Gaa na ọdịnaya

Ngewo

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Ngewo (Ngewɔ na Mende) bụ chi dịkachasịrị elu nke ndị Menda si Sierra Leone.[1][2]

Ngosịpụta

[dezie | dezie ebe o si]

Ngewo bụ chi e jikọtara ọnụ site na chi nwoke Ngewa na chi nwanyị Leve, onye bu Ngew ụzọ dị ka chi kachasị elu nke ndị Mende na-asọpụrụ. A na-efe chi abụọ a ofufe ugbu a n'okpuru Ngewo, ebe a na'ewere Leve dịka nwunye ya. Ngewo bụ chi eluigwe, nke na-ahụ maka ịmepụta eluigwe na ala, ọ bụkwa ya ga-ekpebi ihe ndị sitere n'okike n"ụwa.[1][2] A na-egosikarị ya dị ka chi dị anya, onye na'echebaraghị onwe ya echiche na njem kwa ụbọchị nke ndị na -enye ya ofufe.[2][3][4] Otú ọ dị, n'akụkọ ifo ụfọdụ, Ngewo na-ata ndị chefuru ikpe ekpere nye ya ahụhụ nakwa ndị na'adịghị enye ya ụtụ.[1] Ọ na-agwa ndị Mende okwu site n'enyemaka ndị nna nna ha, dyinyinga, ndị na-achọkwa onyinye nri ụfọdụ.[2]

Akụkọ ifo

[dezie | dezie ebe o si]

Okike nke mmadụ mbụ

[dezie | dezie ebe o si]

Ngewo biri naanị ya n'ụwa n'ọgbà. Otu ụbọchị, ọ chọrọ mkpakọrịta, ya mere ọ malitere ịmepụta ụmụ anụmanụ, n'etiti ụmụ nwanyị na ụmụ nwoke. N'ikpeazụ, o kere nwoke mbụ na nwanyị mbụ. Ngewo nyere ihe okike ya nnwere onwe ịjụ ya ihe ọ bụla, nke megidere mgbe oge ụfọdụ gasịrị. Arịrịọ ha juru ya anya wee laghachi n'eluigwe, ebe o biri kemgbe ahụ.[1][5]

Mmalite nke ọnwụ

[dezie | dezie ebe o si]

Ngewo nyere ozi abụọ nke ndị Mende ga-anata ma gwa ụmụ anụmanụ abụọ, awọ na nkịta, ka ha zipụ ozi ndị a n'ụwa. E nyere nkịta ahụ ọrụ ịgwa ụmụ mmadụ na ha agaghị anwụ anwụ, ebe awọ ga-eweta ozi na-ebu amụma ọnwụ ndị mmadụ. N'ụzọ dị mwute, awọ ahụ bu ụzọ rute, ebe ọ bụ na nkịta ahụ nwetara ihe mmegharị anya. N'ihi ya, ọnwụ ghọrọ akara aka ụmụ mmadụ.[1][5]

  • Ndepụta nke akụkọ ifo Afrịka

Edemsibịa

[dezie | dezie ebe o si]
  1. 1 2 3 4 5 Lynch, Patricia Ann (2010). African Mythology, A to Z (in Bekee). Infobase Publishing. ISBN 978-1-4381-3133-7.
  2. 1 2 3 4 "Ngewo". Oxford Reference (in Bekee). Retrieved 2021-02-22.
  3. ↑ "Ngewo | deity". Encyclopedia Britannica (in Bekee). Retrieved 2021-02-22.
  4. ↑ "NGEWO - the Mende God of Creation (African mythology)". Godchecker - Your Guide to the Gods. Retrieved 2021-02-22.
  5. 1 2 "Ngewo, Lonely, Creates a Man and a Woman". Oxford Reference (in Bekee). Retrieved 2021-02-22.