Jump to content

Paul Adefarasin

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Paul Adefarasin
mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha enyerePaul Dezie
aha ezinụlọ yaAdefarasin Dezie
ụbọchị ọmụmụ ya25 Jenụwarị 1963 Dezie
Ebe ọmụmụNaijiria Dezie
Dị/nwunyeIfeanyi Adefarasin Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Yoruba Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Yoruba Dezie
ọrụ ọ na-arụonye na-ese ụkpụrụ ụlọ, Christian minister, televangelist Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Miami, Igbobi College Dezie
webụsaịtịhttp://houseontherockng.com/our-pastors.html Dezie
nnọchiaha nkeonweL485 Dezie

Paul Adeolu Adefarasin (amụrụ n'abalị 25 ọnwa Jenụwarị 1963) bụ Onye Ozi Ndị Kraịst, Onye Ozizi Bible na Televangelist. Ọ bụ Prelate nakwa Metropolitan Senior Pastor nke ụlọ ụka House on the Rock nke isi ya dị na Lagos, (Nigeria) nwere ngalaba n'ọtụtụ obodo dị iche iche na Nigeria gụnyere Port-harcourt, Abuja yana Johannesburg, South Africa & London, UK. Ọ bụkwa onye nnọkọ / onye nnabata nke The Experience (gospel concert).[1][2][3]

Mmalite ndụ

[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Paul Adefarasin na 25 Jenụwarị 1963 n'ezinaụlọ Joseph Adefarasin, onye ọka ikpe nke ụlọ ikpe dị elu nke Naijiria si Ijebu Ode, na Hilda Adefarasin, onye na-akwado ikike ụmụ nwanyị si Lagos Steeti. Ọ bụ nwanne Rev. Wale Adefarasin na Onyeozi Yemi Adefarasin, ha abụọ bụ ndị ozi Ndị Kraịst a na-akwanyere ùgwù.[4] A zụlitere ya na Nigeria na United States.[5][6][7][8][9][10]

Adefarasin gara ụlọ akwụkwọ St Saviour dị na Ikoyi, na Igbobi College na Yaba. Agụmakwụkwọ ụlọ akwụkwọ sekọndrị ya bụ na Haileybury College na England.[11] Ọ gara n'ihu gụọ akwụkwọ na Mahadum Miami, ọ gụsịrị akwụkwọ na Bachelor of Architecture . Ọ rụrụ ọrụ na Florida tupu ọ laghachi Naịjirịa.[12][13]

Ọ gụrụ akwụkwọ na International Bible Institute of London ebe ọ nwetara diplọma na Christian Ministry.[5][8]

Mbipụta akwụkwọ

[dezie | dezie ebe o si]

Adefarasin edeela, ma bipụta n'onwe ya ihe karịrị obere akwụkwọ iri abụọ na-akpali akpali nke Ndị Kraịst na ihe onwunwe multimedia. Ndị na-ebipụta akwụkwọ na ndị na-ekesa akwụkwọ Ndị Kraịst ebipụtala atọ n'ime akwụkwọ ya.[1][2][3]

Ndụ onwe

[dezie | dezie ebe o si]

N'ọnwa June 1995, Adefarasin lụrụ Ifeanyi Adefarasin (amụrụ na Septemba 16th 1972), onye bụbu eze nwanyị mara mma ma ugbu a bụ onye ozi a na-akwanyere ùgwù na onye na-ekwu okwu ọgbakọ a maara nke ọma maka ozi doro anya na nke bara uru nke olileanya na ike.[14] Ha mụrụ ụmụ atọ.[15]

Edemsibịa

[dezie | dezie ebe o si]
  1. 1.0 1.1 Home - The Experience Lagos 2016 Revealing Jesus (en-US). The Experience Lagos. Archived from the original on 2019-02-28. Retrieved on 2016-12-03.
  2. 2.0 2.1 Nsehe. "Hey! I'm A Billionaire, Nigerian Pastor Cries Out", Forbes, 2011-06-22. Retrieved on 2018-07-25. (in en)
  3. 3.0 3.1 "Inside Pastor Paul Adefarasin's N50b House On The Rock Church", Encomium Magazine, 2014-08-27. Retrieved on 2018-07-25. (in en-US)
  4. Notable Nigerian clergy men with siblings who run their own churches - Opera News. ng.opera.news. Archived from the original on 2021-05-21. Retrieved on 2021-05-21.
  5. 5.0 5.1 Udodiong. "5 things to know about House on the Rock's Pastor Paul Adefarasin". Retrieved on 2018-08-24. (in en-US)
  6. Udodiong. "5 beautiful women who are married to your favourite pastors". Retrieved on 2018-08-24. (in en-US)
  7. Egbo. "It's couple's 22nd wedding anniversary today!". Retrieved on 2018-08-24. (in en-US)
  8. 8.0 8.1 Agu. "Pastor Paul Adefarasin biography", Naija.ng - Nigeria news., 2018-01-05. Retrieved on 2018-08-24. (in en-US)
  9. Paul Adefarasin celebrates 55. Thisday. Archived from the original on August 25, 2018. Retrieved on August 20, 2018.
  10. Kemi Ajumobi (June 15, 2014). Pastor Paul Adefarasin, stirring a positive revolution, championing global impact. Archived from the original on August 25, 2018. Retrieved on August 20, 2018.
  11. Pastor Paul Adeolu Adefarasin, Pastor, Prophet, Evangelist, Nigeria Personality Profiles. www.nigeriagalleria.com. Retrieved on 2021-04-01.
  12. Pastor Paul Adefarasin builds Multibillion Naira retirement home in Banana. Thisday live. Retrieved on August 20, 2018. 
  13. Abiola Salami (2012). Get Mad! (You Can Make a Difference). AuthorHouse. ISBN 9781468554557. 
  14. Biography of Pastor Ifeanyi Adefarasin – HENOTACE.ORG. henotace.org. Retrieved on 2021-05-21.
  15. "THE LOVE STORY OF PASTOR PAUL ADEFARASIN & WIFE REVEALED", CityPeople, February 18, 2018. Retrieved on August 20, 2018.