Omotade Alalade

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Omotade Alalade
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoOmotade Dezie
Ebe ọmụmụLagos Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Yoruba Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ọchụnta ego, Onyeisi azụmahịa Dezie
Ihe nriteBBC 100 Women Dezie

Omotade Alalade (amụrụ c. 1985) bụ onye ọchụnta ego na- elekọta mmadụ na Naijiria na ọkachamara gbasara nsogbu amụghị nwa. Ọ bụ onye nhiwe na onye isi oche Beibei Haven Foundation, ọgbakọ na-abụghị nke gọọmentị na-enye nkwado ọmụmụ nye ụmụ nwanyị na ndị di na nwunye. N'afọ 2016, e depụtara ya dịka otu n'ime ụmụ nwanyị otu nari kacha nwee mmetụta site ndepụta nke BBC . [1]

Ndụ mmalite na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Omotade dị ka Omotade Sadare na Marina, Lagos steeti, Nigeria . Ọ gara ụlọ akwụkwọ praịmarị na sekọndrị na Legọs wee gụọ akwụkwọ na mahadum Lagos State University

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

N'ihi ahụmahụ nke onwe ya na mgba ndụ Alalade gabigara na-amụghị nwa, ime, ime ọpụpụ na ọnwụ nwa ọhụrụ, o kere ụlọọrụ Beibei Haven Fertility Foundation nke a na-anaghị akwụ ụgwọ. Ntọala ahụ na-enye nkwado maka ụmụ nwanyị na ndị di na nwunye na-agbalị ịtụrụ ime. Ntọala ahụ na-enyekwa onyinye na nkwado nye ezinụlọ ndị na-ahụ maka mfu nke afọ ime ma ọ bụ ndị na-enweghị ọmụmụ. [2]

Ndụ onwe[dezie | dezie ebe o si]

Omotade lụrụ Funmilade Alalade na 15 October 2011. [3] Dị ka Omotade si kwuo, ka ọ lụchara, ọ chọpụtara na ya na di ya bụ ndị bu ọrịa sickle cell anaemia . Nke a pụtara na ha nwere ike ịmụ ụmụ nwere ọrịa sickle cell anaemia. Di na nwunye ahụ nwere ọtụtụ mgbalị ịtụrụ ime site na IVF, bụ nke na-akpasu iwe. Na Nọvemba 2018, ka ọ na-ekwuputa akụkọ akaebe ya, o dere site na profaịlụ Instagram ya, "Mgbe m mefuru ihe karịrị nde naira iri na otu na ọgwụgwọ IVF mụ na di m mechara jiri ejima mezuo ezinụlọ anyị." [4] [5]

Ihe nrite na nnabata[dezie | dezie ebe o si]

  • BBC 100 Women of The Year, 2016. [6]
  • Her Network Woman of the Year, 2017. [7] [8]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Trust. "Meet Two Nigerians Who Made BBC 100 Women 2016", Dailytrust Nigeria, Dailytrust Newspaper, 31 October 2017. Retrieved on 8 May 2020.
  2. Woman.NG (2016-11-23). Two Inspirational Nigerian Women Make BBC's "100 Women" List (en-US). Woman.NG. Archived from the original on 2018-12-04. Retrieved on 2020-10-01.
  3. Motherhood Against All The Odds (en-GB) (29 November 2018). Retrieved on 24 January 2019.
  4. Beibei Haven Foundation Pink Ball Fund Raising Event (en-GB) (29 November 2018). Archived from the original on 1 July 2017. Retrieved on 24 January 2019.
  5. Omotade Alalade shares her Testimony (en-GB) (29 November 2018). Retrieved on 24 January 2019.
  6. "BBC 100 Women 2018: Who is on the list?", 19 November 2018. Retrieved on 24 January 2019. (in en-GB)
  7. Ejiofor. "The Sisterhood Awards Opens up First Public Vote for Nigeria's Heroes", The Guardian Nigeria, Guardian Newspaper, 31 October 2017. Retrieved on 8 May 2020.
  8. "Official Nominees Revealed Network Woman Year Awards 2017", 29 November 2018. Retrieved on 24 January 2019. (in en-GB)