Margaret Ladipo

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Margaret Kudirat Ladipo (a mụrụ n'abali iri-na isii n’onwa Eprel nke afọ 1961) bu onye akwukwo na onye nchoputa nke Naijiria nke jere ozi dika Rektọ nke Yaba College of Technology site n’afọ 2009 rue n'afọ 2017. [1]

Mmalite ndu na mmuta[dezie | dezie ebe o si]

Margaret bụ onye Kwara steeti ma a mụrụru ya na Kaduna, dị na Kaduna State, nke Naijirịa. Ọ gụsịrị agụmakwụkwọ ụlọ akwụkwọ praịmarị na nke ụlọ akwụkwọ sekọndrị na Anglican Girls School, Kaduna na Government Secondary School, Kaduna n'otu n'otu. [2]

Margaret nwere asambodo B.Sc na kemistri, asambodo M.Sc na Polima Sayensị na Tekịnụzụ yana Ph.D na nyocha kemistri na Mahadum Ahmadu Bello . [2]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Ọrụ Margaret Ladipo hụrụ na mgbe mbụ ọ nwetara ọrụ dị ka onye enyemaka gụsịrị akwụkwọ na Mahadum Ahmadu Bello n'afọ 1982 tupu ọ gawa ọrụ dị ka Lecturer III na Kaduna Polytechnic n'afọ 1984. [3] N’afọ 1986, ọ banyere na Yaba College of Technology dịka Lecturer II ebe ọ gbagoro n’ọkwa were bụrụ onye isi ndi nkuzi n’afọ 2002. Tupu a họpụta ya dị ka Rektọ, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye njụ ụlọ ọrụ kọleji hụ. [3]

Margaret e deela akwụkwọ abụọ ma bipụta ọtụtụ ederede na akwụkwọ akụkọ mpaghara obodo na mba ụwa. Ọ bụ onye otu Institute of Operations Research nke Naijirịa, Civil Institute of Democratic Administration na Institute of Investment Management and Research. [3]

Ihe ojo[dezie | dezie ebe o si]

N'ime ọchịchị ya, e boro Margaret ebubo "i zo ego" na "i zu ego" nke e wepụtara maka mwulite Yaba College of Technology. [4] [5]

Ebemsidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. "Teacher’s education our top priority – Yabatech Rector", Vanguard Newspaper, 21 January 2016. Retrieved on 24 May 2016.
  2. 2.0 2.1 LAGOS CHAPTER (YABATECH). Archived from the original on 23 June 2016. Retrieved on 24 May 2016.
  3. 3.0 3.1 3.2 Yaba College of Technology gets a New Rector. Archived from the original on 21 April 2016. Retrieved on 24 May 2016.
  4. Nicholas Ibekwe. "Exclusive: Yabatech Rector in multi-million Naira fraud", Premium Times, 6 May 2013. Retrieved on 24 May 2016.
  5. "Millions Looted From Treasury Of Yaba College of Technology", Sahara Reporters, 25 February 2014. Retrieved on 24 May 2016.