Gaa na ọdịnaya

Mụnachị Nwankwọ

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Mụnachị Nwankwọ
mmádu
Ụlọ ọrụ mmepụta iheụlọ ọrụ ihe nkiri Dezie
Ụdịekerenwanyị Dezie
Mba o sịNaijiria Dezie
Aha n'asụsụ obodoMunachi Abii Dezie
Aha ọmụmụMunachi Abii Dezie
Aha enyereMuna Dezie
Aha pseudonymMuna Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya5 Novemba 1987 Dezie
Ebe ọmụmụPort Harcourt Dezie
Asụsụ obodoAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaEnglish, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, Nigerian Pidgin Dezie
Ụdị ọrụ yatheater arts, music Dezie
Ebe agụmakwụkwọBenson Idahosa University, Ụlọ Akwụkwọ Nwanyị Ndị Gọọmentị Ọchịchị, Abuloma Dezie
Oge ọrụ ya (mmalite)2005 Dezie
AgbụrụNdị Igbo Dezie
Okpukpere chi/echiche ụwaChristianity Dezie
Ngwa egwuolu egwụ Dezie
Ihe omume dị ịrịba amaMost Beautiful Girl in Nigeria Dezie
Ihe nriteBest of Nollywood Awards, Most Beautiful Girl in Nigeria Dezie
Sonyere35 Dezie
Munachi Gail Teresa Abii Nwankwo
MúrúPort Harcourt, Rivers State Nigeria
OrüOnye na agụ egwu

Munachi Abii (amụrụ Munachi Gail Teresa Abii Nwankwọ) bụ onye ala Naijiria na-agu egwu rap na egwu "hip-hop", ọ nakwa ede egwu. O merịkwara na ndọrọ ndọrọ nke onye kacha nma na afọ 2007. Ọ bụkwa onye ana-ahụ n'ihe onyonyo n'eme ọtụtụ ihe dị ịche ịche. Ọ bụkwa onye mara nma nke ana-ekịrị ekịrị. Ọ n'arụ ọrụ a n'aha nke Muna.

Mbido ndụ

[dezie | dezie ebe o si]

Amụrụ ya zụọkwa ya n'obodo Port Harcourt. Muna bu onye Owerri onye ezị n'ụlọ ya kwadoro k'osogido akara aka ya bu egwu and ihe osịse. Ọgụrụ ihe bekee kpọrọ International relations and Diplomacy na mahadum Benson Idahosa University mgbe omechara agụmagụ ya na secondịrị nke ndi Federal Government Girls College Abuloma.Templeeti:Cn

Ndọrọ ndọrọ ọkacha nma

[dezie | dezie ebe o si]
Muna mgbe ọna-eme nme nme icheta omụmụ ya na Miss World 2007 n'obodo China.

N'oge ọnọ na-afọ abụọ ya na mahadum n'afọ 2007, Muna merịrị na ndọrọ ndọrọ ọkacha nma n'ụmụ nwanyị nile n'obodo Naijiria.[1] N'ọnọdụ nke eze nwayi n'achị ọchịchị orịtara ka ogịrị ọkwado izisa ozị maka orịa Polio na Sickle cell,[2] ọnọchịtere anya ndị Naijịrịa n'obodo China n'oge ndọrọ ndọrọ okacha nma uwa nile n'afọ ahụ.[3] N'afọ 2009, Muna na onye nmerị nke MBGN nke afọ 2000 nke aha ya bụ Matilda Kerry rụkọtara ọrụ nke izisa ozị maka oria nke cervical cancer.[4]

Ọrụ ịgu egwu

[dezie | dezie ebe o si]

Tutu omerie na MBGN, Muna osorola ndị Specimen A nke Port Harcourt mee ihe ngosị dị ịche ịche,[5] sorokwa Terry da Rapman n'ihe ha kpọrọ My PH Girl. Iji kagbue ihe onye obula chere, Muna ebidoghị ọrụ egwu ya na ndi Ijaw Boyz n'agu egwu ntabi ire, n'agbanyeghi n'oso ha dika onye obịa gụọ egwu.[6] Dika onye n'agụ egwu ntabi ire nọrọ onwe ya, Muna agụọla egwu na Babyrella tutu ọgbanwe aha ya wee zawa Muna, na dika onye n'ede egwu Muna edeela ọtụtụ egwu nye ndi egwu ama ama dika J Martins na Waje, bụrụ onye ahụrụ n'ọtụtụ ihe onyonyo nke egwu di iche iche, ama ya ama n'egwu ndi P Square n'egwu ha kpọrọ "Ifunanya".

N'ọnwa Jun n'afọ 2010 mgbe Muna na ndị egwu ọzọ kwụsịrị ịrụkọrịta ọrụ, Muna na ụlọ ọrụ Ayo Shonaiya's nke RMG  banyere na nkwekọrịta ịrụ ọrụ nke ga-abụ ọtụtụ afọ [7] were bido ịrụpụta ọrụ efere egwu ya bu nke mbụ nke ọ kpọrọ The Goddess, The Hustler,[8][9] nke a ga-agunyekwa egwu ndi nke ọgụrụ na-ahịrị na-ahịrị aha ha bụ I Feel Real, ya na Killer Queen.[10][11] Muna gakwara n'ihu ya na ndi egwu ọzọ ndi iche iche bekee na-akpọ hip hop na rụrikọta ọrụ; na mbido afọ 2011, Muna dere egwu sorokwa gụọ ya bụ egwu nke onye egwu aha ya bụ Waje; egwu nke ama ama ọ kpọrọ So Inspired. Osokwa onye egwu ntabi ire aha ya bụ Suspect mee egwu ihe onyonyo ọkpọrọ I No Send You.[12]

Muna bụ otu n'ime ndi egwu ntabire umu nwanyị kwuchtara anya ndi obodo Naijiria n'ihe onyonyo ezịrị n'ụwa nile nke ndi BET Cypher[13] maka ihe ngosi nke BET Awards n'afọ 2011, nakwa onwa anọ nke afọ 2012, Muna wepụtara egwu abụọ ọgụrụ n'ahịrị n'ahịrị ọkpọrọ Here To Stay na nke ọzọ ọkpọkwara Down Down Low.[14]

Orụ ndị ọzọ

[dezie | dezie ebe o si]

N'afo 2011, Muna binyere aka na-akwụkwọ ndi Unilever ịkwado ahịa Lux ha dika onye ngosi. Ọ bụkwa onye n'ezipụta n'ihe onyonyo ire ahia Lux n'isonye nzọmukwu Patti Boulaye ya na Genevieve Nnaji.[15]

N'ọnwa anọ nke afọ 2011, oge ha kwadochara ihe onyonyo nke oso mee nke Michael Word ana-akpọ Pop Sugar, osokwara mee ihe onyonyo ana ezi ngbe obụla nke ndị Malta Guinness ana-akpọ Street Dance Africa.[citation needed] Muna n'otu aka ahụ sokwara mee ndọrọ ọkacha nma nke ụmụ nwoke nke ndi Naijiria n'afọ 2012, osokwara mee Nokia Don't Break The Beat[16] ndọrọ ndọrọ nke multi-city Rap Battle.

Ihe nrite na nhọpụta

[dezie | dezie ebe o si]
Year Award ceremony Category Film Result Ref
2020 Best of Nollywood Awards Best Kiss in a Movie Living in Bondage (Breaking Free) Ahọpụtara [17]

Ọba akwụkwọ

[dezie | dezie ebe o si]
  1. ↑ Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
  2. ↑ Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
  3. ↑ Munachi is crowned MBGN
  4. ↑ Handing over a relief, Says Munachi Abii
  5. ↑ Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
  6. ↑ Munachi on hip hop
  7. ↑ Linda Ikeji (27 June 2010). "Welcome to Linda Ikeji's Blog: Munachi Abii signs with RMG company". Lindaikeji.blogspot.co.uk. Retrieved 19 April 2014.
  8. ↑ Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
  9. ↑ Munachi Steps Up Music Career
  10. ↑ Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
  11. ↑ Killer Queen
  12. ↑ Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
  13. ↑ Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
  14. ↑ Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
  15. ↑ "BN Exclusive: Munachi as the new Face of LUX Soap – A Sneak Peek of the TV & Print Ads". Bella Naija. 12 May 2011. Retrieved 19 April 2014.
  16. ↑ Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
  17. ↑ Augoye, Jayne (2020-12-02). "2020 BON: Here are 5 nominees for 'Best Kiss' category" (in Bekee ndị United Kingdom). Retrieved 2021-10-11.