Nike Oshinowo

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Nike Oshinowo
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereNike Dezie
aha ezinụlọ yaOshinowo Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1966 Dezie
Ebe ọmụmụIbadan Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Yoruba Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Yoruba Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ọchụ̀nta ego, socialite, model, onye asọmpi ịma mma Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Essex Dezie
mmeriMost Beautiful Girl in Nigeria Dezie

Nike Oshinowo (onye amụrụ Adenike Asabi Oshinowo na 1966)[1][2][3] bụ onye si Naijiria na-eme ekwurekwu na igwe onyoyo, onye ọchụnta ego na onye na-ahazi (mgbe ochie) asọmpi nwaanyị mara mma karia.[4]

Mmalite ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A zulitere Oshinowo na Ibadan na England, ebe ọ gara ụlọ akwụkwọ obibi. Agbanyeghị na ọ bubu n'uche ịbụ onye na-arụ ọrụ niime ụgbọelụ ma ọ bụ dọkịta, ọ gụrụ mmuta ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Mahadum Essex. Ka o nwetara akara ugo mmụta, onye bụbu Miss Nigeria, Helen Prest-Davies, zulitere Oshinowo, maka inọchite anya ndị Rivers na asọmpi Most Beautiful Girl in Nigeria wee bụrụ onye mbụ Yoruba meriri ya. (ọ chịrị site na 1990 ruo 1991) [5] Mmeri ya dọtara esemokwu sitere na ndị na-enene na ndị nta akụkọ na-eso asịrị na a rụrụ asọmpi ahụ arụ maka ya. Ka ọ na-erule n’ọgwụgwụ ọchịchị ya, Oshinowo, na mkparịta ụka ya na magazin, gbara mbọ imeju asịrị ahụ site n’ikwu na Perst-Davies enweghị aka na mmeri MBGN ya.

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe ọ chịchara ọchịchị ya nke mere ya zọọ asọmpi na Miss World, Oshinowo pụtara na azụmahịa maka ndị mmeputa ude; Venus de Milo, ma kwado ngosipụta ejiji na ịma mma na telivishọn Naijiria. Azumahịa ya gụnyere ụlọ oriri nri Afrika, ụlọ ahụike na ịchọọ mma[6] nke o lekọtara ruo afọ asaa tupu eresị ya mgbe ọ kpebiri ịmepụta ọtụtụ ngwaahịa mma maka ahịa Naijiria.[7][8] Na Januwarị 17, 2010, e wepụtara ihe ngosi maka mmega ahụ bụ Nike Oshinowo: Fit, Forty and Fabulous.[4][9]

Na 2010, na mbọ nke ụgbọrụ isii, Oshinowo zụtara wee bụrụ onyeisi mmemme nke Miss Nigeria n'aka ndị mbụ na-ahazi ya bụ Daily Times, mechara ghọrọ onyeisi ihe nduzi nke mmemme ahụ.[4][10][11] Ka ọ na-erule afọ 2012, ọ nọzịghịzi na-ọkwa ahụ,[12][13] mana ọ na-arụ ọrụ ugbu a na asọmpi ọzọ nke onye mmeri ga-achị ruo otu narị afọ.[14]

N’afọ 2014, Oshinowo malitere oru ya na Late Night ya na Nike Oshinowo na AIT.[15]

Ndụ onwe[dezie | dezie ebe o si]

Oshinowo, onye maara asụ asusu ise (English, Yoruba, Japanese, Spanish, na French) luru onye dibia bekee aha ya bụ Tunde Soleye n’afọ 2006,[16][17] mana ugbua ha gbara alukwaghim.[18] N’afọ 2009, nwunye ochie Tunde, Funmilayo, gbara Tunde na nwunye ya akwụkwọ ikpe nke kwuru na Oshinowo enweghi ntụkwasị obi ebe Tunde nọ n'ihi omume wawawa n’oge alụm di na nwunye ha.[19] Mgbe ọ rụtere afọ 47, ọ ghọrọ nne ejima site na usoro nke a na-akpọ surrogacy na mba Amerika.[1]

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 "It’s twins for Nike Oshinowo - Vanguard News", 2013-10-07.
  2. Asabi. Archived from the original on 2016-03-04. Retrieved on 2020-11-29.
  3. "I am your everyday girl -Nike Oshinowo", National Mirror, 22 January 2011.
  4. 4.0 4.1 4.2 "Nigerian Beauty Queens still rocking", The Vanguard, 7 October 2011. Retrieved on 30 May 2012.
  5. Lawal, Kemi. "Their crowns, their love, their lives", The Punch, 21 August 2011. Retrieved on 30 May 2012.
  6. "The key to looking beautiful – Nike Oshinowo-Soleye, ex-beauty queen".
  7. "Something New From Nike Oshinowo".
  8. Nigeria HomePage - Breaking News, Business, Sports, Entertainment and Video News.
  9. "Fit, Forty and Fabulous".
  10. "Between Brand Owners and ‘Miss Nigeria’", Thisday, 18 July 2010. Retrieved on 30 May 2012.
  11. "Miss Nigeria Returns After Six Years •To Hold In Three Continents", Nigerian Tribune, 19 June 2010. Retrieved on 30 May 2012.
  12. Nike Oshinowo Relinquishes Crown. Archived from the original on 2012-09-04. Retrieved on 2020-11-29.
  13. All Set For New Miss Nigeria
  14. I love to conquer — Nike Oshinowo. Archived from the original on 2013-10-06. Retrieved on 2020-11-29.
  15. "Nike Oshinowo’s late night whispering - Vanguard News", Vanguard News, 2014-11-22. (in en-US)
  16. Lawal, Kemi. "Nike Oshinowo-Soleye returns", 25 October 2009.
  17. Ohai, Chux. "I never thought I would get married - Nike Oshinowo-Soleye, former Most Beautiful Girl in Nigeria", 30 January 2010.
  18. Inyang, Ifreke (2013-01-22). "It is simple and clean, this is not a scandal" - Dr. Soleye confirms split from Nike Oshinowo.
  19. Akpeh, Ebele. "Infidelity - Ex-Beauty Queen, Nike Oshinowo Joined in Divorce Suit", 24 October 2009.

Njikọ dị na mpụga[dezie | dezie ebe o si]

Alfred, Lanre. "A Queen in a New Light", ThisDay, 24 July 2010. Retrieved on 31 May 2012.