Samuel A. Countee

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Samuel A Countee
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
Aha enyereSamuel Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1909 Dezie
Ebe ọmụmụMarshall Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya11 Septemba 1959, 1959 Dezie
Ọrụ ọ na-arụomenkà, muralist Dezie
ebe agụmakwụkwọBooker T. Washington High School, Bishop College Dezie
ngalaba aghaUnited States Army Dezie
ikike nwebiisinka dị ka onye okikeỌrụ nwebiisinka chekwara Dezie

Samuel A. Countee (ubochí mbú n'ọnwa Eprel, 1909 rụo ụbọchị irí na otu n'ọnwa Septemba, 1959) bụ ónyé na-ese ihe na ónyé na-akpụ ihe.[1][2][1] A na-akpọ SSG Samuel A. Countee Hall na Fort Leonard Wood iji sọpụrụ ya.[3]

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Countee na Marshall, Texas na Thomas Countee Na Nannie Salina Yates Countee. Ọ gàrà Booker T. Washington High School site na 1924 rụo 1928.[1]

Countee gụsịrị akwụkwọ na 1934 na nzèrè na nka na Bishop College. Mgbè ọ nọ na kọleji, o sere foto nke ngalaba na ndị nchịkwa iji nweta ego màkà agụmakwụkwọ.[1]

Countee gụsịrị akwụkwọ na kọleji na 1934 mgbè nke ahụ gasịrị ọ nwetara agụmakwụkwọ na Boston Museum of Arts ebe ọ rụrụ ọrụ dị ka ónyé na-ese ihe.[1]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Ihe osise Samuel Countee n'oge usoro mweghachi. E weghachiri ihe osise ahụ dị ka Fort Leonard Wood's Countee Hall na 2017

Ọrụ Countee gosipụtara ndụ ndị Africa America.

Site na 1933-1935, Countee gosipụtara nka ya n'ọtụtụ ihe ngosi. N'afọ 1933, William E. Harmon Foundation gosipụtara ihe osise ya, Little Brown Boy.[1][4] O gosikwara na Mahadum Howard, Mahadum Atlanta, Smith College, Institute of Modern Art na Boston, nà 1936 Texas Centennial's Hall of Negro Life.[1][5]

E debara áhà Countee na ndị agha United States na 1942 ebe ọ rụrụ ọrụ na 436th Engineer General Service Dump Truck Company. Mgbè ọ nọ n'usuu ndị agha, e nyèrè y'à ọrụ ịmepụta mural màkà African-American Officers Club na Fort Leonard Wood na Missouri.[1][2][3][6] Ọ na-ese ihe màkà ihe ngosi USO.[2]

Countee kwagara New York ka ahapụchara ya na ndị agha. Ọ bịara màrà n'etiti ndị na-ese ihe na New York wee gaa n'ihu na-ese fotoLucille Armstrong, Harry Belafonte, nà Marian Anderson.[2]

Ndụ onwe onye[dezie | dezie ebe o si]

Countee biri na Long Island, New York. Ọ lụrụ Mary Miner na 1955.[1]

Countee nwụrụ n'ọrịa kansa n'ubochí irí na otu n'ọnwa Septemba,1959.[1]

Ihe Nketa[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2019, a gbanwere aha Fort Leonard Wood African-American Officersī Club nke nwere mgbidi Countee SSG Samuel A. Countee Hall.[2][3]

Nwa nwanne Countee, Sammie Witing-Ellis, nyere aka ịkọwa ihe osise ahụ site n'aka nwanne nna ya mgbe ọ chọtara ọrụ kwekọrọ na ya na sketchbook.[3]

Ihe odide[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.00 1.01 1.02 1.03 1.04 1.05 1.06 1.07 1.08 1.09 TSHA | Countee, Samuel Albert. www.tshaonline.org. Retrieved on 2022-02-24.
  2. 2.0 2.1 2.2 2.3 2.4 Samuel Countee’s Paintings Continue To Inspire (en). County Line Magazine. Retrieved on 2022-02-24. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":1" defined multiple times with different content
  3. 3.0 3.1 3.2 3.3 Historic Black Officers Club memorialized for WWII Soldier-artist Samuel Countee (en). www.army.mil. Retrieved on 2022-02-24. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":2" defined multiple times with different content
  4. Hernandez (September 8, 2017). Planned, Organized and Established: Houston Artist Cooperatives in the 1930s (en). issuu.com. Retrieved on 2022-02-24.
  5. See Houston's Early Black and White Artists Exhibit in One Room for the First Time (en-US). Houstonia. Retrieved on 2022-02-24.
  6. Fort Leonard Wood mural returns, awaiting display. United States Army.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

Mural, SSG Samuel A. Countee Hall, Fort Leanord Wood