Princess Elizabeth Olowu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Princess Elizabeth Olowu
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereElizabeth Dezie
aha ezinụlọ yaOlowu Dezie
aha ọmaprincess Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1945, 1939 Dezie
Ebe ọmụmụKazaure Dezie
ŃnàAkenzua nke Abụọ Dezie
nwanneErediauwa Dezie
nwaPeju Layiwola Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ese, onye na-akpụ ihe ọkpụkpụ Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Nigeria, Mahadum nke Benin Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Princess Elizabeth Olowu (a mụrụ na abalị asatọ ọnwa Ọgọọst 1945(8 August 1945)) bu onye Naijiria na-akpụpụta ihe bụrụkwa ada Oba Akenzua II, onye bụ onye ndu Ndi Edo na mbụ, n'ebe bụ ugbua Benin City, Nigeria . Olowu ji ọla arụ ọrụ, ihe ọdịnala ndị obodo ya (lee Benin Bronzes ), a marakwa ya dị ka nwanyi mbụ na-akapụta ihe na ọla bronze na ala Nigeria. Ihe akpụrụ akpụ ya nwere usoro ọdịnala yana ọmarịcha ihe ngosi ọhụụ nke oge a nakwa nke nwanyị. [1] Ọ bụ nwanne nne DJ P Tee Money ( Thompson Iyamu ), na nwa ya nwanyị bụ onye na-ese ihe Peju Layiwola . [2]

Mmalite ndụ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Dika nwata, Olowu na-eso nne ya arụ ọrụ, na-amụta ịkpụ ihe ndị metụtara ndụ obí na mkpa omenala. Nna ya kwadoro agụmakwụkwọ ya na mmasị n'ịkpụ ihe ọkpụkpụ n'agbanyeghị nkwenye ụgha ndị obodo na-akụda ụmụ nwanyị ịbanye n'ebe a na-emepụta ọla. [3] Olowu gara Ụlọ akwụkwọ Holy Child Coleege, ebe ọ zụlitere mmasị ịgụ akwụkwọ. Ọ gara n'ihu n'agụmakwụkwọ ya na ụlọ akwụkwọ Federal Emergency Sayensị ebe ọ gụrụ maka osisi, kemistri na anụmanụ, bụ nke o mechara kuzie n'ụlọ akwụkwọ ụmụnwanyi nke a kpọrọ Anglican girl's grammar school. Mgbe ọ dị afọ iri na asatọ ọ lụrụ enyi ya n'ụlọ akwụkwọ sekọndrị, Babatunde Olowu, ma mụọ nwa mbụ ya na afọ 1964. N'afọ 1966, ọ gara n'ihu n'agụmakwụkwọ ya site n'idebanye aha na Mahadum Nigeria, Otú ọ dị, a gwara ya ka ọ hapụ ụlọ akwụkwọ ahụ ka ọ gụchara afọ mbụ ya.

Ọ gara n'ihu na-akụzi oge ọbụla ọnọ n'ụlọ ma na-ahazi ihe ngosi nka mgbe niile maka ụmụ akwụkwọ nwanyị ya, bụ nke mechara dọta uche onye isi ngalaba nka nka nke Mahadum Benin, bụ onye kpọrọ ya ka ọ sonye na emume nka. N'afọ 1979, ọ gụsịrị akwụkwọ ma nweta nzere Bachelor of Fine Arts, n'ihe dika n'afọ 1981 ọ malitegorịị ịrụ ọrụ na ọmụmụ akwụkwọ ndi gụsịrị mahadum, nke gụnyere akwụkwọ akụkọ ya na "Nchọpụta n'ime Benin Cire Perdue Ụzọ esi akpụ Ihe" Mmezu a mere ka ọ bụrụ nwanyị mbụ na mahadum ahụ nwetara nzere Master of Fine Arts na nwanyị Naijiria mbụ kpụrụ ọla ọla. [4] N'afọ 1985 ọ natara ihe nrite Bendel State maka Nka na Omenala ma mesịa nweta nkwanye ugwu n'aka Òtù Ụmụ nwaanyị na-eto eto nKe ndị ụka Katọlik maka ntinye aka ya n'ịkwalite ọkwa ụmụ nwanyị na obodo ya. Ugbu a ọ na-aga n'ihu na-arụ ọrụ na Mahadum Benin ebe ọ na-elekọta ụlọ ọrụ ọla nke ya. [1]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

</br>Dị ka nwanyị na-eme nka, ihe Elizabeth Olowu na-achọsi ike bụ "ịtọhapụ ụmụ nwanyị n'agbụ nke ụmụ nwoke, nhụsianya na mgbochi". [1] N'afọ 1979, ọ kpụrụ ihe ọkpụkpụ akpaaka nke otu nwa agbọghọ nọ ọdụ na tebụl mgbe ọ na-etinye aka na akwụkwọ. Ihe ọkpụkpụ a bụ otu n'ime ihe mbụ sitere na omenala ya nke gosipụtara ihe oyiyi otu nwanyị. Afọ 1983 bụkwa afọ dị mkpa ná ndụ ya. Ọ nyochara, n'ime omimi, isiokwu nke ike site n'echiche dị iche iche nke mmetụta uche. Ụfọdụ ihe ọkpụkpụ a ma ama sitere na afọ a gụnyere Oba na Chukwu Nwa ebe ha bu njọ ụmụ ụwa. Oba na-egosi nna ya bụ onye nyere aka n'ịkwado ọrụ ya na agụmakwụkwọ ya. Emere ihe oyiyi ahụ nkeonwe site n'iji akara aka ya dị ka ihe eji eme uwe.. Chukwu Nwa Na-ebu Mmehie nke Mmadụ dị ogologo karịrị kubit asaa ma na-egosi ọdịdị nke Kraịst gbachiri n'okpuru ibu nke obe.

Ntụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 LaDuke (1991). Africa through the Eyes of Women Artists. Africa World Press. 
  2. Intersecting Trajectories: Women's Art in Nigeria. A lecture and discussion with Prof. Peju Layiwola - AfricAvenir International (en). www.africavenir.org. Archived from the original on 2022-02-25. Retrieved on 2018-08-21.
  3. "Nigerian artists keep sculpture in the family". Retrieved on 2018-08-21. (in en-US)
  4. Nigeria's first female bronze sculptor - Princess Elizabeth Olowu. Records Nigeria (2016-11-07). Archived from the original on 2019-06-17. Retrieved on 7 November 2016.

Ọgụgụ ọzọ[dezie | dezie ebe o si]

  • LaDuke (1992). Women Artists: Multi-Cultural Visions. Red Sea Press, 21–32. 
  • Blandy (1991). Pluralistic Approaches to Art Criticism. Popular Press. ISBN 9780879725433. 
  • LaDuke (November 1988). "Nigeria: Princess Elizabeth Olowu, Zero Hour". Art Education 41 (6). 
  • Falola (2012). Women's Roles in Sub-Saharan Africa. ABC-CLIO. ISBN 9780313385445.