Makhadzi

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Makhadzi
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịSouth Africa Dezie
Aha ọmụmụNdivhudzannyi Ralivhona Dezie
aha pseudonymMakhadzi Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya20 Jụn 1996 Dezie
Ebe ọmụmụLimpopo Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaAsụsụ Zulu, Bekee, Venda Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye na-abụ abụ, odee egwu, Ọgba egwu Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2012 Dezie

Ndivhudzannyi Ralivhona, onye a maara aha ya dị ka Makhadzi, bụ onye South Africa na-agụ egwu. A mụrụ ya ma zụlite ya na Ha-Mashamba, Limpopo, ọrụ ya malitere mgbe ọ dị afọ iri na atọ, ọ nwetara nlebara anya obodo mgbe egwu ya "Tashanda Vhuya" pụtara n'afọ 2017. A maara ya nke ọma maka egwu ya "Themba muthu" na "Matorokisi".

Albọm Makhadzi bu Kokovha ghọrọ otu n'ime ihe nwetara ya nnukwu ihe ị gaa nke ọma ya ma ọ malitere na nke mbụ na nweputa yana chaatị Albọm iTunes nke South Africa. Albọm a nwere egwu kachasị elu "Amadoda", "Mphemphe", "Kokovha" na "Tshikwama".[1]

Mmalite ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Makhadzi n'otu obere obodo a na-akpọ Ha-Mashamba Tshivhangani, na mpụga Elim na mpaghara Limpopo. Mgbe nne na nna ya kewara, Ndivhudzannyi na ụmụnne ya abụọ sooro nne ha nọrọ. Ọ gụsịrị ọkwa nke iri na abụọ na Mukula Integrated School. Ndivhudzannyi nwetara nzere ya na Mmekọrịta Ọha ma ọ na-agu gbasara ejije ugbu a.[2][3][4][5][6]

Ọrụ egwu[dezie | dezie ebe o si]

Ọrụ ya malitere mgbe ọ dị afọ iri na abụọ, ọ na-arụ ọrụ na Taxi Rank ma n'enweta ego site na onyinye ndị mmadụ.[7] N'afọ 2019, Master KG gosipụtara Makhadzi na egwu akpọrọ "Tshikwama", nke ewepụtara na abọm Jerusalema .[8][9]

2019–2020: Kokovha[dezie | dezie ebe o si]

N'abalị iri na Isii nke ọnwa Ọktoba afọ 2020, ewepụtara Makhadzi studio album Kokovha na South Africa.[10] Albọm ahụ gosiputara Mayten, Mampintsha, Prince Benza, Mr Brown, Gigi Lamayne, Jah Prayzah, Team Mosha, Moonchild Sanelly, FB, Charma Girl na Sho Madjozi.[11] Ka ọ na-erule n'ọnwa Ọgọstụ afọ 2021, a kpọpụtars albọm ya dị ka nke kachasị na ngosipụta nke Apple Music.[12] A kwadoro albọm ahụ si n'iji akara ọla edo.[13]

N'abalị ise nke ọnwa Eprel afọ 2021, Makhadzi wepụtara otu egwu "Mjolo" nke gosipụtara Mlindo the Vocalist.[14][15] Egwu a ruru nọmba iri abụọ na asatọ na chaatị iTunes nke South Africa.[16]

N'abalị asaa nke ọnwa Julaị, ewepụtara egwu ya "Ghanama" nke gosipụtara Prince Benza, na King Monada.[17] E mere ka abụ ahụ bụrụ platinum na South Africa.[18]

N'abalị iri na isii nke ọnwa Ọgọstụ, ọ kwụrụ gbasara albọm ya bụ African Queen na ụbọchị nwepụta ya na Twitter ya.[19] N'otu ọnwa ahụ, o weputara egwu ya "Tchukutsha" nke gosipụtara Lady Du N'abalị asaa nke ọnwa Ọgọstụ afọ 2021.[20]

N'abalị Isii nke ọnwa Ọgọstụ , Kabza De Small na Makhadzi wepụtara otu egwu "Salungano" na YouTube, nke ewepụtara n'abalị abụọ nke ọnwa Septemba afọ 2021.[21]

E wepụtara albọm studio ya bụ African Queen, N'abalị atọ Septemba 2021.[22] Abọm ahụ nwere Cassper Nyovest, Kabza De Small na Lady Du.[23]

Na emume nke isii nke All Africa Music Awards, ọ natara nhọpụta maka Best Female Artist na South Africa.[24]

E wepụtara egwu ya Pain Ya Jealous n'abalị iri atọ na otu nke ọnwa Machị afọ 2022. E mere ka EP ahụ bụrụ ọla edo na South Africa.[25]

Ntinyeaka n'azụmahịa[dezie | dezie ebe o si]

N'ọnwa Disemba afọ 2021, Makhadzi malitere akara azụmahịa nke Kokovha na njikota ya na Kicks Sportwear na Mall of Africa.[26]

N'ọnwa Machị afọ 2022, ọ malitere ụde ahụ ya bụ Mavoda.[27]

Discografị[dezie | dezie ebe o si]

Albọm Studio[dezie | dezie ebe o si]

  • Shumela Venda (2018)
  • Matorokisi (2019)
  • Kokovha (2020)
  • African Queen (2021)
  • Pain Ya Jealous (2022)

Televishonu[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2018, a kwadoro Makhadzi na Yo TV maka ihe nkiri telivishọn mbụ ya.[28] Kemgbe ahụ, a gbala ya ajụjụ ọnụ na ụlọ ọrụ redio dị iche iche, gụnyere Munghana Lonene FM, Phalaphala FM, Nzhelele FM, Makhado FM, Sloot FM, na Capricon FM, ebe o kwuru banyere egwu ya, ndụ ya na ihe isi ike ya.[29] Ọ pụtakwara na The Morning Show na ETV . Makhadzi bụ otu n'ime ndị na-eme ihe nkiri na 2020 DSTV Mzansi Viewers Choice Awards . E toro arụmọrụ ya dị ka otu n'ime arụmọrụ kachasị mma n'abalị ahụ na soshal midia.[30]

Ihe nrite na nhọpụta[dezie | dezie ebe o si]

Afọ Ihe nrite Category Nsonaazụ Ref.
2017 LMAC Best Tshivenda hit Merie [31][32][2][33]
2018 Ihe nrite TSHIMA Best Tshivenda Dance Artist/Album of the Year Ahọpụtara [34][35]
Nwanyị na-ese ihe nke afọ Ahọpụtara
Abụ Tshivenda nke Afọ Ahọpụtara
Best Tshivenda Artist of the Year Ahọpụtara
2021 Mzansi Kwaito & House Music Awards Vidio egwu kacha mma Ahọpụtara [36]
2021 AFRIMA Best Artist, Duo ma ọ bụ Group Merie [37]
2022 Nickelodeon Kids' Choice Awards Star Africa kachasị amasị Merie [38]
2022 Mzansi Viewers Choice Awards Onye Mmasị Àtụ:Pending [39]
Onye egwu kachasị amasị / Group Àtụ:Pending
Abụ kachasị amasị Àtụ:Pending

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Kokovha – Makhadzi | Top Charts. Top Charts.
  2. 2.0 2.1 Songbird Makhadzi promises fireworks at Royal Heritage Festival in Venda. SowetanLIVE.
  3. Leng (7 October 2019). Viral #MatorokisiChallenge sends SA into a frenzy with dance videos. Briefly.
  4. Makhadzi Biography, Songs, Albums, Awards, Education, Net Worth, Age & Relationships » (en-US). Ubetoo (4 February 2020). Retrieved on 5 February 2021.
  5. Nkosi. Makhadzi biography, age, profile, awards & background | The Nation (en-US). Archived from the original on 27 January 2021. Retrieved on 5 February 2021.
  6. Mueni (9 January 2020). Makhadzi alleges not being paid by her manager: full story (en). Briefly. Retrieved on 5 February 2021.
  7. Kekana (1 September 2020). Makhadzi on her hectic past, being exploited and singing at taxi ranks. Times LIVE.
  8. Zoutnet | News | Makhadzi shines at Tshimas. www.zoutnet.co.za.
  9. Queen of Limpopo dance dance music Makhadzi has come a long way.... Sowetan LIVE (26 June 2020).
  10. Mbhele (16 October 2020). #Makhadzi is trending for her album 'Kokovha', here's why | The Citizen. The Citizen.
  11. Israel (15 October 2020). Makhadzi Drops "Kokovha" Album. Ubetoo.
  12. Jabulani (4 August 2021). Makhadzi's 'Kokovha' Is The Most Streamed Mzansi Female Album On Apple Music » Ubetoo. Ubetoo.
  13. Ramela. "It’s a sweet September for Makhadzi as album gets gold status", Eye Witness News, 30 September 2021. (in en)
  14. Makhadzi collaborates with Mlindo The Vocalist on Mjolo. Just Nje (8 April 2021). Archived from the original on 9 July 2021. Retrieved on 12 June 2022.
  15. Lwandle (5 April 2021). Ooh Lala: Makhadzi Drops 'Mjolo' with Mlindo the Vocalist. Briefly.
  16. iTunes South Africa Top 100 Songs. Popvortex.
  17. Mike (8 July 2021). Makhadzi ft Prince Benza Ghanama. ZAPlaylist. Archived from the original on 25 July 2021. Retrieved on 8 July 2021.
  18. Gaanakgomo (2021-12-13). Double win for Makhadzi as 'Ghanama' goes platinum & 'Kokovah' sneaker is finally launched. TimesLIVE. Retrieved on 2022-05-13.
  19. Makhadzi Reveals Release Date Of Her Upcoming Album. South Africa Magazine (16 August 2021). Archived from the original on 7 March 2022. Retrieved on 12 June 2022.
  20. de Wee (27 August 2021). Girl power! Makhadzi and Lady Du release 'Tchukutsha' [listen]. The South African.
  21. Kabza De Small and Makhadzi tease collaboration with Salungano and Connections – JustNje. JustNje (10 August 2021). Archived from the original on 3 September 2021. Retrieved on 12 June 2022.
  22. Makhadzi drops much-awaited album 'African Queen' (3 September 2021).
  23. Mbhele (3 September 2021). New music Friday: Makhadzi is indeed an 'African Queen' | The Citizen. The Citizen.
  24. Hansen. All Africa Music Awards 2021: All the nominees | Music In Africa. Music In Africa. Retrieved on 23 September 2021.
  25. Mathobela (2022-06-07). Makhadzi’s EP reaches gold status! | Dailysun. Dailysun. Retrieved on 2022-06-07.
  26. Zulu (2021-12-10). Mkhadzi launches her new sneaker Kokovha. SundayWorld. Retrieved on 2022-05-15.
  27. Mphande (2022-03-03). Makhadzi reveals her next business venture to launch a body lotion. TimesLIVE. Retrieved on 2022-05-13.
  28. Makhadzi grabs most nominations for Tshima awards. SowetanLIVE.
  29. Zoutnet | Entertainment | Tshima 2019 – All the nominees. www.zoutnet.co.za.
  30. Makhadzi's performance at #DSTVMVCA 'best for the night'. ebnewsdaily.co.za (1 March 2020). Archived from the original on 23 September 2021. Retrieved on 2 June 2020.
  31. Queen of Afropop's Zwigevhenga is a masterpiece. Zoutnet.
  32. Makhadzi wows music lovers in France. Zoutnet.
  33. Makhadzi wins yet another award. Zoutnet. Retrieved on 18 November 2017.
  34. Wedding singer Makhadzi bags four TSHIMAs. Zoutnet.
  35. Royal gospel and heritage festival launched. Zoutnet.
  36. Shumba (18 June 2021). Mzansi Kwaito and House Music Awards 2021: All the nominees. Music In Africa.
  37. Nteyi (2021-11-22). Makhadzi Wins Big Award!. Daily SUN. Retrieved on 2021-11-25.
  38. Shumba (2022-03-23). African artists nominated for Nickelodeon Kids’ Choice Awards | Music In Africa. Music In Africa. Retrieved on 2022-03-25.
  39. Ferreira. "DStv Mzansi Viewers' Choice Awards: The 2022 nominees", Channel, 2022-04-13. Retrieved on 2022-04-14.