Paulinus Igwe Nwagu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Paulinus Igwe Nwagu
Mmádu
Akụkụ nkeHouse of Representatives of Nigeria Dezie
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyerePaulinus Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya12 Jụn 1959 Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jionye otu ndi omeiwu nigeria, onye otu ulo nnochite anya Naijiria Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịPeople's Democratic Party Dezie

Paulinus Igwe Nwagu // (na-ege ntị) (amụrụ na abalị iri na abụọ n'ọnwa isii n'afọ otu puku, narị iteolu na iri ise na iteolu (12 June 1959) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Naijiria bụbu onye nnọchi anya Ezza North / Ishielu nke Ebonyi Steetị, Naịjirịa na House of Representatives. Na ntuli aka mba nke ọnwa Anọ n'afọ puku abụọ na iri na otu (Eprel 2011), a họpụtara ya ka ọ bụrụ Sịnetọ maka Etiti Ebonyi na-agba ọsọ na People's Democratic Party (PDP).

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Nwagu na abalị iri na abụọ n'ọnwa isii n'afọ otu puku, narị iteolu na iri ise na iteolu (12 June 1959), na Ebonyi Steetị. O nwetara nzere bachelọ na sayensị ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ọ bụ onye ndụmọdụ maka Ezza North Local Government Council site n'afọ otu puku, narị iteolu na iri iteolu ruo na otu puku, narị iteolu na iri iteolu na atọ (1990-1993) na onye isi oche nke Ezza North Regional Government Area site n'afọ otu puku, narị iteolu na iri iteolu na iteolu ruo na n'afọ puku abụọ na abụọ (1999-2002).[1]

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

A họpụtara Nwagu dị ka onye otu House of Representatives maka mpaghara Ishielu nke Ebonyi's Ezzra North n'ime ọnwa anọ, n'afọ puku abụọ na asaa (Eprel afọ 2007), na ikpo okwu PDP. N'ụlọ ahụ, a họpụtara ya na kọmitii na-ahụ maka ndị ntorobịa na mmepe mmekọrịta ọha na eze, ndị na-azụ ahịa ọha, ndị uweojii, Petroleum Resources (Downstream), Environment and Emergency & Disaster Management.[2] Ọ bụ onye isi oche nke House of Representatives Committee on Rural Development. N'afọ puku abụọ na iteolu (2009), ụlọ ọrụ na-ahụ maka mpụ na Naijiria, Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) jidere Igwe ma tụọ ya mkpọrọ n'ụlọ mkpọrọ Kuje dị na Abuja maka ebubo ya na ọ na'ime aghụghọ eletrik nke onu ego ya pụtara ijeri ise na nde naira abụọ (N5.2), nde iri atọ na anọ na narị iri isii na isii ma atụgharia ya na onu ego dola ($ 34.66).[3][4]

Na ọnwa mbụ n'afọ puku abụọ na iri na otu (Jenụwarị 2011) PDP primaries maka oche Ebonyi Central Sịnetorial, a mara Nwagu dị ka onye a họpụtara na PDP mgbe ndị ọzọ na-asọmpi kwụsịrị ọrụ maka ebubo na ọ bụghị ya, gụnyere iji akwụkwọ ntuli aka maka Kwara State iji mee ntuziaka Ebonyi Center.[5][6] O meriri ntuli aka n'ọnwa anọ, n'afọ puku abụọ na iri na otu (Eprel 2011) na vootu iri puku ise na ise, na iri n'ise (55,016) na ikpo okwu PDP. Ugo Chima nke All Nigeria Peoples Party (ANPP) nwetara vootu iri puku anọ na otu, na iri ireolu na isii (41,096).[7]

N'ọnwa ise n'afọ puku abụọ na iri abụọ n'abụọ (Mee 2022), o kwupụtara mmasị ya ịzọ ọkwa gọvanọ na steeti Ebonyi.[8] Mmadụ iri na anọ (14) na-achọ ịbụ ndị na'ebu ọkọlọtọ nke PDP maka ntuli aka gọvanọ nke afọ puku abụọ na iri abụọ na atọ (2023); itoolu sitere na mpaghara Ebonyi North Senatorial gụnyere Nwagu, anọ sitere n'Ebonji Central na otu sitere ne Ebonayi South.[9] Obinna Ogba si Ebonyi Central mechara merie na primaries.[10]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Ndepụta ndị si Ebonyi Steeti

Ebemsidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Omorogbe (2022-06-22). Nkata, Nwagu, emerges APGA, PDP deputy gubernatorial candidates in Ebonyi (en-GB). Tribune Online. Retrieved on 2022-08-11.
  2. HON. PAULINUS IGWE NWAGU. The House of Representatives. Archived from the original on 2010-07-18. Retrieved on 2011-05-06.
  3. Error on call to Template:cite web: Parameters url and title must be specified. BusinessDay. Archived from the original on 2016-03-03. Retrieved on 2013-03-12.
  4. Shoddy jobs: NASS threatens to sanction erring contractors. Nigerian Tribune (15 March 2011). Archived from the original on March 29, 2012. Retrieved on 2011-05-06.
  5. Sobechi. "PDP senators, reps reject primaries over alleged fraud", Nigerian Guardian. Retrieved on 2013-03-12.
  6. More Nigerian federal lawmakers lose return tickets in. WorldStage (January 9, 2011). Archived from the original on March 14, 2012. Retrieved on 2011-05-06.
  7. JEFF AMECHI AGBODO (12 April 2011). PDP wins Ebonyi Central senatorial, Reps seats. Nigerian Compass. Retrieved on 2011-05-06.
  8. 2023: I'll Reclaim Ebonyi Back to PDP, Says Senator Igwe-Nwagu – THISDAYLIVE. www.thisdaylive.com. Retrieved on 2022-08-12.
  9. Ebonyi 2023: Odi's uneasy walk to victory (en-US). The Guardian Nigeria News - Nigeria and World News (2022-06-22). Retrieved on 2022-08-12.
  10. Online (2022-06-06). Ogba emerges PDP gubernatorial flagbearer in Ebonyi (en-GB). Tribune Online. Retrieved on 2022-08-12.