Sir Shina Peters
ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
aha enyere | Shina |
aha ezinụlọ ya | Peters |
ụbọchị ọmụmụ ya | 30 Mee 1958 |
nwa | Clarence Peters |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee |
ọrụ ọ na-arụ | onye egwu |
okpukpere chi/echiche ụwa | Efefe Kraịst |
Sir Shina Peters (amụrụ ya na mkpụrụ ụbọchị iri atọ nke ọnwa Mee n'afo 1958) bụ onye egwu Jùjú nke Naijiria.
Ndụ
[dezie | dezie ebe o si]A mụrụ Oluwashina Akanbi Peters na Ogun State, ọrụ Peters n'egwú malitere mgbe ọ dị obere mgbe ya na ndị enyi ya kụrụ egwu n"okpuru Olushina na ụmụnne ya iri na abụọ.[1] Mgbe ya na ndị enyi ya nọ na-egwuri egwu, ọ kụziiri onwe ya otu esi akpọ piano ma mesịa sonye n'òtù Ebenezer Obey. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ hapụrụ òtù Obey wee sonye n'òtù General Prince Adekunle dị ka onye na-akpọ ụbọ. Ndị otu Adekunle na-egwuri egwu na họtel Lagos dị ka Western Hotel, Palm Beach Hotel na Executive Hotel. Mgbe Adekunle na-arịa ọrịa, oge ụfọdụ Peter na -agu egwu: Ọ hapụrụ Adekunle iji guzobe Shina Adewale, otu egwu ya na Segun Adegale.[2] Otú ọ dị, ha abụọ kewara n'oge na-adịghị anya. Mgbe Shina Peter na Segun Adewale weputachara ọtụtụ abọm n'ime afọ 1980, ọ gara n"ihu guzobe otu egwu nke ya, "Sir Shina Petersburg & His International Stars".
Peters bụ onye na-eme ihe nkiri na 'Money Power', ihe ngosi nke Ola Balogun mepụtara. Ọ zutere ma malite mmekọrịta ya na onye na-eme ihe nkiri Clarion Chukwura n'oge a. Di na nwunye ahụ nwere nwa nwoke, Clarence Peters.[1]
Ọganihu ọrụ ya
[dezie | dezie ebe o si]Sir Shina Peters na ndị egwu ya bụ International Stars wepụtara abọm mbụ ha Ace (Afro-Juju Series 1) n'afọ 1989. Abọm ahụ, nke e wepụtara n'okpuru CBS Records nke Naịjirịa, gara platinum okpukpu abụọ. "Ace," nke Laolu Akins mepụtara, bụ ngwakọta egwu dị n'etiti Juju na Afrobeat. Ụdị egwu Afro juju na-agwakọta ngwa ngwa na iji keyboard eletrọniki, saxophone na guitar.[1] Ụfọdụ n'ime okwu ndị dị na abọm ahụ karịsịa na 'Ijo Shina' dị oke egwu n' oge ahụ.[1] Abọm ahụ gara n'ihu nwetalu Peter ihe onyinye nke gụnyere onye na-ese ihe na abọm nke Afọ na Naịjiria Musical Awards.[1] Ọ sochiri 'Ace' na 'Shinamania'; abọm ahụ nwere egwu dịka 'Oluwa Yo Pese', 'Omo Bo' da 'Give Our Women Chance'. Sir Shina Peters nwere abom iri na isii e wepụtara na aha ya.
Nkọwapụta
[dezie | dezie ebe o si]- Way to Freedom (1980)
- Freedom (1981)
- Money Power (1982)
- Ko Temi fun mi (1984)
- Sewele (1986)
- Ace "Afro Juju Series 1 (1989)
- Shinamania (1990)
- Dancing Time (1991)
- Experience (1992)
- Mr. President (1993)
- My Child (1994)
- Kilode (1995)
- Love (1996)
- Reunion (1997)
- Playmate (1999)
- Happy Hour (2001)
- Pay Back Time (2005)
- Splendour (2006)
- D one 4 me (2012)
Hụkwa
[dezie | dezie ebe o si]- Ndepụta nke ndị egwu Naijiria
Ebensidee
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 Oguntayo. "An Ace of Gold", African Concord, March 19, 1990. Kpọpụta njehie: Invalid
<ref>
tag; name "momodu" defined multiple times with different content - ↑ JULIANA FRANCIS (April 30, 2004). Shina Peter’s revelation My life as Obey’s houseboy. The Daily Sun. Archived from the original on January 6, 2010. Retrieved on 2009-11-02.