Mary Slessor
ụdịekere | nwanyị ![]() |
---|---|
mba o sị | United Kingdom of Great Britain and Ireland ![]() |
aha enyere | Mary ![]() |
aha ezinụlọ ya | Slessor ![]() |
ụbọchị ọmụmụ ya | 2 Disemba 1848 ![]() |
Ebe ọmụmụ | Aberdeen ![]() |
Ụbọchị ọnwụ ya | 13 Jenụwarị 1915 ![]() |
Ebe ọ nwụrụ | Calabar ![]() |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | English ![]() |
ọrụ ọ na-arụ | missionary, explorer ![]() |
okpukpere chi/echiche ụwa | Presbyterianism ![]() |
Mary Mitchell Slessor (Ụbọchi nke abụọ Ọnwa iri na abụọ 1848 – ụbọchi iri na atọ Ọnwa nke mbụ 1915) Ọ bụ onye ala a n'akpọ Scotland ezitere igbasa oziọma n'ala Nigeria. Maka aka ọrụ ya na ngbasike ya mere ndi obodo ji nabata ma tụkwasa ya obi na oziọma ọ na agbasa, nchebe ụmụaka na nkwado ụmụnwanyi. Ihe eji mara ya bụ nkwụsi ogbụgbụ ejima na obodo a n'akpọ Efik na Nigeria.[1]

Mary Slessọr, a mụrụ ya na ụbọchi nke abụọ, Ọnwa iri na abụo na afọ 1848 na obodo a n'akpọ Gilcomston, Aberdeen, nọ na Scotland, na-ezin'ụlọ ndi ogbenye. Ọ bụ nwa nke abụọ n'ime ụmụ asaa a mụrụ n'ụlọ Rọbeti na Mary Slessọ. Papa ya bụ onye obodo Buchan, aka ọrụ ya bụ Ọkwa akpu-ụkwụ. Na afọ 1859, ezin'ụlọ ya kwalara obodo Dundee ichọ ọrụ. Robeti Slessọ bụ onye aṅuruma, nke a mere omeghi nke ọma na ikwa akpụ-ụkwụ, owe bido orụ a n'akpọ lebọra na nkụme igwe nri. Mama ya n'akpa akwa, ọ na eso kwa di ya na arụ ọrụ na nkụme igwe nri. Mgbe ọ gbara afọ iri na otu, Mary Slessọ bidoro oru ọ na arụ na oge nkeji abụọ na ebe nkụme igwe nri a n'akpọ "Baxter Brothers' Mill" nke a pụtara na ọgacha ụlọ akwụkwọ ndi nwe "Baxter Brothers' Mill" tinyere ya, ọge ya fọrọ nụ, ọ na eji ya arụ na nkụme igwe nri a.
References
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Mary Slessor. Archived from the original on 2017-06-05. Retrieved on 2017-05-25.
- ↑ White, Donna (29 August 2010). Red-hot designers hail Scots missionary for inspiring African style. The Daily Record. Retrieved on 2011-09-06.
- ↑ Proctor, JH. Serving God and the Empire: Mary Slessor in South-Eastern Nigeria, 1876–1915. Brill, 45–61.