Samuel A. Countee
| Ụdịekere | nwoke |
|---|---|
| Mba o sị | Njikota Obodo Amerika |
| Aha enyere | Samuel, Albert |
| Aha ezinụlọ ya | Countee |
| Ụbọchị ọmụmụ ya | 1 Eprel 1909 |
| Ebe ọmụmụ | Marshall |
| Ụbọchị ọnwụ ya | 11 Septemba 1959 |
| Ebe ọ nwụrụ | Nassau University Medical Center |
| Ụdị ọnwụ | eke na-akpata |
| Ihe kpatara ọnwụ | ọrịa kansa |
| Date of burial or cremation | 15 Septemba 1959 |
| Ebe olili | Long Island National Cemetery |
| Ọrụ ọ na-arụ | omenkà, muralist |
| Ebe agụmakwụkwọ | Booker T. Washington High School, Bishop College, School of the Museum of Fine Arts |
| Ọkwa agha | staff sergeant |
| Ngalaba agha | United States Army |
| Omenkà faịlụ na | National Gallery of Art Library |
| Ikike nwebiisinka dị ka onye okike | Ọrụ nwebiisinka chekwara |
Samuel A. Countee (ubochí mbú n'ọnwa Eprel, 1909 rụo ụbọchị irí na otu n'ọnwa Septemba, 1959) bụ ónyé na-ese ihe na ónyé na-akpụ ihe.[1][2][1] A na-akpọ SSG Samuel A. Countee Hall na Fort Leonard Wood iji sọpụrụ ya.[3]
Mbido ndụ na agụmakwụkwọ
[dezie | dezie ebe o si]A mụrụ Countee na Marshall, Texas na Thomas Countee Na Nannie Salina Yates Countee. Ọ gàrà Booker T. Washington High School site na 1924 rụo 1928.[1]
Countee gụsịrị akwụkwọ na 1934 na nzèrè na nka na Bishop College. Mgbè ọ nọ na kọleji, o sere foto nke ngalaba na ndị nchịkwa iji nweta ego màkà agụmakwụkwọ.[1]
Countee gụsịrị akwụkwọ na kọleji na 1934 mgbè nke ahụ gasịrị ọ nwetara agụmakwụkwọ na Boston Museum of Arts ebe ọ rụrụ ọrụ dị ka ónyé na-ese ihe.[1]
Ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]
Ọrụ Countee gosipụtara ndụ ndị Africa America.
Site na 1933-1935, Countee gosipụtara nka ya n'ọtụtụ ihe ngosi. N'afọ 1933, William E. Harmon Foundation gosipụtara ihe osise ya, Little Brown Boy.[1][4] O gosikwara na Mahadum Howard, Mahadum Atlanta, Smith College, Institute of Modern Art na Boston, nà 1936 Texas Centennial's Hall of Negro Life.[1][5]
E debara áhà Countee na ndị agha United States na 1942 ebe ọ rụrụ ọrụ na 436th Engineer General Service Dump Truck Company. Mgbè ọ nọ n'usuu ndị agha, e nyèrè y'à ọrụ ịmepụta mural màkà African-American Officers Club na Fort Leonard Wood na Missouri.[1][2][3][6] Ọ na-ese ihe màkà ihe ngosi USO.[2]
Countee kwagara New York ka ahapụchara ya na ndị agha. Ọ bịara màrà n'etiti ndị na-ese ihe na New York wee gaa n'ihu na-ese fotoLucille Armstrong, Harry Belafonte, nà Marian Anderson.[2]
Ndụ onwe onye
[dezie | dezie ebe o si]Countee biri na Long Island, New York. Ọ lụrụ Mary Miner na 1955.[1]
Countee nwụrụ n'ọrịa kansa n'ubochí irí na otu n'ọnwa Septemba,1959.[1]
Ihe Nketa
[dezie | dezie ebe o si]N'afọ 2019, a gbanwere aha Fort Leonard Wood African-American Officersī Club nke nwere mgbidi Countee SSG Samuel A. Countee Hall.[2][3]
Nwa nwanne Countee, Sammie Witing-Ellis, nyere aka ịkọwa ihe osise ahụ site n'aka nwanne nna ya mgbe ọ chọtara ọrụ kwekọrọ na ya na sketchbook.[3]
Ihe odide
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ 1.00 1.01 1.02 1.03 1.04 1.05 1.06 1.07 1.08 1.09 TSHA | Countee, Samuel Albert. www.tshaonline.org. Retrieved on 2022-02-24.
- ↑ 2.0 2.1 2.2 2.3 2.4 Samuel Countee’s Paintings Continue To Inspire (en). County Line Magazine. Archived from the original on 2022-02-08. Retrieved on 2022-02-24.
- ↑ 3.0 3.1 3.2 3.3 Historic Black Officers Club memorialized for WWII Soldier-artist Samuel Countee (en). www.army.mil. Retrieved on 2022-02-24.
- ↑ Hernandez (September 8, 2017). Planned, Organized and Established: Houston Artist Cooperatives in the 1930s (en). issuu.com. Archived from the original on 2022-02-08. Retrieved on 2022-02-24.
- ↑ See Houston's Early Black and White Artists Exhibit in One Room for the First Time (en-US). Houstonia. Retrieved on 2022-02-24.
- ↑ Fort Leonard Wood mural returns, awaiting display. United States Army.