Ndidi Nwosu
Ọdịdị
Ndidi Nwosu
| Ụdịekere | nwanyị |
|---|---|
| Mba o sị | Naijiria |
| Ụbọchị ọmụmụ ya | 6 Jụn 1979 |
| Ụbọchị ọnwụ ya | 1 Maachị 2020 |
| Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | English, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin Naịjirịa |
| Ọrụ ọ na-arụ | powerlifter |
| Ụdị egwuregwu | weightlifting |
| So na | 2017 World Para Powerlifting Championships, powerlifting at the 2016 Summer Paralympics – women's 73 kg, powerlifting at the 2018 Commonwealth Games – women's heavyweight |
Ndidi Nwosu (Ụbọchị 6 n'ọnwa Juun afọ 1979 - Ụbọchị 1 n'ọnwa Maachị afọ 2020) bụ onye Naịjirịa na-eme egwuregwu i bu igwe dị arọ, nwere mmeri mkpalite na 2016 Summer Paralympics . [1] O buliri kilogram 140. [2] Ndidi ghọrọ onye ọkachamara i bu igwe dị arọ n'afọ 2008. Ọ ritere ọla edo na Rio Paralympic Games n'afọ 2016. O nwetakwara ọla edo na asọmpị Commonwealth nke afọ 2018 nke e mere n'Ọstụrelia. O merụru ahụ n'asọmpi Commonwealth nke afọ 2018. Ihe mmerụ ahụ metụtara ọkpụkpụ azụ ya ma mee ya ịwa ahụ dị iche iche n'Owerri, Imo Steeti, Naịjiria. Mgbe ịwa ahụ ndị a gasịrị, ọ bụghịkwa onwe ya ọzọ, nakwa enweghị ike i sonye n'asọmpi ndị sochirinụ. [3]
Ebemsidee
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Paralympic.org
- ↑ Nigeria Today for 18 September 2016. Archived from the original on 19 September 2016. Retrieved on 18 September 2016.
- ↑ https://www.premiumtimesng.com/sports/nigeria-sports-news/385253-nigerian-paralympic-gold-medalist-ndidi-nwosu-is-dead.html