commission of Ghana; Friedrich Ebert Stiftung, 136. 
  9. FM. Ghana Election 2004 Results - Brong Ahafo Region. Ghana Elections - Peace FM. Retrieved on 2020-08-02.