Popu nke Nta

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ


Popu Obumneme Odonwodo [1] (May 7, 1984 - April 10, 2024), nke a maara nke ọma dị ka Junior Pope, bụ onye Naijiria na-eme ihe nkiri na onye na-emepụta ihe nkiri. Ọ malitere ọrụ ya na afor puku abụọ na isii , na-apụta na ihe nkiri Secret Adventures nke afọ puku abụọ na asaa, tinyere ihe nkiri Bitter Generation (2010).

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Odonwodo na Bamenda, Cameroon, na Mai 7, 1984 [2] n'ezinụlọ nna ya onye igbo bụ Luke Odonwudo, na nne ya bụ onye Cameroon. [3][4][5] Ya na ndị mụrụ ya biri na Bamenda, ruo mgbe ọ kwagara Naịjirịa, maka agụmakwụkwọ praịmarị na sekọndrị ya.[6]  Ọ bụ naanị nwa nne na nna ya.[7]mụrụ

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ ya na Accounting, ọ chọrọ ịghọ onye na-ahụ maka ego mana ọ chụpụrụ ọrụ na ime ihe nkiri na afọ puku abụọ na anọ ma gosipụta ya na ọrụ ndị dị ala.[8][9] O bu ụzọ rụọ obere ọrụ na ihe nkiri afọ puku abụọ na anọ nke bụ Lost in the Jungle . Ọ pụtara n'ọtụtụ ihe nkiri n'otu afọ ahụ.[10]

Pope banyere n'ụlọ ọrụ Nollywood n'afọ puku abụọ na isii wee bụrụ onye a ma ama na ihe nkiri Naijiria ọ rụrụ n'afọ puku abụọ na asaa nke bụ Secret Adventure, ebe ọ rụrụ ọrụ dị egwu, ọ bụ Tchidi Chikere duziri ihe nkiri ahụ.[11][12] Nke a tinyere njikọ n'etiti ya na ndị na-akwado ya. Mgbe a tọhapụrụ ihe nkiri ahụ, Pope rụrụ ọrụ karịrị otu narị ihe nkiri Nollywood nke gụnyere Throne of Tears (2008), Always Mine (2009), Mad Sex, Blood Afair (2021), Gbege (2022) na No Way Through (2023).[13][14]    

N'ọnwa Ọktoba afọ puku abụọ na iri abụọ na abụọ , Pope pụtara na ihe nkiri Nollywood Gbege, [15] ma gosipụtakwa n'afọ sochirinụ na-egosi nkà ime ihe nkiri ya na ihe nkiri Honey Money, n'ọnwa Eprel afọ puku abụọ na iri abụọ na atọ . [16] 

Junior Pope anọwo na-enwe kemịkalụ ịdị ma na-adịghị na ihuenyo nke Nollywood fraternity tọrọ ya ruo mgbe ọ nwụrụ n'ọnwa Eprel afọ puku abụọ na iri abụọ na anọ . [17][18]

Ndụ onwe[dezie | dezie ebe o si]

Odonwodo bụ Onye na-atụ egwu Chineke .[19] Junior Pope nwere ụmụ atọ. Ka ọnwa Julaị dị ná mkpụrụ ụbọchị iri abụọ na isii, afọ puku abụọ na iri na anọ Pope lụrụ Jennifer Awele Okpuno; [20] onye ọ zutere site na saịtị mgbasa ozi mmekọrịta, Facebook.[21][22][23]

Ọnwụ[dezie | dezie ebe o si]

Pope nọ n'ụzọ ịga mee ihe nkiri mgbe ụgbọ mmiri ya tụgharịrị n'Osimiri Naija na Asaba, Delta steeti. Ya na ndị ọrụ atọ ndị ọzọ nwụrụ. Ndị na-eme ihe nkiri nke Naịjirịa (AGN) kwupụtara ọnwụ Pope. Ha kwuru na mgbalị iji mee ka ọ dịghachi ndụ enweghị ihe ịga nke ọma.[24] A kpọrọ ndị ọchịchị, ekwupụtakwara na ọ nwụrụ n'ebe ahụ mgbe ọ dị afọ iri atọ na itoolu.[25][26][27][28]

  1. BREAKING: Tragedy Hits Nollywood Again As Actor Junior Pope Dies At 39 (en-GB). Leadership News (10 April 2024). Retrieved on 11 April 2024.
  2. Okiki (10 April 2024). UPDATED: Junior Pope, three other Nollywood actors die in boat accident at age 39. (en-GB). The Punch. Retrieved on 11 April 2024.
  3. Junior Pope Njoku (en-GB). Nolly Wire. Retrieved on 11 April 2024.
  4. Rachael (11 April 2024). 10 things to know about Nollywood actor, Junior Pope (en-GB). Nigerian Tribune. Retrieved on 11 April 2024.
  5. Friday (10 April 2024). Actor Jnr Pope who reportedly drowned resuscitated (en-GB). Premium Times. Retrieved on 11 April 2024.
  6. Nollywood Actor, Jnr Pope Is dead at 39 (en-GB). The Fact Daily (10 April 2024). Retrieved on 11 April 2024.
  7. Mercy (23 December 2020). Biography of Nollywood actor Junior Pope and other facts about him (en-GB). DNB Africa. Retrieved on 11 April 2024.
  8. The many evils of nollywood – Junior Pope Odonwodo, actor (en-US). The Sun (23 February 2018). Retrieved on 11 April 2024.
  9. Chinasa (13 July 2023). “There’s a Legend Behind Every Legacy”: Jnr Pope career start (en-US). Legit.ng. Retrieved on 11 April 2024.
  10. Junior Pope Odonwodo, Africa Magic Viewers Choice Awards (en). Africa Magic - Quick News. Retrieved on 11 April 2024.
  11. Most Popular Movies and TV Shows With Junior Pope Odonwodo. IMDb. Retrieved on 11 April 2024.
  12. Confidence (10 April 2024). Nigeria: How Secret Adventure Made Me a Superstar - Junior Pope (en). allAfrica.com. Retrieved on 11 April 2024.
  13. Sunny (11 April 2024). Junior Pope: 10 things to know about late actor (en-US). Daily Post Nigeria. Retrieved on 11 April 2020.
  14. Junior Pope Biography : Career, Exploring Life and Legacy of Junior Pope (en-US) (11 April 2024). Retrieved on 11 April 2020.
  15. Lancelot Imaseun's comeback film 'Gbege' premieres Oct 7 - starring Broda Shaggi, Ini Edo, Sam Dede and Junior Pope (en-US). TheCable Lifestyle (14 September 2022). Retrieved on 11 April 2024.
  16. ‘Honey Money’ to Debut in Cinemas (en-US). This Day Live. Retrieved on 11 April 2024.
  17. Agency (11 April 2024). Junior Pope: Actors guild declares ‘No Shoot Day’, suspends production of ill-fated movie (en-US). Premium Times Nigeria. Retrieved on 11 April 2024.
  18. Jeffrey (10 April 2024). Junior Pope: Nigerian Actor Dies During Movie Shoot, Fans Mourn Him (en-US). Yen Newspaper. Retrieved on 11 April 2024.
  19. Actor, Junior Pope Reacts To a Video of Native Doctor Preparing Charm For Pastor, Says He Is A Christian (en). Gistlover (18 May 2022). Retrieved on 11 April 2024.
  20. The Beautiful Family Of Jnr Pope, His Wife And Children | Calabach (en-US) (2024-04-13). Retrieved on 2024-04-13.
  21. Nessy (April 10, 2024). Meet The Kids Of The Late Junior Pope.
  22. Everything about Nollywood actor, Junior Pope who died in boat accident while filming. Vanguard News (April 10, 2024).
  23. Mercy Trin (January 4, 2023). Actor Junior Pope makes interesting revelation on how he met his wife, Jennifer. KFN.
  24. AGN makes U-turn, says actor Junior Pope unresponsive, three others missing (en-US). Vanguard News (11 April 2024). Retrieved on 11 April 2024.
  25. Olumide (11 April 2024). Junior Pope's Death: 'This Is Spiritual,' Eyewitness' Account on Boat Accident (en-US). Legit.ng. Retrieved on 11 April 2024.
  26. EwaOluwa (10 April 2024). Nollywood Actor Junior Pope Dies In Boat Accident (en-GB). Channels TV. Retrieved on 10 April 2024.
  27. Orimemi. "OBITUARY: Junior Pope, the Cameroon-born actor who met untimely end on way to movie set", Thecable, 11 April 2024. Retrieved on 13 April 2024.
  28. Nurudeen (10 April 2024). Actor Jnr Pope drowns hours after he posted video on a boat (en-US). Pulse Nigeria. Retrieved on 11 April 2024.