Oliver Wonekha

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Oliver Wonekha
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịUganda Dezie
Aha enyereOliver Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1951 Dezie
Ebe ọmụmụBududa District Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụdiplomat, Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jiMember of the Parliament of Uganda Dezie
ebe agụmakwụkwọMakerere University Dezie
Ebe obibiKigali Dezie

Oliver Wonekha bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na onye nnọchi anya mba Uganda, onye na-eje ozi dị ka onye nnọchianya Uganda na People's Republic of China, kemgbe 2022.[1] Ọ rụrụ ọrụ dị ka onye nnọchi anya mba ahụ na United States of America, site na 2013, ruo 2017 ma mesịa bụrụ onye isi kọmishọna Uganda na Republic Of Rwanda n'etiti afọ 2017 na 2022.[2]

A mụrụ Wonekha na mpaghara Bududa nke oge a, n'ihe dị ka 1951.[1] O nwere nzere bachelọ nke sayensị na Mahadum Makerere, na Kampala, isi obodo Uganda. O nwekwara diplọma postgraduate na agụmakwụkwọ, nke sikwa na Makerere.[2]j

Ahụmahụ ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Ọ rụrụ ọrụ na ngalaba kọfị ruo afọ 30, malite n'ihe dị ka 1971, tupu ọ banye na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.[3] Ọ rụrụ ọrụ na Coffee Marketing Board nke na-adịghịzi adị ugbu a ma mesịa rụọ ọrụ maka Kyagalanyi Coffee Limited.[2]

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2011, Wonekha banyere na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ntuli aka nke Uganda site na ịsọ mpi Mbale District Women's Constituency, na ndị omeiwu Uganda. Ọ meriri ma jee ozi n'ọkwa ahụ n'oge omeiwu nke asatọ (2001[[2006). N'afọ 2006, ọ sonyeere ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị nke National Resistance Movement. Ọ meriri ma jee ozi n'ọkwa ahụ na nzuko omeiwu nke itoolu (2006ī2011).[4] N'oge ntuli aka nke afọ pụkụ abụọ na iri na otu , ọ tụfuru oche ya.[5] Mgbe e meriri ya na ndị omeiwu Uganda, ọ gbara ọsọ na-enweghị ihe ịga nke ọma maka Nzukọ Ndị Ome Iwu nke East Africa.[3]

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2013, a kpọrọ ya onye nnọchi anya Uganda na United States, ebe o nyere onye isi ala Barack Obama asambodo ya na 22 Julaị 2013.[2] Na Jenụwarị 2017, a kpọfere ya na Rwanda, dị ka onye nnọchi anya Uganda na mba ahụ, na-anọchi Richard Kabonero onye a kpọfere na Republic of Tanzania.[6] O nyere onye isi ala Paul Kagame asambodo ya, na 11 Ọktoba 2017. N'afọ 2022 ọ malitere ọrụ ya ugbu a dị ka onye nnọchi anya Uganda na China[7]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

Ebenside[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 Mugabo (27 January 2017). Dean Of Foreign Diplomatic Missions In Rwanda Replaced. News of Rwanda. Archived from the original on 27 July 2018. Retrieved on 20 October 2017.
  2. 2.0 2.1 2.2 2.3 Namutebi. "Obama receives Wonekha as Ugandan envoy", New Vision, 22 July 2013. Retrieved on 20 October 2017.
  3. 3.0 3.1 AllGov.com (10 May 2014). Ambassador from Uganda: Who Is Oliver Wonekha?. Allgov.com. Retrieved on 20 October 2017.
  4. Nabunya. "New District Woman MPs to be Sworn-in on September 12th, 2006", Uganda Radio Network, 7 September 2006. Retrieved on 20 October 2017.
  5. Tabu Butagira (18 November 2012). Foreign service chokes with failed politicians. Retrieved on 20 October 2017.
  6. Bwire (27 January 2017). Museveni appoints Dr Kiyonga Uganda's ambassador to Beijing. Retrieved on 20 October 2017.
  7. Vision Reporter (11 October 2017). Wonekha presents credentials to Kagame. Retrieved on 20 October 2017.