Mariam Ibekwe

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Àtụ:MedalTableTop Mariam Ibekwe (onye aha ọmụmụ ya bụ Nnodu ; amụrụ ụbochị iri abuo na iteghete, nke onwa Ọktoba, n'afọ 1969) bụ onye Naịjịrịa n'eme egwuregwu trak na fịud, ma sọkwa mpị na shọt puutu. Mpụtara nke onwe ya kachasị mma nke 16.68 m (54 ft 8+12 in) n'afọ 2007[1]Ibekwe nwetara ihe nrite mbụ ya na mba ụwa n'afọ 1989, were nweta ntụrụugo na West African University Games nakwa ihe nrita ọlaọcha n'azu Hanan Ahmed Khaled n'asọmpi 1989 African Championships in Athletics, nke e mere na Legọsụ . [2] [3]

Na 1991 All-Africa Games, Ọ nọkwa n'azụ Khaled nke mba Ijipụtụ, ebe ọ gbara onye nke atọ na ya bu asọmpi.[4]


Ọ gara ezumike asọmpi mba ụwa n'etiti afọ ndi sochiri afọ 1990, mana ọ laghachitere n'afọ 1997 ebe o nwetara mmeri n'asọmpi West African Athletics Championships ma gbakwaa onye nke asatọ na 1998 IAAF World Cup.[5]Ọ gara n'ihu n'asọrịta mpi ka ọ gbachara afo iri atọ, ma sorokwa na ndi ikpeazu na 2003 All-Africa Games nakwa 2003 Afro-Asian Games . Elu ọrụ ya kacha gbagote mgbe o ruru afọ iri anọ, mgbe o tuuru ugo ma nata ihe nrite ọla edo n'asọmpi shot puutu na 2010 African Championships in Athletics.[6] Na ngosipụta ukwu ikpeazụ ya na mba ụwa, ọ gbara onye nke asaa na 2010 IAAF Continental CupI [7]


N'ọkwa mba, o nwetara nturụugo atọ kwụ ọtọ n'asọmpi Nigerian Athletics Championships n'etiti afọ 1989 na 1991, were bụrụ nwanyị mbụ tụbara ihe karịrị mita iri na anọ n'asọmpi ahụ. Ọ dara n'azụ Vivian Chukwuemeka n'ọkwa mba n'etiti afọ ndi sochiri afọ 1990, mana o jiri nturụugo mba abụọ laghachi n'afọ 1997 na 1998, yana ndetu mmeri nke 15.54 m (50 ft 11+¾ in) na 16.42 m (53 ft 10+¼ in). Chukwuemeka nwetara nturụugo asaa na -esote ya, ma Ibekwe nwetara nwetara nturụugo mba nke isii ya n'afọ 2006. [8]

Asọmpi mba uwa[dezie | dezie ebe o si]

1989 West African University Games Ouagadougou, Burkina Faso 1st Shot put 13.08 m
African Championships Lagos, Nigeria 2nd Shot put 14.02 m
1991 All-Africa Games Cairo, Egypt 3rd Shot put 14.66 m
1997 West African Athletics Championships Cotonou, Benin 1st Shot put 15.47 m
1998 World Cup Johannesburg, South Africa 8th Shot put 15.60 m
2003 All-Africa Games Abuja, Nigeria 4th Shot put 15.17 m
Afro-Asian Games Hyderabad, India 6th Shot put 14.78 m
2010 African Championships Nairobi, Kenya 1st Shot put 13.67 m
Continental Cup Split, Croatia 7th Shot put 13.67 m

Nturụugo mba[dezie | dezie ebe o si]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Ndepụta ndị mmeri nke asọmpi Afrịka n'egwuregwu

Ebemsidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Mariam Nnodu-Ibekwe. All-Athletics. Retrieved on 2016-08-07.
  2. West African University Games. GBR Athletics. Retrieved on 2016-08-07.
  3. African Championships. GBR Athletics. Retrieved on 2016-08-07.
  4. All-Africa Games. GBR Athletics. Retrieved on 2016-08-07.
  5. West African Championships. GBR Athletics. Retrieved on 2016-08-07.
  6. Kenya overtakes Nigeria, Uganda grabs first gold as African Championships ends in Nairobi. Athletics Africa. Retrieved on 2016-08-07.
  7. Mariam Nnodu-Ibekwe. IAAF. Retrieved on 2016-08-07.
  8. Nigerian Championships. GBR Athletics. Retrieved on 2016-08-07.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

  • Mariam Ibekwe at World Athletics