Oluyemi Adeniji

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Oluyemi Adenji
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya22 Julaị 1934 Dezie
Ebe ọmụmụIjebu Ode Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya26 Novemba 2017 Dezie
Ebe ọ nwụrụLondon Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Yoruba Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Yoruba, pidgin Naịjirịa, French language Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, diplomat Dezie
Ọkwá o jiMinister of Foreign Affairs, Minister of Interior Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of London Dezie
agbụrụNdi Yoruba Dezie

Ambassador Oluyemi Adeniji (iri abụo na asaa Julaị 1934 Ō iri abụo na asaa Nọvemba 2017 na London) bụ onye na-arụ ọrụ na Naijiria na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ onye nnọchi anya pụrụ iche nke odeakwụkwọ ukwu na United Nati ons Mission na Sierra Leone (UNAMSIL) site na Nọvember 19, 1999 ruo Julaị 16, 2003.[1] O mechara bụrụ Minista Na-ahụ Maka Mba Ọzọ nke Naijiria site na July 2003 ruo June 2006, mgbe ahụ Minista na-ahụ maka ihe ndị dị n'ime obodo site na 21 June 2006 ruo May 2007.

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

Adeniji nwere nzere na akụkọ ihe mere eme. Ọ sonyeere ndị ọrụ mba ofesi nke Naijiria na July 1960. Ọ rụrụ ọrụ na Ministry of Foreign Affairs na Naijiria embassies na Washington, D.C., Freetown, Sierra Leone, na Accra, Ghana. Ọ lara ezumike nká n'ọrụ na 1991 mgbe ọ rụchara ọrụ dị ka onye isi nchịkwa nke ngalaba na-ahụ maka ihe gbasara mba ọzọ. Ruo afọ ise ọ bụ onye nnọchi anya Naijiria na France.[2]

Adeniji bụ onye nnọchi anya pụrụ iche nke odeakwụkwọ ukwu nke United Nations maka United Nations Mission na Central African Republic (MINURCA). Ọrụ ahụ bụ ọrụ inye nchekwa na Bangui na ịhazi ntuli aka ndị omeiwu na nke onye isi ala e mere na 1998 rue n'afọ1999.

A họpụtara ya ka ọ bụrụ onye nnọchi anya pụrụ iche nke ode akwụkwọ ukwu nke United Nations maka Sierra Leone na onye isi nke United Nations Mission na Sierra Leone (UNAMSIL).[2]

Ọrụ ya mgbe e mesịrị[dezie | dezie ebe o si]

A họpụtara Adeniji ka ọ bụrụ Mịnịsta na-ahụ maka ihe gbasara mba ofesi n'ọnwa Julaị afọ 2003.[2]

Malite na mbido Machị 2008, Adeniji duziri mkparịta ụka na Kenya metụtara nsogbu ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke mba ahụ, mgbe ọpụpụ nke onye isi mkparịta ụka gara aga, Kofi Annan. Na mgbakwunye, ọ rụrụ ọrụ na Commission of Eminent Persons on The Role of the IAEA to 2020 and Beyond, nke Ernesto Zedillo bụ onye isi oche ya, onye a malitere akụkọ ya bụ Reinforcing the Global Nuclear Order for Peace and Prosperity na June 2008. Adeniji nwụrụ na 27 Nọvemba 2017 na London, afọ 83.[3]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

Àtụ:Foreign Ministers of NigeriaÀtụ:Interior Ministers of Nigeria