Marc Bouwer

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Marc Bouwer
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịSouth Africa Dezie
Aha enyereMarc Dezie
Ebe ọmụmụSouth Africa Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye mmebe ejiji Dezie

Marc Bouwer bụ onye South Africa ma bụrụ onye na-emepụta ejiji na New York City.

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Na mmeri o meriri na South African Vogue Young Designers Award, Marc Bouwer kwagara New York City. N'oge na-adịghị anya nke a gasịrị, onye na-emepụta ihe bụ Halston hụrụ pọtụfoliyo Bouwer. Bouwer kuziri Halston ọrụ, ma kpalie nkà ya, ọkachasị nka mpịají. "Obube akwa' Bouwer na ntunye ichu n'ụdị akwa ọbara ọhụrụ n'adọ adọ,dịka Jesi na spandes, dị ka ejiji mgbede ka enyere aha dị ka "bathing suit gown" ma tụgharịa bụrụ "athletic glamour".[1] Mmeghe ụlọ n'afọ 1990 ya na onye mmekọ azụmahịa, Paul Margolin, Marc Bouwer Couture ekesala na mkpuchi na peeji nke mbipụta gụnyere Harper's Bazaar, Cosmopolitan, Vanity Fair, Glamour, na InStyle. Onye na-eme ihe nkiri Angelina Jolie biara n'afọ 2004 Academy Awards ma yiri uwe ọcha satin Marc Bouwer, nke André Leon Talley mechara kpọọ otu n'ime uwe Oscar kachasị mma n'oge niile.[2] N'ọnwa Febụwarị afọ 2012, Patti Stanger bụ otu n'ime otu ndị ama ama nke yi uwe n'acha uhie uhie nwere ga ije nsere ụkwụ nke ọgbako ihe ngosi nke'Heart Truth Red Dress Collection show, nsonye nke New York Fashion Week. Patti yi uwe uhie ọbụna abụọ nke Marc Bouwer .[3] N'oge na-adịbeghị anya, Bouwer nyere aka mee ka anyị hụrụ onye ahịa ya na enyi ya,bụ Shania Twain, ma n'edozi uwe maka njem Still The One Tour ya nke mepere N'abalị mbụ nke ọnwa Disemba afọ 2012 na Caesars Palace.[4][5]

Bouwer bụ onye mmepụta ejiji America mbụ na-emepụta ihe ngosi ejiji na nzaghachi maka mgba akụ na ụba n'ụwa niile yana gburugburu ebe obibi. N'emezughi igosi anyi ihe ejiji na Bryant Park, Bouwer gosiputara nke a, na nchịkọta mmalite ya Spring / Summer 2009, na weebụ.[6] nke Ọ bụghị naanị na ejiji ọhụrụ a nyere ndị enyi na ndị ahịa ohere ịnweta nghọta ọhụrụ a ma ọ bụrụ na ha enweghị ike ịga ihe ngosi, kamakwa o meghekwara ka ihe ngosi a pụta ihe n'ụlọ ọrụ na ụlọ nke ndị na-emepụta ejiji, ndị na-azụ ahịa, ndị nta akụkọ, na ndị na-emepụta ejiji n'ebe niile. Bouwer chere na ọ bụ ntinye yana "ọrụ mmekọrịta mmadụ na ibe ya na gburugburu ebe obibi" ya iji mepee ụzọ maka mmegharị dị otú ahụ "na-ebelata mmetụta na mkpofu".[7] Bouwer gosipụtara nchịkọta Fall 2010 ya n'abụghị n'ihe, nke Candice Swanepoel gosipụtara, tupu ọ gaa n'ihu na nchoputa ya. N'ọnwa Febụwarị afọ 2011 Bouwer bụ onye mbụ na-emepụta ihe ngosi ejiji 3D na nchịkọta Fall 2011 ya nke gosipụtara onye nlereanya Selita Ebanks.[8]

Ihe nrite Bouwer maka izere ngwaahịa anụmanụ n'ụdị ejiji ya gụnyere PETA Humanitarian Award, na United States Humane Societies “Compassion in Fashion Award'. Marc na-eji nkà na ụzụ emepụta ihe, iji mepụta ejiji nna anaghị egosi obi ọjọọ na iji faux furs dị elu, ma n'enweta ọtụtụ nkwado nke PETA.[9]

Ngosipụta telivishọn[dezie | dezie ebe o si]

Aha Ọrụ Ihe edeturu Afọ
Ọbara Acha anụnụ anụnụ Ya onwe ya Oge 1, Nkebi nke 19 2011
Project Runway Onyeikpe ọbịa Oge 6, Nkebi nke 4 2009
Ebony Fashion Fair: Afọ iri ise nke Style Ya onwe ya Ihe nkiri TV 2008
Abụ m anụmanụ: Akụkọ Ingrid Newkirk na PETA Ya onwe ya Ihe nkiri 2007
Miss Universe 2007 Onyeikpe TV Pụrụ Iche 2007
CMT: The Greatest- 20 Sexiest Videos of 2006 Ya onwe ya TV Pụrụ Iche 2006
The Apprentice U.S. Onye Mmepụta Otu Oge 5, Nkebi nke 13 2006
CMT: Oge kachasị mma: Shania Twain Ya onwe ya TV Pụrụ Iche 2006
Paris Hilton: Ọ bụghị nke dị mfe Ya onwe ya Ihe nkiri TV 2005
America's Next Top Model Onye Mmepụta, Go-See Challenge Usoro 3, Nkebi nke 7 2004
Miss Universe 2001 Onyeikpe TV Pụrụ Iche 2001

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Marc Bouwer Biography. Archived from the original on 14 June 2011. Retrieved on 12 January 2013.
  2. Archived copy. Archived from the original on 2013-02-24. Retrieved on 2013-01-17.
  3. Stars Hit the Runway for Heart Health. Shape.com (10 February 2012). Archived from the original on 14 February 2012. Retrieved on 10 February 2012.
  4. Stevenson. "The Man Behind Shania Twain's Vegas Look", Toronto Sun, 30 November 2012. Retrieved on 12 January 2013.
  5. Billboard. "< Shania Twain Kicks Off Vegas Run With First Show in 8 Years", Billboard Magazine, 2 December 2012. Retrieved on 12 January 2013.
  6. Marc Bouwer Spring 2009 New York Fashion Week. Firstpost.com. Retrieved on 12 January 2013.
  7. Archived copy. Archived from the original on 2011-06-14. Retrieved on 2013-01-12.
  8. Rubaum-Keller. "Marc Bouwer: The First Ever 3D Fashion Show at Fashion Week", Huffingtonpost.com, 8 February 2011. Retrieved on 12 January 2013.
  9. Archived copy. Archived from the original on 2011-10-25. Retrieved on 2012-02-10.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]