Sunday Iyahen

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Sunday Iyahen
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereSunday Dezie
aha ọmaonye nkuzi Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya3 Ọktoba 1937 Dezie
Ebe ọmụmụKazaure Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya28 Jenụwarị 2018 Dezie
Ebe ọ nwụrụKazaure Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụmathematician, academic Dezie
Ọkwá o jiacademician, senator Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Keele, Mahadum nke Ibadan Dezie
onye ndụmọdụ doctoralAlexander Provan Robertson Dezie
agbụrụEdo people Dezie
Onye òtù nkeNigerian Academy of Science Dezie
Ihe nriteFellow of the Nigerian Academy of Science Dezie

Sunday Osarumwense Iyahen (3 October 1937 – 28 Jenụwarị 2018) [1] bu onye ọkachamara na mgbakọ na mwepụ si mba Naijiria na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ọ rụrụ ọrụ dịka onye ọkammụta na mgbakọ na mwepụ na mahadum dị iche iche dị na Naịjirịa nakwa na mba ọzọ,[2] ma nye aka na nkwuputa izugbe nke w:topological vector spaces. Ọ rụkwara ọrụ dịka onye omeiwu n'ụlọ omeiwu Naijiria ugboro abụọ, na-anọchite anya Bendel Central Senatorial District.[3]

Mmalite Ndụ na Agụmakwụkwọ Ya[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Iyahen na 3 Ọktoba 1937 na Benin City, Edo State, Nigeria.[4] Ọ bụ ọkpara n'ezinụlọ ọ dịkarịa ala ụmụ iri na asaa nke Solomon Igbinuwen Iyahen na nwunye ya Aiwekhoe.[4]

Mmalite Ndụ na agụmakwụkwọ Ya[dezie | dezie ebe o si]

Iyahen gara ụlọ akwụkwọ praịmarị Saint Matthew dị na Benin City (1944-45), nke ụlọ akwụkwọ Saint Peter (1945-51) sochiri n'otu obodo ahụ.[5] Ụlọ akwụkwọ abụọ a nọ n'okpuru nlekọta nke Church Mission Society, otu nke dabeere na London na 1799.[6] O wee gaa Edo College na Benin City. N'afọ 1956, ọ gafere n'ule asambodo ụlọ akwụkwọ Cambridge, na-enweta ngalaba nke Mbụ. Ọ gụrụ akwụkwọ na kọleji Gọọmenti, Ibadan, maka asambodo ụlọ akwụkwọ sekọndrị Cambridge n'afọ 1957-1958.[5]

N'afọ 1959, ọ debara aha na mahadum dị n'Ibadan ka ọ mụọ mgbakọ na mwepụ. O nwetara nzere ya na mgbakọ na mwepụ n'afọ 1963. Ọ gakwara na Mahadum Keele, bụ ebe ọ nwetara nzere Ph.D. ya na mgbakọ na mwepụ n'afọ 1967.[7] O mechara nweta nzere D.Sc. na mgbakọ na mwepụ si otu mahadum ahụ n'afọ 1987.[8]

Ọrụ Ya na Nkega Agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Iyahen malitere njem ọrụ ya na nkega agụmakwụkwọ dịka onye nkuzi mgbakọ na mwepụ na mahadum Ibadan n'afọ 1965. Ọ gara n'ihu na-agbago n'ọkwa, wee nweta ọkwa onye nkuzi ukwu n'afọ 1969 wee bụrụ ọkammụta n'afọ 1974. Ọ bụ onye isi ngalaba na-ahụ maka mgbakọ na mwepụ site na 1976 ruo 1978 na onye isi nke ngalaba sayensị site na 1978 ruo 1980.[5]

N'afọ 1980, ọ sonyeere Institute of Technology, Benin (emesịa degharịa aha ya ịbụ Mahadum Benin), ebe ọ jere ozi dị ka onye guzobere ngalaba nke Physical Sciences na onye isi ntụziaka nke Center for Mathematical Sciences. Ọzọkwa, ọ nọkwa n'ọkwá onye isi mahadum site n'afọ 1985 ruo 1986.[5]

O nyere aka dị ka onye ọkammụta nleta na ụlọ ọrụ dị iche iche, gụnyere Mahadum Legọs, Mahadum Jos, Mahadum Port Harcourt, Mahadum Ilorin, Mahadum Nigeria, Nsukka, Mahadum Cape Coast (Ghana), Mahadum Khartoum (Sudan) na Mahadum Waterloo, Canada.[5]

O bipụtara akwụkwọ karịrị otu narị metụtara mgbakọ na mwepụ n'akwụkwọ akụkọ mba ụwa,[5] jee ozi dị ka onye isi nchịkọta akụkọ maka Afrika Mathematika na Journal of the Nigerian Mathematical Society,[5] ma bụrụ onyeisi oche Bọọdụ nchịkwa nke Federal Polytechnic, Idah. [9]

Ọ bụ onye òtù Nigerian Academy of Science na Mathematical Association of Nigeria,[10] Iyahen bụkwa onye òtù London Mathematical Society, American Mathematical Society, na International Mathematical Union.[5]

Ọrụ Ya na Nkega Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

Iyahen bụụrụ onye omebe iwu ugboro abụọ na Naijiria .[11] Ọ nọchitere anya Bendel Central Senatorial District n'okpuru ikpo okwu nke òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị National Party of Naijiria (NPN) na mba nke abụọ (October ruo Disemba 1983)[12] ya na òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị Social Democratic Party (SDP) na mba nke atọ (August 1992 ruo Nọvemba 1993).[13] O jere ozi n'ukwa di iche iche na sineti, dika onye isi oche nke Kọmitii na-ahụ maka agụmakwụkwọ, sayensị na teknụzụ, na osote onye isi oche nke kọmitii na-ahụ maka ego na ntinye ego.[11]

Ndụ Onwe Onye na Ọnwụ Ya[dezie | dezie ebe o si]

Iyahen lụrụ Veronica Aigboduwa Osagie na 25 Septemba 1967. Ha nwere ụmụ isii na ụmụ ụmụ iri na otu.[5]

Iyahen nwụrụ na 28 Jenụwarị 2018 na Benin City, Edo State, Nigeria. Ọ gbara afọ iri asatọ. E liri ya na 16 Febụwarị 2018 n'ụlọ obibi ya na Benin City.[14]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

Ebe Ha Si[dezie | dezie ebe o si]

Njikọ Mpụga[dezie | dezie ebe o si]