Sanusi Mohammed Ohiare

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Sanusi Mohammed Ohiare
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya6 Maachị 1985 Dezie
Ebe ọmụmụAbuja Dezie
ŃnàMohammed Ohiare Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o ji Dezie

</ref>

Mmalite ndu na mmuta[dezie | dezie ebe o si]

Amuru ya na abalị isii n’ime ọnwa Maachị nke afọ 1985 na Abuja Naijiria Mpaghara isi obodo gọọmenti mba ebe o biri ọtụtụ mmalite afọ Ya ọ bụ kwa onye Mpaghara gọọmenti ime obodo Alavi na Kogi Steeti Mpaghara etiti ugwu Naịjirịa Nna ya, Sịnetọ Mohammed Ohiare bụ onye bụ onye sịnetọ gara aga na-anọchite anya mpaghara ọchịchị etiti Kogi na nzuko ọgbakọ omeiwu nke Naịjirịa na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị a maara nke ọma na steeti ahụ mere na o nyela aka nke ọma na mmepe nke ndị mmadụ na mpaghara ọchịchị etiti Kogi mgbe ọ na-eje ozi dị ka onye omebe iwu ma mgbe emesịrị . [1] Sanusi nwere nzere bachelọ na akụnụba site na Mahadum Jos, Plateau steeti Naịjirịa n’agbata afọ 2002 na 2006. N'agbata 2009 na 2011, ọ gara na Mahadum nke Dundee, Scotland, United Kingdom , [2] ebe ọ natara Nzere Masta nke ogo sayensị na na mmụta ume, na iche iche na ume ego. Mgbe nke a gasiri, o nwetara nzere PhD na Mmepe ume ime obodo na Mahadum De Montfort, Leicester, United Kingdom, n'afọ 2015 [3]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Onyeisiala Muhammadu Buhari họpụtara ya n'ọnwa Eprel afọ 2017, dịka onye isi nchịkwa nke Ego Eletriki ime obodo na onye otu nọ na ngalaba ụlọ ọrụ n'ahụ maka itinye ọkụ eletrik n'ime obodo nke Naịjirịa. [4] Tupu a họpụta ya dị ka onye isi nchịkwa nke Ego itinye ọkụ ime obodo ya na Ụlọ ọrụ mba ụwa German ( Deutsche Gesellschaft für Internationale Zusammenarbeit ), (GIZ) rụkọrọ ọrụ, dịka onye ndụmọdụ gbasara mba na itinye ọkụ ime obodo n’okpuru Mmemme nkwado ume nke Naịjirịa (NESP), nke European Union na Gọọmenti German kwadoro n'ego. N'ihe dị ka afọ iri na isii nwee ahụmịhe n'ime oghere itinye ọkụ ime obodo o webatara ahụmịhe ya ka ọ rụọ ọrụ na ụlọ ọrụ ahụ. [5]

Ndị otu mkpakọrịta[dezie | dezie ebe o si]

Ọ bụ onye otu ndị otu ọkachamara dị icheiche na ndị otu dị iche iche dịka International Association of Energy Economics (IAEE), otu mba na-abụghị ndị ọrụ aka nke ndị ọkachamara nwere mmasi na akụnụba ume [6] yana isi obodo ya n'akụkụ dị iche iche nke ụwa gụnyere Otu Na-ahụ Maka akụnụba ume nke Naịjirịa (NAEE), Naịjiria [7] Otu egwuregwu mmanụ Lagos Otu ndị injinia mmanụ ala (SPE), Ụlọ mmụta ume United Kingdom. [5] na onye otu mmekọrịta Mandela Washington maka Ndị ọchịchị Na-eto eto n'Africa, na Regents nke Mahadum California, Davis, California, United States .

Ọrụ enyemaka na ọrụ ikwu okwu[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2019, ọ tọrọ ntọala nke Sanusi Ohiare Foundation maka ebumnuche inye ụmụ nwanyị na ụmụaka aka ike n'Africa site na agụmakwụkwọ, egwuregwu na itinye ọkụ ime obodo nke ọ na-erute na ndị n'enweghị enyemaka . [8] O gosiputala okwu ma burukwa onye isi okwu na ọtụtụ ihe banyere itinye ọkụ ime obodo tinyere ndi nzuko mba nke ano banyere ike (NACOP) na steeti Edo, [9] mkparita uka atumatu na Abuja [10] na ihe omume ndi ozo iji kwalite itinye ọkụ eletrik n'ime obodo na Naịjirịa . [11]

Mmezu ya[dezie | dezie ebe o si]

  • O tinyela aka na ịkwado mmeghe nke itinye ọkụ eletrik n'ime obodo dị ka ekwuru na N'ajụjụ ọnụ n'afọ 2019 mgbe o kwuru na ihe dị ka enyela ezinụlọ puku iri anọ na atọ ọkụ eletrik site na ego ijeri naira abụọ nke ụlọ ọrụ ahụ natara. [12]
  • Dika onye isi oche nke ego itinye ọkụ eletriki n'ime obodo nke Naijiria (REF) o n’edu ndi oru nke ndi oru na ndi otu ya iji hu na ekesara ọkụ eletrik n’otu n'otu n'obodo di iche iche site na onyinye elektrik ime obodo. Ime obodo Akpabom na Akwa Ibom Steeti, obodo nke ihe dị ka mmadụ puku abụọ bụ ndị aka ọrụ ha bụ ịkọ nri na azụ bụ otu n'ime obodo ndị ga-erite uru mbụ site na ego ahụ nọ nkịtị tupu a họpụta ya. [13] [14]

Mbipụta[dezie | dezie ebe o si]

  • Ọ kwadoro ederede a kpọrọ Evolution of Rural Household Electricity Demand in Grid-Connected Communities in Developing Countries .
  • Inye ego Ihe Mgbaru Ume Ime Obodo na Mba Ndị Na-emepe emepe: Ihe Omume nke Naịjirịa nke Sanusi Mohammed Ohiare [15]
  • Inye ego oru ume ime obodo na China: Ihe omumu site na Naịjirịa Vol 3, No 4, 2021, ISSN 1923-4023

Enọ na mmata[dezie | dezie ebe o si]

  • N’afọ 2021, e bipụtara ya n’etiti ndị ọchịchị nọ n'okpuru afọ iri ise nke ọrụ bekee nke Naijiria tinyere onye isi njikwa na onye isi ọrụ nke ụlọ ọrụ na-ahụ maka itinye ọkụ eletrik n'ime obodo Ahmad Salihijo Ahmad [3]
  • Ndị ngwụcha ụwa- Onyinye Enọ Ọkachamara afọ 2021 site n'aka British Council. [16]
  • Onye ọchịchị Ntorobịa nke afọ 2020 Enọ nke ụlọ ọrụ mmepụta ike, ume na mmiri mba Afrịka [17]
  • Aha ọdịnala nke Akiliwo Ejeh nke pụtara (Ike nke Eze) nke Ejeh nke Olamaboro, Onye isi oche eze, Ujah Simeon Sani. [18]

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

 

  1. Biu (2016-01-15). Senator Mohammed Ohiare (en). Blueprint Newspapers Limited. Retrieved on 2021-06-26.
  2. Ohaire University of Dundee Alumni. Vanguard Media Limited (2021-02-20). Retrieved on 2021-06-04.
  3. 3.0 3.1 Tuleh (2021-04-14). Under 50 Leaders in Public Service (en-US). Blueprint Newspapers Limited. Retrieved on 2021-05-11.
  4. Rural Electrification Agency Gets New Board, Executive Management. Channels Television. Retrieved on 2019-11-01.
  5. 5.0 5.1 Reporters. Dr. Ohiare Sanusi: Bridging the gulf in Leadership By Abdullahi Haruna (en-US). Emporium Reporters. Retrieved on 2021-04-30.
  6. About IAEEE. Stanford University. Archived from the original on 2021-06-04. Retrieved on 2021-06-04.
  7. Nigeria Association of Energy Economics. Thisdaylive (2017-10-22). Archived from the original on 2021-07-23. Retrieved on 2021-06-04.
  8. Omokhunu. "Sanusi Ohiare Visits Orphanage", The Nation Online Nigeria, 2021-03-09. Retrieved on 2021-05-24.
  9. Daniel (2018-07-31). Sanusi on Cost of Electricity in Nigeria. Today. Retrieved on 2021-05-08.
  10. Wada (2021-04-01). Sanusi Speaks on More Women Gaining Access to Electricity. BusinessDay, Nigeria. Retrieved on 2021-05-08.
  11. The 8th Annual NLPNGA Conference and Exhibition. Nigeria Liquefied Petroleum Gas Association. Retrieved on 2021-05-08.
  12. Ohaire on Effective Framework for Rural Electrification. Thisdaylive (2019-01-29). Retrieved on 2021-06-04.
  13. Commissioning of Akpabom Community Electricity Project. Thisdaylive (2019-11-09). Retrieved on 2021-06-04.
  14. Akpabom Community Powered by REA. Punch Nigeria (2019-11-03). Retrieved on 2021-06-04.
  15. Ohiare. Financing Rural Energy Projects in Developing Countries: A Case Study of Nigeria (in en). Retrieved on 2021-05-24. 
  16. Global finalists - Professional Achievement Award 2021 | British Council (en). study-uk.britishcouncil.org. Retrieved on 2021-04-30.
  17. Dr Sanusi Ohiare marks 36 years (en). Nigerian News Sphere (2021-03-06). Archived from the original on 2021-07-23. Retrieved on 2021-06-17.
  18. Nda-Isaiah (4 April 2021). Conferment of Traditional Title to Dr Ohiare (en). Leadership Newspaper. Retrieved on 2021-06-17.

Njikọ dị na mpụga[dezie | dezie ebe o si]