Meritaten Tasherit

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Meritaten Tasherit, nke pụtara Meritaten nke Nta bụ Adaeze Ijiptu oge ochie nke usoro eze nke iri na asatọ . O yikarịrị ka ọ bụ ada Meritaten, ada Fero Akhenaten .

Onye nna ya bụ ka bụ okwu arumuka.Ọtụtụ na-eche na ọ bụ nna Meritaten, Akhenaten, ma ọ bụ ikekwe di nalu ya Smenkhkare. Ebe ọ bụ na ma Meritaten Tasherit na Adaeze ọzọ, Ankhesenpaaten Tasherit na-apụta naanị n'ihe odide ndị kpọtụrụ nwunye nke abụọ Akhenaten aha Kiya, ọ ga-ekwe omume na ha bụ ụmụ Akhenaten na Kiya, ma ọ bụ na ha bụ akụkọ ifo, na-anọchi aha nwa ya nwanyị Kiya, onye nwere ike ịbụ Beketaten, nke a na-eche na ọ bụ nwa Tiye.[1]

A maghị ọdịn'ihu Meritaten Tasherit. Nkwupụta nke chi Atọn n'aha ya na-egosi na ọ bụ n'ezie nwa nwanyị Akhenaten, ebe ọ bụ na ndị nọchiri ya laghachiri na mgbanwe okpukpe ya, ma laghachi n'ofufe nke chi ọdịnala Ijiptu. E wepụrụ aha Aten n'iji ya eme ihe n'oge ahu.

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Gabolde (17 February 2011). The End of the Amarna Period. BBC. Retrieved on 7 November 2020.
  • Eyma, Aayko ed., A Delta-Man in Yebu: Na ndaputa Oge nke Egyptologists' Electronic Forum No. 1, Universal-Publishers.com 2003, p. 54