Sir Shina Peters

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Sir Shina Peters
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereShina Dezie
aha ezinụlọ yaPeters Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya30 Mee 1958 Dezie
nwaClarence Peters Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye egwu Dezie
okpukpere chi/echiche ụwaEfefe Kraịst Dezie

Sir Shina Peters (amụrụ ya na mkpụrụ ụbọchị iri atọ nke ọnwa Mee n'afo 1958) bụ onye egwu Jùjú nke Naijiria.

Ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Oluwashina Akanbi Peters na Ogun State, ọrụ Peters n'egwú malitere mgbe ọ dị obere mgbe ya na ndị enyi ya kụrụ egwu n"okpuru Olushina na ụmụnne ya iri na abụọ.[1] Mgbe ya na ndị enyi ya nọ na-egwuri egwu, ọ kụziiri onwe ya otu esi akpọ piano ma mesịa sonye n'òtù Ebenezer Obey. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ hapụrụ òtù Obey wee sonye n'òtù General Prince Adekunle dị ka onye na-akpọ ụbọ. Ndị otu Adekunle na-egwuri egwu na họtel Lagos dị ka Western Hotel, Palm Beach Hotel na Executive Hotel. Mgbe Adekunle na-arịa ọrịa, oge ụfọdụ Peter na -agu egwu: Ọ hapụrụ Adekunle iji guzobe Shina Adewale, otu egwu ya na Segun Adegale.[2] Otú ọ dị, ha abụọ kewara n'oge na-adịghị anya. Mgbe Shina Peter na Segun Adewale weputachara ọtụtụ abọm n'ime afọ 1980, ọ gara n"ihu guzobe otu egwu nke ya, "Sir Shina Petersburg & His International Stars".

Peters bụ onye na-eme ihe nkiri na 'Money Power', ihe ngosi nke Ola Balogun mepụtara. Ọ zutere ma malite mmekọrịta ya na onye na-eme ihe nkiri Clarion Chukwura n'oge a. Di na nwunye ahụ nwere nwa nwoke, Clarence Peters.[1]

Ọganihu ọrụ ya[dezie | dezie ebe o si]

Sir Shina Peters na ndị egwu ya bụ International Stars wepụtara abọm mbụ ha Ace (Afro-Juju Series 1) n'afọ 1989. Abọm ahụ, nke e wepụtara n'okpuru CBS Records nke Naịjirịa, gara platinum okpukpu abụọ. "Ace," nke Laolu Akins mepụtara, bụ ngwakọta egwu dị n'etiti Juju na Afrobeat. Ụdị egwu Afro juju na-agwakọta ngwa ngwa na iji keyboard eletrọniki, saxophone na guitar.[1] Ụfọdụ n'ime okwu ndị dị na abọm ahụ karịsịa na 'Ijo Shina' dị oke egwu n' oge ahụ.[1] Abọm ahụ gara n'ihu nwetalu Peter ihe onyinye nke gụnyere onye na-ese ihe na abọm nke Afọ na Naịjiria Musical Awards.[1] Ọ sochiri 'Ace' na 'Shinamania'; abọm ahụ nwere egwu dịka 'Oluwa Yo Pese', 'Omo Bo' da 'Give Our Women Chance'. Sir Shina Peters nwere abom iri na isii e wepụtara na aha ya.

Nkọwapụta[dezie | dezie ebe o si]

    1. Way to Freedom (1980)
    2. Freedom (1981)
    3. Money Power (1982)
    4. Ko Temi fun mi (1984)
    5. Sewele (1986)
    6. Ace "Afro Juju Series 1 (1989)
    7. Shinamania (1990)
    8. Dancing Time (1991)
    9. Experience (1992)
    10. Mr. President (1993)
    11. My Child (1994)
    12. Kilode (1995)
    13. Love (1996)
    14. Reunion (1997)
    15. Playmate (1999)
    16. Happy Hour (2001)
    17. Pay Back Time (2005)
    18. Splendour (2006)
    19. D one 4 me (2012)

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Ndepụta nke ndị egwu Naijiria

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 Oguntayo. "An Ace of Gold", African Concord, March 19, 1990. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "momodu" defined multiple times with different content
  2. JULIANA FRANCIS (April 30, 2004). Shina Peter’s revelation My life as Obey’s houseboy. The Daily Sun. Archived from the original on January 6, 2010. Retrieved on 2009-11-02.